Anambra state elections: Etu anyị si mee ntụliaka imeụlọ APC Anambra nke a sị na e meghị

Andy Uba

Ebe foto si, Andy Uba/Fb

Andy Uba bụbụ sinetọ nọchịtere Anambra South Senatorial District emerie ntụliaka imeụlọ APC e mere n'abalị ụnyahụ ruo ụtụtụ taa n'Anambra steeti.

Gọvanọ Dapo Abiodun nke Ogun steeti mabụrụkwa onyeisi kọmịtị Anambra State Primary Election kwuputere nke a n'ụlọ oriri na nkwarị Golden Tulip dị n'Agulu n'Anambra steeti.

Ubah merịrị mmadụ iri atọ pụtara ịzọ ọkwa onye ga-anọchịte anya pati APC na ntụliaka nke gọvanọ a ga-eme na Nọvemba 6, 2021 n'Anambra steeti.

Gọvanọ Dapo Abiodun

Ebe foto si, APC

Gọvanọ Abiodun kwuru na Uba ji votu nari abụọ na ụma(230, 201) n'ime narị atọ na ụma( 348,490) tụrụ vootu iji merie Onunwoku Johnbosco nwetere vootu 28, 746 karịa mmadụ iri na abụọ ndị ọzọ.

APC Primary Election nke ọkwa gọvanọ

Ebe foto si, APC

O kwuru na e mere ya bụ ntụliaka n'okpuruọchịchị iri abụọ dị na steeti ahụ mana e meghị ya n'okpuruọchịchị Onitsha South makana ndị ọrụ ntụliaka emeghị ntụliaka ka ha natachara ngwa e ji atụ vootu.

Abiodun kwuru na ihe kpatara e ji dọtia oge e ji mee ya bụ ntụliaka imeụlọ APC nke Anambra bụ ebuteghị akụrụngwa n'oge.

O kwuru na agbanyeghị nke a, ha nyere ndị"returning officers" ndị ọrụ nchekwa ga-anọnyere ha na wọọdụ ruru 326 nọ na steeti ahụ nke mere ka ntụliaka hụ gaa sirirị werere.

Ntụliaka imeụlọ APC, Anambra

Ebe foto si, APC

'APC emeghịzị ntuliaka ime ụlọ taa maka e buteghị akụrụngwa e ji eme ya'

Ndí Otu PDP
Nkọwa foto, Ndị mpakala PDP ndị nọ na ọgige Dora Akunyeli Development Centre

Akụkọ na-eru anyị ntị bụ na APC emeghịzị ntuliaka ime ụlọ nke ha taa bụ Satọde.

Otu onye otu ha bụ Kingsley Ibe nọ na Orumba South na-akọwa na ebuteghị ihe e ji eme ya bụ ntuliaka taa.

Ibe sị na 'Onweghị ebe APC mere ntulika n'Anambra steeti niile. Ọ bụ echi bụ Sọnde ka a ga-amalite ya ọzọ".

Ntuliaka PDP agbaala mkpị abụọ n'Anambra steeti

Ntuilaka PDP nọ n'ogige Dora Akunyeli Development Centre amalitela ịtụ vootu

Ka ọ dị ugbua, ndị mpakala nke ọzọ PDP amalitela ịtụ vootu mgbe ọ fọrọ obere ka ọ kụọ elekere asatọ nke abalị.

Omume ndị nke a na-egosi na ọ bụ mpakala nke ha bụ ebe anọ, agbanyeghị na ndị nke ọzọ emela nke ha nye asambodo.

Onye nta akụkọ BBC nọ ebe ahụ hụrụ na onwere ndị tukwu n'isi oche ebe ahụ ha sị si Abuja bia, dịka ndị isi pati na ndị Inec bịara inyocha ka ihe si aga.

Ọ sịkwa na onye ọzọ arituola, sị na ya ga-enyere ndị ọzọ ohere.

Onye ahụ bụ Chuma Nzeribe.

Nzeribe mere ya onye nke anọ rituru kemgbe azọwara ya bụ ọchịchị nke ime ụlọ PDP.

Ntuliaka PDP agbaala mkpị abụọ n'Anambra steeti

Ugochukwu Uba
Nkọwa foto, Ugochukwu Uba natara asambodo mmeri ya izọ ọkwa gọvanọ Anambra site n'otu mpakala nke PDP

Ndị otu PDP mere ntuliaka na Ogige St. Paul ahọpụtala Ugochukwu Uba dịka onye ga-anọchite anya ha na ndọrọndọrọ ọchịchị oche gọvanọ nke Anambra steeti.

O ji vootu narị abụọ iri asaa na ise (275) were merie.

