Election Tribunal: Ndị n'ọchị ndị n'akwa

Sinatọ ndịn Igbo

Dịka ụlọikpe ntuliaka kpokobachara ikpe maka ntuliaka e mere na mbido afọ 2019, lee ka ihe siri kwuru n'ikpe ụfọdụ a kapigoro ọnụ.

N'Enugwu steeti, ụlọikpe ntuliaka nke Jọstis H.H Kereng nọ n'isi ya eweliela aka Ike Ekweremadu nke PDP dịka onye meriri ntụliaka nke Enugwu West nke ya na Juliet Ibekaku nke APC dọrọ.

Ndị okaiwu anọ kpere ya bụ ikpe sị na Ibekaku achitaghị aja na ya bụ ikpe.

N'otu aka ahụ, Jọstis Sunday Olorundahunsi anọrọla n'Ọka, Anambra steeti kpebie na Victor Ume nke APGA achitaghị aja na ntuliaka ya na Uche Ekwunife mere na ọnwa nke abụọ nke 2019 gbasara oche nke Anambra Centralu.

Otu ahụkwa ka ụlọikpe sị welie aka Ifeanyi Uba dịka onye meriri ntuliaka nke ya na Chris Uba n'oche nke Anambra Saụt ha zọrọ.

Ụlọikpe ntuliaka nke Jọstis A.O. Chijoke nọ n'isi ya kpebiri na aga atụgharị ntuliaka emere na Kogi West nke Dino Melaye meriburu.

Chinedu Oga

Ebe foto si, Chinedu Oga/Facebook

Nkọwa foto, Chinedu Ogah

N'Ebonyi steeti, ụlọikpe ntuliaka nke Jọsitis Sika Henry nọ n'isi ya sị na ọ bụzị Chinedu Ogah nke APC meriri ntuliaka e mere n'Ezza South/Ikwo constituency n'ọnwa nke abụọ nke afọ a.

Ụlọikpe ahụ gwara Inec ka ha nwere ọsọ nwere iji napụta Laz Ogbee nke PDP asambodo mmeri nke ha nyere ya na mbụ ma ye ha Ogah bụ onye ha sị ọ bụ ya ji votu 36,238 merie.

Dino etinyelarị akwụkwọ maka ikpegharị ya bụ ikpe ị sị na ya ekwetaghị ihe ya bụ ụlọikpe kwuru.

Na Sokoto steeti, ụlọikpe ntuliaka ekpebiela na a ga-emegharị ntuliaka e mere na steeti ahụ makana emecheghị ntuliaka e mere na ọgbọnta votu isii nke Sokoto Nọt ii ụlọ nọchiteanya nke steeti ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị