Glaucoma: Ọrịa ọjọọ nwere ike ime ka anya pịa mmadụ n'otu ntabi anya

Onye na-eme nnyocha anya

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Ị ma na i nwere ike bilie n'ụra otu ụbọchị chọpụta na ị nakwaghị ahụ ụzọ?

Ama m na ị ga-asị 'tụfiakwa', maọbụ 'Chineke ekwela', mana ọrịa Glaucoma maọbụ Cataract nwere ike ime ka ihe dị otu a mee.

Aha onyonyo, Eye care: Ihe ise ị ga-eme ka anya gị ghara ịkpọ

Ọbụrụ na anya mmadụ adịghị, ọchịchịrị ga-agbachi ahụ mmadụ niile, ụwa enwekwaghị ihe ọ ga na-atọ.

Ya mere o ji dị mkpa ichekwa anya gị ma gbochie ọrịa Glaucoma nakwa Cataract, nke nnyocha gosiri na ọ bụ ha kacha ebutere ndị mmadụ ikpu isi n'ụwa niile.

Gịnị bụ Glaucoma?

Nwata nwere Glaucoma

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Glaucoma na-emekarị ndị gbagoterela n'afọ, mana ụmụaka nwekwara ike inwe ya

E nwere akwara si n'anya mmadụ gaa n'ụbụrụ isi; Bekee na-akpọ ya 'optic nerve'.

Ọ bụrụ na ike gwụ akwara a, ọ gaghịkwa enwe ike iziga ozi iji mee ka ụbụrụ ghọta ihe mmadụ na-ahụ.

Glaucoma bụ ọrịa na-emebi akwara 'optic nerve' ma mee ka mmadụ kpuo isi n'otu ntabi anya.

Dọkịta anya aha ya bụ Ugochukwu Eze kọwara na ọ bụghị na ọrịa glaucoma na-abịa n'otu ntabi anya, kama ọ na-eji nwayọ nwayọ amalite, nke pụtara na mmadụ agaghị enwe ike ịchọpụta ruo mgbe ọ kawanyere njọ.

Ugochukwu Eze

Ebe foto si, Dọkịta Ugochukwu Eze

Nkọwa foto, Dọkịta Ugochukwu Eze bụ dibia anya n'ụlọọgwụ 'National Eye Centre' dị na Kaduna

Mana oge ahụ, ọ dịla njọ, onwekwaghị ihe mmadụ ọbụla nwere ike ime maka ya.

Dọkịta Eze kwuru sị: "Ọ bụrụ na a chọpụta glaucoma n'oge, anyị nwere ike inyere onye ahụ aka ka anya ya ghara ịkpọ kpam kpam."

"Mana ọ bụrụ na ya bụ ọrịa apịala mmadụ anya, onweghị ihe mmadụ ọbụla nwere ike ime iji nyere onye ahụ aka."

Ihe gbara ọkpụrụkpụ i kwesịrị ịma maka Glaucoma:

Felipe Gomes

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Felipe Gomes bụ onye na-eme egwuregwu 'paralympics' na mba Brazil. Ọ bụ Glaucoma na Cataracts nke o butere site n'afọ nne ya mere ka o kpuo isi.
  • Ihe na-akpata ya bụ mmiri ịdọ n'anya mmadụ karịa etu o kwesịrị nke ga-eme ka ibu anya mmadu bu dị nnukwu arọ (eye pressure)
  • Nnyocha gosiri na ọ na-esikarị n'agbụrụ (site n'aka nne na nna fee ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha)
  • Glaucoma enweghị ọgwụgwọ ga-eme ka ọ laa kpamkpam, kama a ga-enye gị ọgwụgwọ ga-enyere gị aka ka anya gị ghara ịkpọ
  • Ọnaghị enwekarị ihe njirimara na-egosi na ọrịa a amalitela n'anya mmadụ, mana anya mmadụ ịcha mmeemmee maọbụ ịfụ ya ụfụ, nwere ike ịrụtụ aka gbasara ọrịa a
  • O nwereike tupu mmadụ achọpụta na o nwere Glaucoma, onye ahụ ekpuolarị isi n'otu anya
  • Ọ na-emekarị ndị dị malite n'afọ iri anọ gbagowe, mana ụmụntakịrị na ndị na-eto eto na-enwekwa ya
  • Nnyocha gosiri na ndị isi ojii nakwa ndị Asia kacha enwe ọrịa a
  • Ọgwụ ụfọdụ mmadụ na-aṅụ nwere ike ịkpata ya (nke a gụnyere ọgwụ nwere 'steroids')
  • Ọrịa glaucoma nwere ụdị abụọ gbara ọkpụrụkpụ, ha bụ 'Open-angle glaucoma' na 'Angle-closure glaucoma'
  • Mana enwekwara ụdị ọzọ anaghị ahụ kwadaa, ha bụ 'Normal-tension glaucoma', 'Pigmentary glaucoma' na Glaucoma nke ụmụaka
  • Ọrịa anya ndị ọzọ nwekwara ike ịkpatara mmadụ glaucoma; a na-akpọ ya 'secondary glaucoma'