Dịka ntuliaka ime ụlọ na-aga n'ihu na Anambra steeti. BBC chọpụtara na ya bụ ntuliaka nke ndị PDP gbara mkpị abụọ.

Ugochukwu Uba
Nkọwa foto, Sịnatọ Ugochukwu Uba bụ onye meriri na ntuliaka PDP mere n'Ogige Mahadum St. Paul
St. Paul University, Awka
Nkọwa foto, Ndí n'atụ vootu na ọgbọ St. Paul Univeristy, Awka

Ofu ndị na-eme nke ha na ọgbọ Dora Akunyeli ebe ndị nke ọzọ na-eme nke ha na ọgbọ Mahadum St. Paul dị n'Ọka.

Ebe ndị nọ na St Paul tụchagoro malita ịgụ vootu, ndị nke nọ n'Ogege Dora Akunyeli amalitela ịtụ vootu.

N'Ọka ndị PDP na APC amalitela njem ịhọpụta onye ga-nọchite ha na ntuliaka ọkwa Gọvọna Anambra steeti n'ụbọchị isii nke ọnwa Nọvemba afọ 2021.

Nke a na-abịa dịka otu 'All Progressives Grand Alliance' (APGA) mere nke ha n'ụbọchị Wenezde, ebe ha nọrọ họpụta Chukwuma Soludo.

Ntuliaka pdp

Ọtụtụ mmadụ na-ekwu na ọ bụ n'ime pati atọ a - APGA, APC na PDP - ka onye ọzọ ga-achị Anambara steeti ga-esi apụta.

Ọnụ na-ekwuru ndị PDP n'Anambra bụ Nnamdi Nwangwu gwara BBC na ọ bụ mmadụ iri na isii (16) ga-eso zọọ ọkwa a.

N'aka nke ọzọ, onye na-ekwuru APC n'Anambra bụ Okelo Madukaife gwara anyị na mmaọdụ iri na anọ (14) ga-azọ ya bụ ọkwa na pati nke ha.

Ntuliaka pdp

PDP nọ na ebe-akpọrọ "Dora Akunyili Women Development Centre" nke dị n'Ọka eme nke ha, ebe APC sị na nke ha ga-abụ na "Ward" dị iche iche.

Na "Women Development Centre" ndị isi ha gbagotere na PDP awuchiela n'ọgbọ dịka a na-enyocha aha nakwa ịhọta ndị ga-abanye n'ime ulọ mee ntuliaka a.

N'otu aka ahụ, ndi APC nọ n'Orumba South, ndị nchịkọta ya bụ ntuliaka ime ụlọ kwere nkwa na ya ga-abịa ịmalite ebe ahụ n'elekere iri nke ụtụtụ, ma rụọ elekere abụọ nke ehihie, ọnwebeghị onye hụrụ ha.

Kingsley Ibe

Ebe foto si, Kingsley Ibe

Nkọwa foto, Ndị na-eche ndị nchịkọta ntuilaka na Community primary school, Umuchukwu Nkerehi/Umuchukwu

Akụkọ anyị nụrụ site n'ọnụ Mazi Kingsely Ojo Ibe sị na ndị mmadụ ejula ebe ahụ aha nọ Nkerehi/Umuchukwu mana na-eche ndị ọrụ ntuliaka ahụ mana ha hụbeghị ha dịka o ji ọkara gafechaa elekere abụọ nke ehihie.

Knigsley Ibe

Ebe foto si, Kingsley Ibe

Nkọwa foto, Ndị na-eche ndị nchịkọta ntuilaka na Community primary school, Umuchukwu Nkerehi/Umuchukwu

Otu ahụ ka ọ dịkwa na Ukwuoji and Amaikwo wọdụ 6 nakwa wọdụ 2 n'Ọka South ebe ndị mmadụ juru n'ezi na-eche ndị nchịkọta ma ha ahụbeghị onye ọbụla.

Amaikwo ward 6
Nkọwa foto, Ndị mmadụ ka na-eche ndị ọrụ nchịkọta ntuilaka n'Amaikwo ward 6

Ndị mmadụ ka na-eche ngwongwo e ji eme ya bụ ntulaika dịka ọ kugoro elekere atọ nke ehihie kpọmkwem.

Ukwuoji

Ọnwebeghị ihe na-eme na okpuruọchịchị Njikọka dịka ndị ọrụ nchịkọta atụbeghị ukwu ebe ahụ.

N'Orumba South, akụkọ na-eru anyị ntị bụ na ndị ọrụ Inec abatala na wọdụ ahụ dị na Nkerehi/Umuchukwu, nama ndị Pati APC ga-achịkọta ya bụ ntuliaka abịabeghị dịka o ji ọkara gafee elekere atọ nke ehihie.

