Wadume arrest: Ndị uweojii anwụchigharịala Alhaji Hamisu Wadume

Hamisu Wadume

Ebe foto si, NPF

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Alhaji Hamisu Wadume bụ onye a na-enyo na ọ bụ onyeisi ndị ntọ e ji maka ya gbagbuo ndị uweojii atọ na Taraba nozi n'aka ndị uweojii ugbua ebe ọ na-ekwe ukwe ka nnụnụ mgbama.

Ndị uweojii nwụchigharịala Hamisu Wadume bụ onye a na-achọ achọ kemgbe ndịagha gbapụtara ya n'aka ndị uweojii gara nwụchiya n'ụlọ ya na Taraba maka ebubo ntọ.

N'ihe onynyo nke ndị uweojii wepụtara n'akara Twitter ha, Wadume kwupụtara n ndị uweojii jichiri ya mana ndị agha wụrụ ha mgbọ ma gbapụtara ya.

"Ha kwọrọ m ga n'ogige ha ebe ha nọrọ kwobie ịga a kụrụ m."

Cheta na ndị uweojii nwụchiburu Wadume izu ole na ole gara aga n'obodo ya dị na Taraba steeti ebe ndị agha gbagburu ndị uweojii atọ n'ime ndị uweojii nwụchiri ya ma hapụ Wadume ka ọ gbalaga.

Ndị uweojii si na ha ka na-eche ndị agha ka ha zaa ajụjụ a:

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

A gbagburu Usman Danzumi, Mark Ediale nakwa Dahiru Musa bụ ndi uweojii kara aka so nwụchibu Wadume n'ụlọ ya.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

N'ozi mgbasaozi nke ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Frank Mba binyere aka, ọ gbara ama na ndị uweojii nwụchiri nwa amadi ahụ ụbọchị Tuzde abali 19 nke ọnwa Ọgọst na Kano ebe o zoro.

Onyeisi ndị uweojii Naijria bụ Mohammed Adamu kelere ndị ọrụ ya ma kwuo na nnwụchigharịa e mere Wadume ga-enye aka ikughe ihe zoro ezo n'ihe mere nakwa n'okwu gbasara ike ahụ.

Ikpe Atiku na Buhari

Atiku Abubakar

Ebe foto si, @Atiku

Ụlọikpe kachasị na Naijiria ekpebiela na ha agaghị enye Atiku Abubakar na otu PDP ikike inyocha 'server' etiti n'ikpe onye meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n'afọ 2019.

Ụlọikpe mkpegharị jụburu inye Atiku ikike inyocha 'server' bụ arịịrọ ọ rịọrọ nke mere o jiri gbagharịa akwụkwọ maka nke a n'ụlọikpe kachasị.

Mana a mkpebi Ụlọikpe Kachasị nyere ụbọchị Tuzde, ha kwuru na ha agaghị ewezụga n'ụsọ mkpebi kwụ ọtọ nke ụlọikpe mkpegharị nyere erela na ya bụ okwu.

N'ofesi

Praịm Mịnịsta Ịtali Giuseppe Conte na osote Praịm Mịnịsta Matteo Salvini

Ebe foto si, EPA

Ọgbaghara dị n'ime gọomentị mba Itali e meela ka Praịm mịnịsta ha bụ Guiseppe Conte kwuo na ọ ga-agba arụkwaghịm n'ọrụ ya.

Conte na onye ndu pati Nationalist League bụ Matteo Salvini na-arụ onwe ha aka n'ime ọchịchị ha gbakọtara aka ọnụ hiwe.

N'egwuregwu

Paul Pogba

Ebe foto si, Getty Images

Ọgba bọọlụ nke Manchester United bụ Harry Maguire akpọọla oku ka ndị ụlọọrụ soshal midia kwụsị ndị mmadụ izipụ okwu ịkpaoke agbụrụ.

Nke a na-abịa dịka a kpọrọ Paul Pogba iyi na soshal midia maka ọ tara penariti n'asọmpi ha na ndị Wolves gbara.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

O nweghi mgbe anyị ji wakpo ụlọ Ambode - EFCC

Akinwunmi Ambode

Ebe foto si, "followlasg

EFCC agọrọla isi ha n'akụkọ na-ekwu na ha wakporo ụlọ aka chịburu Legọs steeti bụ Akinwumi Ambode.

N'ime akwụkwọ ozi ha zipụtere, ha kọwara na ọ bụ ọrụ nyocha ka ha na-eme ebe ahụ.

"Ọ bụ nyocha a na-eme ndị Gọvanọ dịka ya dịka ọchịchị ha bịara na njedebe" ka ozi ahụ kwuru.

Ha ji ohere ahụ rịọ ndị mgbasaozi ọ kachasị na soshal midia ha kpachara anya n'ụdị ozi ha na-agbasa banyere ọrụ EFCC.

Ekweremadu na Onyema

Ebe foto si, @IkeEkweremadu/Twitter

Otu kpọrọ onwe ha Enugwu West People's Parliament akatọọla ihe e tiri Ike Ekweremadu na mba Jamini na ngwụcha izuụka gara aga.

Ha kpọkwara oku ka gọọmentị Jamini nyochaa ya bụ ihe, ma gwa ndị Igbo niile nọ n'ọchịchị sị ha ekwela ka otu Indigenous People of Biafra (IPOB) kwapụ mmụọ ha n'ọrụ ha na-arụ.

N'ime akwụkwọ ozi ha zipụtere, ha kelere mmadụ niile etu ha si gbakọọ aka katọọ ihe Ipob mere Ekweremadu.

"Anyị anaghị enyocha Tunde Fowler"

Onyeisiala Muhammadu Buhari

Ebe foto si, @Garshehu/Twitter

Gọọmentị Naịjirịa ekwuola hoo haa na ha anaghị enyocha onyeisi Inland Revenue Service bụ Babatunde Fowler dịka akụkọ si kwuo.

Ha kwuru na akwụkwọ ozi na-efegharị bụ nke Abba Kyari dere ịjụ ase maka ụgwọ ụtụ isi ezughi ezu.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

chọrọ ịzụta anụmanụ ga-anọnyere gị?

Agụ iyi

Ebe foto si, Reuters

Mba Tanzania ebidola ire agụiyi nke dị na be ha. Ha na-eme nke a iji belata ọnụọgụgụ anụ ọhịa ha nke na-awakpo ndị mmadụ.

Dịka ha si kwuo, agụiyi na enyi mmiri bụ anụmanụ abụọ kachasị awakpo ndị mmadụ na mba ha.

N'egwuregwu,

Samson Siasia

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Samson Siasia rụbụrụ ọrụ dịka onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ Naijiria bụ Super Eagles n'afọ 2011

Ngalaba bọọlụ Naịjirịa bụ NFF ekwuola na mmachi ebighebi FIFA machiri Samson Siasia bụ ihe tụrụ ha n'anya.

Ha kwukwara na ndị ọkaiwu ha amalitela nyocha ya bụ mkpebi iji gwa ha ihe ndị ha kwesịrị ime gbasara okwu a.

Gere akụkọ BBC Igbo n'otu nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Emeka Nelson bụ onye nka rụpụtara igwe na-enye ọkụ latric nke na-eji mmiri agba.