Mgbochi glaucoma

Onye na-eme nnyocha anya

Ebe foto si, Iwaria.com

Nkọwa foto, Ime nnyocha anya kwa mgbe kwa mgbe ga-enye aka ịchọpụta ọrịa glaucoma n'oge ma malite inweta ọgwụgwọ
  • Ụzọ kacha dị ire iji zeere ọrịa glaucoma bụ ị na-eme nnyocha n'anya gị ugboro ugboro.
  • Ọ bụrụ na nnyocha gosi na ọrịa a na-amalite n'ahụ gị, dọkịta ga-enye gi ọgwụ ị ga na-atụnye n'anya nke ga-enyere gị aka
  • Na-ekpuchi anya gị oge ọbụla ị na-eme ihe siri ike maọbụ oge ị na-arụ ọrụ dị aṅaa
  • Zeere ịfịa aka n'anya gị oge ọbụla
  • Were nwayọọ na-aṅụ mmiri nakwa ihe ndị ọzọ. Ọ bụghị ka ị kwụsị ole mmiri ị na-aṅụ, kama ọ bụ ka ị gbatịa oge i i ji aṅụ ya
  • Maka ụmụnwaanyị, kpachara anya ụdị ihe ntecha ị na-eji achọ mma, zeere ndị ga-emebi anya gị

Gịnị bụ Cataracts?

Cataract

Ebe foto si, Science Photo Library

Nkọwa foto, Cataract bụ ọrịa kachasị ebute ikpu isi na Naịjirịa

Cataract bụ ọrịa na-eme ka ihe dịka urukpu (cloud) kochie mkpụrụ anya mmadụ.

Nnyocha gosiri na ọ bụ cataract kacha akpata mmadụ ikpu isi na Naịjirịa.

Mana ndị ọkachamara na-eji ịwa anya (eye surgery) agwọta ọrịa cataract.

Ọrịa a na-eji nwayọ amalite, ọgaghịkwa enye onye ahụ nsogbu ruo mgbe ọ kawanyere njọ.

Ihe e ji amakarị ọrịa Cataract bụ mmadụ inwe nhịahụ ịgụpụta ihe edere n'akwụkwọ maọbụ ịhụ ụzọ nke ọma n'abalị.

Mmadụ ịhụ ihe dịka ọ gbara abụọ bụkwa njirimara ya

Ihe nwere ike ibute Cataract bụ:

Onye a na-eme nnyocha anya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ime nnyocha anya kwa mgbe kwa mgbe ga-enye aka ịchọpụta ọrịa Cataract n'oge.
  • Afọ ole mmadụ dị (Cataract na-akawanye njọ dịka afọ mmadụ na-agbago)
  • Ọrịa ụfọdụ dịka ọrịa shuga (diabetes) maọbụ ọbara mgbalielu
  • Ịnọkarị n'anwụ oge niile
  • Ise anwụrụ
  • Ịṅụ oke mmanya na-aba n'anya
  • Ọ bụrụ na mmadụ merụburu ahụ n'anya ya

Mgbochi Cataract:

  • Na-eme nnyocha anya gị kwa mgbe kwa mgbe
  • Kwụsị ise anwụrụ
  • Kwụsị ịṅụ oke mmanya na-aba n'anya
  • Na-eri nri juputara na mkpụrụosisi nakwa akwụkwọ nri
  • Na-eyi ugegbe anya ga-echekwa anya gị pụọ n'anyanwụ

Ọgwụgwọ Cataract:

  • Ihe e jikarị agwọ cataract bụ ịwa anya (eye surgery).
  • Nnyocha gosiri na ịwa anya iji gwọọ cataract na-arụ ọrụ nke ọma.
  • Ịwa anya a anaghị egbu oge ma ncha, ọ naghịkwa ada oke ọnụ.
  • Onye a wara anya nwere ike i si n'ụlọọgwụ laa n'otu ụbọchị ahụ.