PDP amalitela nnyocha ndị ga-ebinye aka n'ogige egwueregwu Mahadum St. Paul dị n'Ọka ka ọ kụchara elekere anọ nke mgbede.

St. Paul University, Awka
Nkọwa foto, Ndí n'atụ vootu na ọgbọ St. Paul Univeristy, Awka
St. Paul University, Awka
Nkọwa foto, Okpokoro e ji ahọpụta ndị ga-atụ vootu maka Gọvanọ ndị Anambra steeti
Ndị na-aga ịtụ vootu
Ndị Aguata
Nkọwa foto, Ndị si okporuọchịchị Aguata na-atụ vootu.

Lee ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ na PDP:

Ụfọdụ n'ime ndị PDP na-azọ ọkwa Gọvanọ

Ebe foto si, PDP

Nkọwa foto, Ụfọdụ n'ime ndị PDP na-azọ ọkwa Gọvanọ

1) Uche Ekwunife:- Nwaada a bụ onye omeiwu ukwu nke na-anọchite anya mpaghara 'Anambra Central' na sineti Naịjirịa.

Ọ gụrụ akwụkwụ na Mahadum Calabar nakwa nke Nnamdi Azikiwe dị n'Awka.

2) Obiora Okonkwo: bụ onye Ogidi n'Anambra steeti.

Ọ gụrụ akwụkwọ na mba Russia, ma bụrụkwa onye nwe ụlọọrụ ụgbọelu 'United Nigeria Airline'.

3) Ifedi Okwenna: Ọ rụburu ọrụ dịka Kọmishọna oge Peter Obi bụ Gọvanọ Anambra.

Ọ bụ onye Osumenyi n'okpuru ọchịchị Nnewi South.

4) Godwin Ezeemo: bụ onye Umuchu nke dị n'Aguata.

O sokwa zọọ ọkwa gọvanọ Anambra na 2017.

5) Emeka Etiaba: bụ ọkaiwu a ma ama na Naịjirịa, nke nweterel ọkwa 'Senior Advocate of Nigeria'.

Nne ya bụ Dame Virginia Etiaba, onye bụbu osote gọvanọ Anambra.

6) Chris Azubogu: Ọ bụ onye Nnewi ma bụrụkwa onye omeiwu n'ụlọ omeiwu nta Naịjirịa.

Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadu Naịjirịa dị na Nsụkka.

7) Godwin Maduka: Ọ bụ onye dọkịta a ma ama na mba Amerịka.

Obodo ya bụ Nkerehi nke dị n'Orumba South, mana ugbua a na-akpọzi ha Umuchukwu.

Ụfọdụ n'ime ndị PDP na-azọ ọkwa Gọvanọ

Ebe foto si, PDP

Nkọwa foto, Ụfọdụ n'ime ndị PDP na-azọ ọkwa Gọvanọ

8) Tony Nwoye: O so zọọ ọkwa gọvanọ Anambra na pati APC.

Ọ rụkwara ọrụ dịka onye ụlọ omeiwu nta Naịjirịa.

9) Walter Okeke: bụkwa onye ojiego achụ ego.

Ọ bụ ya nwe ụlọọrụ 'Richwood and Richland Int'l'.

10) Winston Udeh: Ọ bụ onye Ndiowu n'Orumba North.

Ọ bụ onye na-ese ụlọ bekee kpọrọ 'architect', bụrụ onye ọkaiwu ma nke ọ na-eme, ma bụrụkwa onye oji ego achụ ego.

11) Valentine Ozigbo: Ọ bụ onye Aguata, gụọ akwụkwọ na Mahadum Naịjirịa dị na Nsukka.

Ọ rụburu ọrụ n'ọtụtụ ụlọakụ na Naịjirịa tupu e mee ya onyeisi 'Transcorp Hotels'.

12) Chidi Onyemelukwe: Nwaada a bụ ọkaiwu nwetara ọzụzụ na mba Wales nke UK.

Oge Mazị Oseloka Obaze zọrọ ọkwa Gọvanọ n'Anambra n'afọ 2017, Onyemelukwe bụ osote ya.

13) Ugochukwu Uba: Ọ bụ onye Ụga, n'okpuru ọchịchị Aguata.

Ọ bụ nwanne Andy Uba na Chris Uba.

14) Johnny Maduafokwa: Ọ bụ otu onye n'ime ndị isi n'ụlọọrụ mmanụ agbidi 'Tecon oil'.

