Nnamdi Kanu: Iwe m n'ebe Ipob nọ bụ..... Ijele Speaks

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Iwe m n'ebe Ipob nọ bụ..... Ijele

Chukwuka Ofoegbu e ji 'Ijele Speaks' mara bụ onye na-akatọkarị otu Indigenous People of Biafra ekwuola etu okwu si sewere ya na otu Indigenous People of Biafa.

O kwuru na Ipob boro ya ebubo ụgha nke ka na-ewute ya nke ukwu.

O kwuru na ihe mere o ga-eji hia ahụ ikpezi udo n'etiti ya na ndị otu Ipob.

Ihe niile o kwuru gbasara esemokwu a dị n'ihe nkiri a dị n'elu ebe a.

BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnụ ndị isi Ipob gbasara ebubo ndị a mana Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru otu ahụ kwụrụ na o nweghị ihe jịkọrọ ha n'Ijele makana "anyị abụrọ ọgbọ."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: