Dengue fever, Malaria na ọrịa ndị anwụnta na-ebute nakwa etu ị ga-esi gbochie ọtịta ya

Ebe foto si, Science Photo Library
Ọtụtụ ndị na-akpọ "anwụnta, anwụnta", mana mmadụ ole ma na ọ bụghị naanị otu ụdịrị anwụnta dị?
BBC Igbo chọrọ ịkọwara gị maka anwụnta, ọrịa ọ na-ebute na etu ị ga-esi gbochie ya.
Ụbọchị 20 nke ọnwa Ọgọstụ kwa afọ ọbụla, bụ ụbọchị e kewapụtara maka icheta ụbọchị achọpụtara na ọ bụ anwụnta nke nwaanyị na-ebute ọrịa ịba.
Ụdịrị anwụnta dị:
E nwere ọtụtụ anwụnta n'ụwa, karịrị nde, mana naanị ụfọdụ bụ ihe ndị mmadụ ma maka ya.
- Aedes: Nke a bụ anwụnta na-ebu ọrịa 'yellow fever' nakwa Dengue. E nwere ụdịrị abụọ Aedes aegypti na Aedes albopictus.
- Anopheles: Nke a bụ nke na-ebute ọrịa ịba nke Bekee kpọrọ "malaria".
Ọ dị ụzọ abụọ 1) Anopheles balabacensis na 2) Anopheles gambiae. Ọ bụ nke nwaanyị anwụnta Anopheles a na-ebute ọrịa ịba.

Ebe foto si, Science Photo Library
Ọrịa anwụnta na-ebute
- Ịba (malaria)
Ịba bụ otu ọrịa anwụnta na-atanye mmadụ nke nwere ike igbu mmadụ.
Ịba na-anyụkarị ndị mmadụ anya na mpaghara gụnyere Afrịka, Asia, ụfọdụ mpaghara Dominican republic na Haiti, Amerịkas nakwa Pacific Island.
E nwere ọgwụ ụfọdụ e ji agwọ ọrịa ịba.
- Ịba Dengue (Dengue fever):
Dengue bụ ọrịa anwụnta nke Aedes na-ebute, ọ na-efesa dịka nje mana ọ naghị esi na mmadụ fere na mmadụ.
Ọ bụ ndị bi na mpaghara Asia, ụfọdụ mpaghara Afrịka, ụfọdụ mpaghara India, Amerịkas maọbụ Caribbean na-ebutekarị ya bụ ọrịa.
Dịka e si chọpụta, ya bụ ọrịa anaghị emesikarị ike, ọ naghị anọfekarị otu izu tupu onye bu ya agbakee, mana ụfọdụ oge o nwere ike itinye ụfọdụ n'ihe ize ndụ na ndị ọ na-emesi ike.
Enweghi ọgwụgwọ kpọmkwem a ma e ji agwọ ọrịa dengue, maọbụ ọgwụ mgbochi ya, ya mere e ji adụ ọdụ ka ị gbaa mbọ hụ na anwụnta ataghị gị ma ị gaa ebe ụdịrị ọrịa a dị.
- Zika virus:
Nke a na-esikarị n'anwụnta a na-ahụ n'ụfọdụ mpaghara ụwa gụnyere Saụt na Sentral Amerịka, Carribean, Pacific islands, ụfọdụ mpaghara Afrịka na Asia.
Ihe dị ka mba UK enweghi ụdịrị anwụnta ahụ na-atanye mmadụ ọrịa Zika.
Ị nwere ike ibute ọrịa Zika ma anwụnta bu ya taa gị. A gụrụ gụrụ, mmadụ nwekwara ike isi n'aka onye nwe ọrịa a bute ya site n'akwamiko.
O nwekwara ike isi na nne fere nwa nọ ya n'afọ ma nye nwa ahụ ọrịa ụbụrụ maọbụ mee ka isi nwa ahụ pee oke mpe nke a kpọrọ 'microcephaly' na Bekee.
Ọ bụghị oge niile ka ọrịa Zika na-egosi n'ahụ onye bu ya.
- Ịba ọcha n'anya (Yellow Fever):
Ịba ọcha n'anya na-esi n'ụdịrị anwụnta a na-ahụ na mpaghara Afrịka, Saụt na Sentral Amerịka nakwa Trinidad dị na Caribbean.
E nwere ọgwụ mgbochi a na-agba ma ọ bụrụ na ị na-aga ebe e nwere nje a.
Etu ị ga-esi gbochie anwụnta ịta gị n'ogige gị:
1) Itinye neetị (akwa mgbochi):
Ngalaba na-ahụ maka ahụike na mbaụwa a kpọrọ 'World Health Organisation - WHO' na-eke neetị aghara aghara iji nyere aka gbochie anwụ nta.
Nke a so n'usoro e si achụ anwụnta na-anaghị eri oke ego, ma gharakwa imebi ihu igwe a kpọrọ 'ozone layer'.
2) Ịgba ọgwụ kemịkal:
Nke a bụ usoro Bekee kpọrọ 'fumigation', nke bụ etu e si achụpụ ma gbuo ọtụtụ anwụnta site n'ịgba kemịkal ebe ha nọ.
Nke a na-enye aka igbu anwụnta ndị na-anọ n'ime ọwara mmiri adịghị ọcha nakwa n'ime nkọrọ dị aṅa.
3) Na-eyichi ahụ:
Yiri uwe na-ekpuchi aka na ụkwụ gị ma ọ bụrụ na ị nọrọ n'ogige ebe anwụnta na-ata.
4) Na-ete nchụ anwụ n'ahụ:
Bekee na-akpọ ya 'insect repellent', ị nwere ike ite nke na-anaghị emebi ahụ ma na-achụkwa anwụnta, n'ahụ gị.
Ihe mgbaama na mmadụ nwere ọrịa ịba:
- Inwe ahụ ọkụ na oyi ọmụma
- Isi ọwụwa
- Anya mgbu maọbụ anya na-acha mmee mmee
- Ọkọ na-agbakasị mmadụ n'ahụ
- Mgbu n'akwara nakwa na njibi/njikọ ọkpụkpụ nakwa n'azụ oge ụfọdụ
- Ịgbọ agbọọ mgbe ụfọdụ
- Ụfọdụ oge agụụ agaghị agụ gị
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị:










