Charles Chukwuma Soludo: 'Ihe mere n'Imo ga-eme n'Anambra ma ọ bụrụ na emeghị ntụlịaka'
Onye bụbu onyeisi ụlọakụ etiti ma na-azọ ọkwa gọvanọ Anambra Steetị bụ Charles Soludo etinyela ọnụ n'okwu 'sit at home na-aga n'ihu n'ala Igbo.
Na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC Igbo nwere, Soludo sị na obi dị ya ụtọ na ndị Ipob akagbuola atụmatụ ịnọ n'ụlọ kwa ụbọchị Mọnde ọbụla.
Ọ sị na ọ bụ ndị Igbo ka ya bụ atụmatụ na-emegbu na ọ bụghị Naịjirịa.
N'okwu ya "O ji onye n'ala ji onwe ya, o nweghi ihe jikọrọ ọkpụ isi na udele".
Soludo tinyekwara ọnụ maka ebubo sị na aka ya dị na nwuchi Nnamdi Kanu na mba Kenya.
Kirie ihe o kwuru n'uju;