Anambra Election: Ihe mere ụfọdụ mmadụ anabataghị ntuliaka ime ụlọ PDP na APC n'Anambara

Aha onyonyo, Alex Obiogbolu

Nghọtahie ka na-arị ibe ya elu na pati 'Peoples Democratic Party" (PDP) nakwa "All Progressives Congress" (APC) gbasara ntuliaka imeụlọ ha mere n'ụbọchị Satọde.

Na PDP, ha kewara abụọ ma nwee mmadụ abụọ na-ekwu na ọ ha meriri ya bụ ntuliaka, aha ha bụ Valentine Ozigbo na Ugochukwu Uba.

N'aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị APC na-ekwu na enweghị ntuliaka ọbụla mere na steeti ahụ.

Peter Obi, Alex Obiogbolu ekeleela Valentine Ozigbo nke PDP

Peter Obi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Peter Obi

Aka chịburu AnamAbra steeti bụ Peter Obi ekeleela Valentine Ozigbo maka nturuugo ya na ntuliaka imeụlọ ahụ.

Peter Obi kelere ndị isi PDP n'Abuja maka etu ha si mee ntuliaka ahụ na-enweghị onye ọbụla ha dọnyeere ukwu.

Obi rịọrọ ndị ọzọ so zọọ ndọrọndọrọ ahụ ka ha wetuo obi ma kwadoo Valentine Ozigbo ka udo wee chịa.

Alex Obiogbolu

Ebe foto si, Facebook

N'aka nke ọzọ, Obiogbolu, onye sorola zọọ ọkwa Gọvanọ ugboro anọ na pati PDP, kwuru na ọ bụ Valentine Ozigbo ga-efe ọkọlọtọ PDP na ntuliaka ọkwa gọvanọ na-abịa n'Anambra steeti.

O kwuru sị: "Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ were iwe ga mee ntuliaka nke ha, mana ọ pụtaghị na PDP kere abụọ."

"Ntuliaka nke ndị INEC bịara nyochaa bụ nke anyị mere n'ogige 'women centre' dị n'Awka."

"Onye meriri ya bụ ntuliaka bụ Valentine Ozugbo, ọ bụ ya ga-anọchite PDP n'Anambra steeti.

"Onweghị ezinụlọ anaghị enwe esemokwu, kama ihe dị mkpa bụ e sechaa okwu, edozie."

"PDP amalitela atụmatụ iji kpọghachi ndị niile iwe na-ewe, iji mee ka anyị turu ugo na ntuliaka nke Nọvemba 6."

Chris Ngige akatọọla ntuliaka imeụlọ ndị APC

Chris Ngige

Ebe foto si, Chris Ngige

Nkọwa foto, Chris Ngige kwuru na onweghị ntuliaka ọbụla ndị APC mere n'Anambra steeti

A bịa na pati APC, ndị pati ahụ ekwuola na ọ bụ Andy Uba meriri ntuliaka imeụlọ ha.

Mana ọtụtụ ndị welitere isi na pati ahụ kwuru na ntuliaka ahụ enweghị isi.

Chris Ngige, aka chịburu Anambra steeti ma bụrụkwa onye APC kwuru na enweghị ntuliaka ọbụla e mere n'obodo ya bụ Alor.

Ngige kwuru na ọ ka mma ka etinyegharịa ụbọchị ọzọ a ga-eme ya bụ ntuliaka.

Ọzọ dịkwa ka ibe ya, mmadụ iri na otu n'ime mmadụ iri na anọ soro zọọ ọkwa gọvanọ na pati APC ekwuola na ha anabataghị mpụtara ntuliaka ahụ.

Ha kwukwara na ha anabataghị Andy Uba dịka onye meriri ya bụ ntuliaka n'ihi na ewneghị ntuliaka ọbụla e mere.

Ndị kwuru nke a gụnyere: George Moghalu, Paul Orajiaka, Edozie Madu, Johnbosco Onunkwo, Ben Etiaba, Amobi Nwaokafor, Chidozie Nwankwo, Geoffrey Onyejegbu, na Azuka Okwuosa.