15) Genevieve Ekwochi: Ọ bubu Kọmishọna na-ahụ maka ọdị mma ụmụnwaanyị n'Anambra steeti.

16) Nzeribe Marcellinus: Ọ bụ onye omeiwu

Lee nke na-akpọtụ na APC

N'ụtụtụ Satọde a ka onye bụbu onye omeiwu ji ọkọrọ ntị APC bụ Tony Nwonye na butere okwu kowere ọtụtụ ndị otu obi n'elu site na-ikwu na akwụkwọ edepụtara aha ndị ga-ahọpụta onye nnọchite anya ha bụ adịgboroja.

Nke a mere ya na Emeka Etiaba na Johnny Mmaduafokwa ji pụọ na ya bụ ndọrọndọrọ sị na ha emejuola.

Cheta na Tony Nwonye si PDP bata na APC ịzọ ya bụ ọkwa.

Lee ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ na APC:

Ụfọdụ n'ime ndị APC na-azọ ọkwa Gọvanọ

Ebe foto si, Facebook

Nkọwa foto, Ụfọdụ n'ime ndị APC na-azọ ọkwa Gọvanọ

1) Andy Uba: Ọ chịburu Anambra steeti nwa oge nta n'afọ tupu ụlọikpe Supreme Court achụtuo ya tinye Peter Obi

Uba rụkwara ọrụ ọtụtụ afọ dịka Sinetọ na-anọchite Anambra North

2) Chidozie Nwankwo: Ọ bụ onye ojiego achụ ego a ma ama.

Ọ bụ onye Oko, nke dị n'Orumba North

3) George Moghalu: Ọ bụ onye Nnewi. Ọ zọkwaala ọkwa gọvanọ Anambra steeti na 2003.

N'afọ 2019, onyeisiala Buhari mere ya onyeisi ngalaba 'National Inland Waterways Authority'.

4) Paul Orajiaka: Ọ bụ onye Azia, n'okpuru ọchịchị Ihiala

O nwere ụlọọrụ na-emepụta ihe egwuregwu ụmụaka bekee kpọrọ 'toy'

5) Geoffrey Onyejegbu: Ọ bubu ọchịagha n'otu ndị agha Naịjirịa.

Ọ bụkwa onye na-ese ụlọ nke bekee kpọrọ 'architect'.

6) Azuka Okwuosa: Ọ rụọla ọrụ dịka Kọmishọna n'Anambra steeti malite n'afọ 1999 ruo 2001.

Ọ bụ onye Nnewi ma bụrụkwa onye otu APGA n'oge gara aga.

7) Nwokafor Daniel: Ọ bụ onye Okpuno Awka.

Ọ bụ onye ọgbakọ ego (accountant) a ma ama, ma bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ 'Audit House'

Ụfọdụ n'ime ndị APC na-azọ ọkwa Gọvanọ
Nkọwa foto, Ụfọdụ n'ime ndị APC na-azọ ọkwa Gọvanọ

8) Ikeobasi Mokelu: Ọ rụrụ ọrụ dịka Mịnịsta mgbasaozi na Naịjirịa n'oge Ọchịagha Sani Abacha nọ n'ọchịchị.

O so na ndị isi otu na-akwado Buhari a na-akpọ 'I stand with Buhari'.

9) Ben Etiaba: Ọ bụ nwanne Emeka Etiaba onye na-azọkwa ọkwa Gọvanọ na pati PDP. ọ bụ Ben tọrọ Emeka.

Ọ bụ onyeisi otu ' Institute of Chartered Accountants of Nigeria' malite na 2003 ruo 2005

10) Godwin Okonkwo: Ọ bụ onye ụkọchukwu ụka Anglịkan.

Ọ rụọla ọrụ ọtụtụ afọ n'ụlọọrụ mmanụ agbịdị Naịjirịa bụ NNPC.

11) Onunkwo Johnbosco: Ọ na-arụ n'ụlọọrụ mmanụ agbidi bụ AGIP.

Ọ bụ onye Umuchu, dị n'Aguata.

12) Maxwell Okoye: Ọ bụ onye n'otu a kpọrọ 'Presidential Support Committee' nke onyeisiala Buhari.

Ọ bụ ya na-ahụ maka mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na ya bụ otu.

Ụfọdụ n'ime ndị APC na-azọ ọkwa Gọvanọ
Nkọwa foto, Ụfọdụ n'ime ndị APC na-azọ ọkwa Gọvanọ

13) Edozie Madu: Ọ zọọla ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2019 na pati a kpọrọ 'Independent Democrats'.

14) Igwebuike Ifeanyi: Ọ zọkwaala ọkwa gọvanọ n'oge gara aga.