Charles Chukwuma Soludo: 'Ihe mere n'Imo ga-eme n'Anambra ma ọ bụrụ na emeghị ntụlịaka'

Aha onyonyo, Charles Soludo: Oji onye n'ala ji onwe ya n'okwu 'sit-at-home' ndị Ipob

Onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti ma na-azọ ọkwa gọvanọ Anambra Steetị bụ Charles Soludo etinyela ọnụ n'okwu 'sit at home na-aga n'ihu n'ala Igbo.

Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Soludo sị na obi dị ya ụtọ na ndị Ipob akagbuola atụmatụ ịnọ n'ụlọ kwa ụbọchị Mọnde ọbụla.

Ọ sị na ọ bụ ndị Igbo ka ya bụ atụmatụ na-emegbu na ọ bụghị Naịjirịa.

N'okwu ya "O ji onye n'ala ji onwe ya, o nweghi ihe jikọrọ ọkpụ isi na udele".

Soludo tinyekwara ọnụ maka ebubo sị na aka ya dị na nwuchi Nnamdi Kanu na mba Kenya.

Kirie ihe o kwuru n'uju;