Elephantiasis: Lee etu anwụnta nwere ike isi butere gị 'ụkwụ aba shoe'

Onye nwere ọrịa Lymphatic

Ebe foto si, WHO

Nkọwa foto, Onye nwere ọrịa Lymphatic
    • Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Ọrịa Elephantịasis nke a na-akpọkwa 'Lymphatic Filariasis' bụ otu ọrịa na-enye nsogbu na mpaghara Afrịka nakwa Asia.

Ndị mmadụ na-eche na ọrịa bụ ọgwụ a gwọrọ agwọ na-ebute ya, mana nnyocha sayensị gosiri na ọ bụ nje a kpọrọ 'Nematodes' na-akpata ya.

Nje ndị a bụ 'Nematodes' bụkwa anwụnta na-ekesa ha si n'ahụ otu onye feere onye ọzọ.

Mana e nwekwara ụdị ọrịa ụkwụ ọzịza ọzọ a na-akpọ 'podoconiosis'

A naghị ahụkarị ụdị nke a kwadaa, kama ihe na-akpata ya abụghị anwụnta.

Ọ bụ ihe ọnatarachi dị n'ime ala, nke Bekee na-akpọ 'minerals' na-akpata ya. Mana ọ bụghị nke a ka akụkọ a na-ekwu maka ya.

Gịnị bụ Lymphatic filariasis (Elephantiasis)

Ndị nwere ọrịa Elephantiasis

Ebe foto si, WHO

Nkọwa foto, Ọtụtụ na-eche na ọrịa 'ụkwụ aba shoe' bụ ọgwụ a gwọrọ agwọ, mana ha amaghị na anwụnta nwere ike ịkpata ya

N'ala Igbo, ihe a na-akpọ ọrịa a bụ 'ụkwụ aba shoe', maka na ọ na-eme ka ụkwụ mmadụ zaa azaa.

Dịka anyị kọwara na mbụ, ndị mmadụ na-eche na ọ bụ ọgwụ a gwọrọ agwọ na-akpata nke a, mana nnyocha sayensị kọwara na ọ bụghị eziokwu

Ọ bụghị anwụnta na-akpata ọrịa 'Elephantiasis' kpọmkwem, kama anwụnta na-ekesa nje na-akpata ya si n'ahụ otu onye feere onye ọzọ.

Ụdị nje na-akpata ọrịa 'Lymphatic filariasis' maọbụ Elephantiasis' bụ nke Bekee kpọrọ 'Nematode Worms' maọbụ 'filariae'.

Dịka ngalaba WHO si depụta, ụdị anwụnta na-ekesa nje a na mpaghara Afrịka bụ ụdị nke a kpọrọ 'Culex' nakwa 'Anopheles'.

Ọ bụrụ na anwụnta a taa onye nwere nje a, ha nwere ike ibufe ya n'ahụ onye ọzọ. Nje a ga-anọzi n'ime ahụ onye ahụ na-abawanye, bịa nọchie ohere ebe mmiri si apụ n'ahụ mmadụ.

Nke a ga-eme ka akụkụ ahụ a malite ịza aza.

Nnyocha WHO gosiri na ọrịa a na-emetụta ihe ruru mmadụ nde iri atọ na isii (36 million) n'akụkụ ụwa niile, mana ọ ka njọ na mpaghara Afrịka nakwa Asia.

Ọgwụgwọ maka 'Elephantiasis'

Ihe onye nwere ọrịa Elephantiasis kwesịrị ị na-eme

Ebe foto si, Stanford.edu

Nkọwa foto, Ihe onye nwere ọrịa Elephantiasis kwesịrị ị na-eme

Dịka nnyocha nke ngalaba ahụike nke ụlọakwụkwọ 'Stanford University' si gosi, ọrịa 'Elephantiasis' maọbụ 'Lymphatic Filariasis' enweghị ọgwụgwọ ga-eme ka ọ laa kpamkpam.

Kama e nwere ọgwụ dị icheiche nke ga-eme ka nje ahụ na-akpata ya ghara ị na-abawanye n'ime ọbara mmadụ.

Ọ bụrụ na nje ahụ anaghị amụba, akụkụ ahụ onye ahụ zara aza agaghị na-azawanye.

Ọ dịkwa mkpa ka e gbochie anwụnta ịta onye dị nwere ya bụ ọrịa, ka ọ ghara ịtanyekwa nje ọzọ n'ahụ ya.

Ihe onye nwere ọrịa a ga na-eme bụ:

  • Were mmiri dịtụ ọkụ na-asacha ụkwụ ahụ zara aza
  • Hichakpọọ ya nke ọma ma tee ya ude pụrụ iche nke na-achụpụ anwụnta nakwa ahụhụ.
  • Lezie anya mara ma ọnya ọ dị n'ụkwụ ahụ
  • Na-emegharị ahụ (exercise) ole i nwere ike
  • Na-edote ụkwụ ahụ n'ebe dịtụ elu
  • Ị nọkata, gagharịa agagharị

Dịka ọrịa, 'Elephantiasis', ọtụtụ ọrịa nke anwụnta na-ekesa, enweghị ọgwụ na-agwọta ha kpọmkwem, kama ọgwụgwọ onye ahụ ga na-enweta bụ a gba ekpere chi.

