Gummen attack: Ndị ọkaiwu Anambra steeti echerela Obiano aka mgba maka oke ogbugbu mmadụ na ntọ

Ebe foto si, Frank Ibechukwu
Taa bụ Tuzde bụ abalị abụọ ndị otu jikọtara ndị ọkaiwu n'Anambra steeti bụ Nigeria Bar Association agbara abụbụ ọrụ maka ọnwụ onye otu ha ndị ntọ gburu izu gara aga.
Odeakwụkwọ ndị otu ahụ n'Onicha bụ Frank Ibechukwu sị na ji ya bụ ohere zigara Gọọmentị steeti ahụ ozi ime ka ha kee ajị n'ume ma kwusinata oke ogbugbu mmadụ bụ nke na-arị ibe ya elu na steeti ahụ
ugbua.

Ebe foto si, Frank Ibechukwu
Frank kwuru na ha buuru ngagharịiwe buga n'obi gọọmentị n'Awka bụ ebe odeakwụkwọ gọọmentị steeti ahụ bụ Ọkammụta Solo Chukwulobelu nabatara ha.

Ebe foto si, Frank Ibechukwu
Onyeisi ndị NBA niile bụ Steve Onyechi Ononye bụ onye kwuchitere ọnụ ndị ọkaiwu a chetere gọọmentị maka ntọ na ogbugbu onye otu ha Frank Onwuachi bụ onyeisioche ndị Omor dị n'Okpuruọchịchị Anyamelum izuụka gara aga.
N'onu ya "anyị gara ịhụ gọvanọ ka anyị mara ihe na-eme n'Anambra steeti gbasara oke ugbugbu mmadụ niile na-eme na steeti a; ma onye otu anye egburu ma ogbugbu ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na steti a".

Ebe foto si, Frank Ibechukwu
Ndị okaiwu a sị na ha kwusiri ọrụ abalị atọ, site 21 ruo 23 nke ọnwa Maachi maka nkwanye ugwu ndị niile egburu egbu n'oge a na steeti ahụ.

Ebe foto si, Ogbonnanya Obasi
Onye otu ha so gaa ya bụ ngagharịiwe bụ Ogbonna ya Obasi sị na ndị ọrụ nchekwa ekweghị ka ha baa n'obi gọọmentị ga hu gọvanọ maka ya bụ mkpesa.
Ọ sị "anyị siri ọnwụ ị ga hụ Gọvanọ Willie Obiano mana ndị ọrụ nchekwa nọ na obi gọọmentị ahụ ekweghị ka anyị banye".
Cheta na izu gara aga na ndị amaghị ndị ha bụ gbagburu onye agha mmiri.
Ọ mecheghị abalị abụọ a gbagbuo otu onye nche ndị nga na otu onye uweojii nwaanyị.
Ka na-ekwu nke ahụ, ndị otu nzuzo gbuo otu nwantorobịa n'ihu nne ya buru isi ya laa n'okija.








