Ipob Women Protest: Ihe mere ụmụnwaanyị ji buru ngagharịiwe gaa n'ụlọọrụ BBC dị na Lọndọn

Ụmụnwaanyị na-eme ngagharịiwe
Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị Ipob na-eme ngagharịiwe n'isiụlọọrụ BBC dị na Lọndọn

Ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bi na Lọndọn eburula ngagharịiwe gaa n'isi ụlọọrụ mgbasaozi BBC dị na Lọndọn.

Ọtụtụ n'ime ndị a jupụtara na ụmụnwaanyị (ndị nne na ụmụagbọghọ) yicha akwa e dere "tọhapụ Nnamdi Kanu" ma na-abụ abụ n'oke olu.

Ụmụnwaanyị a techara nzu ọcha n'ahụ nakwa n'ihu ha, ụfọdụ n'ime nọ na-ekpe ekpere na-eti aka n'ala.

Ha jikwa ọkọlọtọ Biafra ma na-ajụ "gịnị mere BBC anaghị ekwu maka mwakpo ha sị na-eme n'ala Biafra?".

Ụmụnwaanyị a sị na ihe mere ha ji buru ngagharịiwe a bịa n'ụlọọrụ BBC bụ ka mbaụwa nụrụ olu ha ma gbapụta onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu.

Ụmụnwaanyị Ipob na-eme ngagharịiwe n'isiụlọọrụ BBC dị na Lọndọn
Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị Ipob na-eme ngagharịiwe n'isiụlọọrụ BBC dị na Lọndọn

Ha kwukwara na ọ bụrụ na aka BBC na gọọmentị Briten adịghị n'ihe na-eme na Naịjirịa, ka BBC kọọ akụkọ banyere ya.

Kedụ ihe ụmụnwaanyị ndị a sị ha chọrọ?

Ụmụnwanyị a kpụ ọtụtụ okwu n'ọnụ n'oge ngagharịiwe ahụ nke gụnyere;

  • Ka mba Briten nye ha Biafra
  • Ka mba Briten gwa Naịjirịa ka ha tọhapụ onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu
  • Ka ụlọọrụ mgbasaozi BBC malite ịkọ akụkọ banyere Nnamdi Kanu nakwa Biafra dgz.
Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Ndị aka ha dị na nwuchigharị ya ka nkụ - Ifeanyi Ejiofor