Ya mere o ji dị mkpa ka i zeere anwụnta ma chụọ ya ọsọ ụkwụeruala n'okirikiri gị.

Ọrịa ọjọọ ndị ọzọ anwụnta na-ekesa gụnyere:

Yellow Fever (Ịba ọchananya)

Akwụkwọ njirimara ọgwụmgbochi yellow fever

Ebe foto si, cdc.gov

Nkọwa foto, Ọ bụ iwu na mmadụ ga-agbarịrị ọgwụ mgbochi yellow fever, ma nweta akwụkwọ njirimara dị otu a, tupu e kwe ya ka o mee njem gaa mba ọzọ

Ọrịa amaghị aha ya malitere igbu ọtụtụ mmadụ na mpaghara ụfọdụ n'Enugwu nakwa Delta steeti n'ọdị nso a, mana nnyocha mechara gosi na orịa ahụ bụ ịba ọchananya nke Bekee kpọrọ 'Yellow Fever'.

Ọ bụ ụdị anwụ nta a kpọrọ 'Aedes' nakwa 'Haemogogus' na-ekesa ya bụ ọrịa.

Kọmishọna Ahụike nke Enugwu steeti, bụ Emmanuel Obi, kọwaara BBC Igbo na ụdị anwụnta a bụ ndị na-efegharị n'oge ehihie.

Nnyocha WHO mere gosiri na ọrịa na-egbu ọkara ndị niile butere ya kwa afọ.

Ọ ga-ewe ihe dịka abalị atọ ruo abalị isii tupu ọrịa a amalite ịkpa ike n'ahụ onye butere ya, ọ bụrụ na-akpachaghị anya nke ọma, onye ahụ ga-anwụ ma ọ gachaa ihe dịka abalị asaa maọbụ abalị iri.

Ọrịa 'yellow fever' na-akpa ike na mba iri anọ na asaa (47) na mpaghara Afrịka nakwa South Amerịka.

Onwebeghị ọgwụ e ji agwọ ya kpọmkwem, mana ọ bụrụ na a chọpụta ya n'oge, ndịọrụ ahụike ga na-eleta onye ahụ anya ruo mgbe ọrịa a jiri aka ya laa.

Mana oziọma dị na ya bụ na 'Yellow Fever' nwere ọgwụ mgbochi, onye ọbụla gbara ya agaghị arịakwa ya bụ ọrịa ọzọ.

Na Naịjirịa, ọ bụrụ na ịgbabeghị ọgwụ mgbochi 'Yellow Fever', ị gaghị enwe ike ime njem gaa mba ọzọ.

Zika Virus

Nwa nwere 'microcephaly

Ebe foto si, Centers for Disease Control and Prevention

Nkọwa foto, Zika virus na-akpatara ụmụaka nọ n'afọ ọnọdụ a kpọrọ 'Microcephaly'

Ọ bụ n'ahụ Enwe ka a chọpụtara nje a bụ 'Zika' n'afọ 1947 na mba Uganda, mana n'afọ 1952 ka a hụrụ ya n'ahụ mmadụ na Uganda nakwa Tanzania.

Ụdị anwụnta na-ekesa nje a bụ nke a kpọrọ Aedes. Mana nwaanyị nwere ike ibufe ya nwa o bu n'afọ, mmadụ nwekwara ike ibute ya site na mmekọ nwoke na nwaanyị.

Ọrịa a anaghị emere ụmụnwaanyị dị ime ebere maka na ọ na-eme ka isi nwa amụrụ ọhụrụ pee ezigbo mpe, nke Bekee na-akpọ 'Microcephaly'.

'Zika virus' fesara na mba Brazil n'afọ 2015. Ọrịa a na-emetụtakwa ndị mmadụ ruo taa, mana ọnụọgụgụ ndị ọ na-emetụta pere mpe.

Ndị ọzọ

Anwụnta

Ebe foto si, Science Photo Library

Nkọwa foto, Anwụnta na-ebute ọrịa ịba na-emetụta ihe ruru nde mmadụ abụọ kwa afọ, dịka ngalaba World Health Organisation si kwuo.

Ọrịa ndị ọzọ anwụnta nwere ike ibunye mmadụ gụnyere:

  • Ịba Dengue (Dengue Fever)
  • Chikungunya
  • West Nile Virus

Etu ị ga-esi zeere mosquito

Neetị anwụnta

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Tinye ugbo (net) pụrụ iche na-achụ ma na-egbukwa anwụnta n'akwa ndịna gị
  • Debe okirikiri gị ọcha, ekwela ka mmiri na-adọ n'okirikiri gị, n'ihi na ọ bụ na mmiri dọrọ adọ ka anwụnta na'anọ amụba
  • Ekwela ka anwụnta taa gị: Chọọ ude e ji achụ anwụnta, maọbụ na-eyi akwa ga-ekpuchi gị ahụ nke ọma
  • Gbaa ọgwụ anwụ, mana kpachapụkwa anya ka ị ghara ịgba nke isi ya nwere ike inye gị nsogbu
  • Tinye ugbo (net) pụrụ iche na-achụ ma na-egbukwa anwụnta n'akwa ndịna gị