Ipob Women Protest: Ihe mere ụmụnwaanyị ji buru ngagharịiwe gaa n'ụlọọrụ BBC dị na Lọndọn

Ndị otu Indigenous People of Biafra (IPOB) bi na Lọndọn eburula ngagharịiwe gaa n'isi ụlọọrụ mgbasaozi BBC dị na Lọndọn.
Ọtụtụ n'ime ndị a jupụtara na ụmụnwaanyị (ndị nne na ụmụagbọghọ) yicha akwa e dere "tọhapụ Nnamdi Kanu" ma na-abụ abụ n'oke olu.
Ụmụnwaanyị a techara nzu ọcha n'ahụ nakwa n'ihu ha, ụfọdụ n'ime nọ na-ekpe ekpere na-eti aka n'ala.
Ha jikwa ọkọlọtọ Biafra ma na-ajụ "gịnị mere BBC anaghị ekwu maka mwakpo ha sị na-eme n'ala Biafra?".
Ụmụnwaanyị a sị na ihe mere ha ji buru ngagharịiwe a bịa n'ụlọọrụ BBC bụ ka mbaụwa nụrụ olu ha ma gbapụta onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu.

Ha kwukwara na ọ bụrụ na aka BBC na gọọmentị Briten adịghị n'ihe na-eme na Naịjirịa, ka BBC kọọ akụkọ banyere ya.
Kedụ ihe ụmụnwaanyị ndị a sị ha chọrọ?
Ụmụnwanyị a kpụ ọtụtụ okwu n'ọnụ n'oge ngagharịiwe ahụ nke gụnyere;
- Ka mba Briten nye ha Biafra
- Ka mba Briten gwa Naịjirịa ka ha tọhapụ onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu
- Ka ụlọọrụ mgbasaozi BBC malite ịkọ akụkọ banyere Nnamdi Kanu nakwa Biafra dgz.










