Nnamdi Kanu Arrest: Chukwuma Soludo agọrọla ọnụ ya n'ebubo gbasara nnwuchi onyeisi IPOB

Nnamdi Kanu na Charles Soludo

Ebe foto si, Getty Images/Charles Soludo

Nkọwa foto, Nnamdi Kanu na Charles Soludo

Chukwuma Soludo ekwuola na ndị na-ebo ya ebubo gbasara nnwuchi Nnamdi Kanu bụ ndị chọrọ imetọ aha ya dịka o so azọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti.

N'akwụkwọ ozi si n'aka onye enyemaka mgbasaozi ya bụ Ejimofor Opara, Soludo kwuru na ebubo ahụ atụpụghị ya ajị n'ahụ n'ihi na onweghị eziokwu dị na ya.

O kwuru sị: "Kedụ ka mmadụ nwere uche ga-esi kwuo na aka Soludo dị na nnwuchi Nnamdi Kanu? Nke a bụ okwu ịkpa ọchị,"

"Soludo kpọọrọ ndị Igbo iri na abụọ welitere isi gaa leta Nnamdi Kanu oge ọ nọ n'ụlọ mkpọrọ Kuje n'afọ 2017, ma kwuo okwu dara ụda oge ahụ sị na 'Nnamdi Kanu akarịghị iwu Naịjirịa, mana o kwesịghị ka e dobe ya n'okpuru iwu'."

"Nke a mere na oge Nnamdi Kanu pụtara na mkpọrọ, ọ kpọrọ Soludo ma kelee ya."

Soludo kwukara na ọ gbaghị ya gharịị na ụdị akụkọ a na-efesa ugbua "n'ihi na ụfọdụ na-eche na naanị ụzọ ha nwere ike iji merie ntuliaka nke Nọvemba 6 bụ ịkatọ aha Soludo."

Ipob arịọla Gọvanọ Wilie Obiano mgbaghara

Ipob na Willie Obiano

Nke a na-abịa dịka ọnụ na-ekwuchitere otu Ipob bụ Emma Powerful kwuru na ha bụ ndị Ipob na-akagbu ebụbọ ha boro Gọvanọ Wille Obiano n'aka ya dị na nnwụchi Nnamdi Kanu.

Emma Powerful kwuru na nnyocha ọhụru ha mere gosiri na n'ezia aka Gọvona Obiano anọghị na ya bụ okwu.

Aha onyonyo, BBC Igbo Exclusive : Ndị Igbo kwesịrị ịchị Naịjirịa na 2023 mana ha na ndị ugwu ga-adị na mma - Shehu Sani

Maazị Emma riokwara ka a gbaghara ha maka ebubo a ha boro ya.

N'ozi a, ọ depụtakwara na aka Victor Umeh dịkwa ọcha dịka olu ozi adịgboroja nke na abụghị olu Umeh na-efeghari na soshal mịdịa.

Ha kwuru na ha ga achọpụta ndị na ebogide ha ebubo nzipụta ozi a.

Maazị Emma kwusiri ike ka o si kwuo na mbu, na aka Emeka Offor, Gọvanọ Nyesom Wike, Chris Ngige nakwa Gọvanọ Hope Uzodinma nọ n'okwu nwụchị Nnamdi Kanu.

N'akwụkwọ ozi ikpeazụ Emma Powerful wepụtara, ọ tinyere aha Chukwuma Soludo n'aha ndị ha sị n'aka ha dị na nwuchigharị Nnamdi Kanu.

O kwukwara na ndị a tụkọtara ego ọnụ ịhụ na anwụchịgharị Nnamdi Kanu.

Ozi ya kwuru na ndị a mere nke a maka ịchọ ọdịmma onwe ha nanị nakwa maka atụmatụ ndọrọndọro ọchịọchị nke ha huru ka ihe dị mkpa karia nwereọnwe Biafra.

Na nchikọta okwa ya, Maazị Emma kwuru sị "Anyi chọrọ ka ọha nụ nke a, ihe ọbụla mee onyeisi anyi bụ Nnamdi Kanu, ala Biafra ga-ebukwasi ya n'isi ndị a, ha agaghi akwusi ọchụchọ anyị"

Ngige ekwuola maka ebubo na aka ya dị na nwụchịgharị Nnamdi Kanu

Nnamdi Kanu na Chris Ngige

Ebe foto si, Kanu/Ngige facebook page

Mịnista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige agwaala otu indigenous People of Biafra na ha kwụsị ibo ya ebubo na aka ya dị na nwụchịgharị onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu.

Ọnụ na-ekwuchitere Ngige gwara BBC Igbo n'aka na ụkwụ Ngige adịghị na nwụchịgharị Kanu kama ncha."

N'ime akwụkwọ ozi o wepụtara na mbụ , Ngige kwuru na o nweghị ohere imakwụnye onwe ya n'ihe banyere nchekwa nakwa mmekọrịta mba ofesi.

O kwuru na etu ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful si tikọta ya na nwụchigharị Kanu jọgburu onwe ya.

N'ime ozi ahụ, o kwuru na ihe gbasara ọkwa ya dịka minista na-ahụ maka ọrụ na ewemorụ nakwa ikike gọọmenti etiti nyere ya isonye n'ọgbakọ ekpokọbara iji buso mfesa ọrịa covid agha.

Cheta na Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuchitere otu Indigenous People of Biafra kpọptara aha Ngige, Willie Obiano(gọvanọ Anambra), Nyesom Wike( gọvanọ Rivers steeti) nakwa onye azụmahịa bụ Emeka Offor dịka ndị so mee ka a nụchịgharịa Nnamdi Kanu.

Powerful kwuru na "ha ga-akwụ ụgwọ ihe ọjọọ ha mere."

Willie Obiano na Emeka Offor ekwuola na aka ha adịghị na nwuchi Nnamdi Kanu

Emeka Offor na Willie Obiano

Ebe foto si, SEOF/Facebook/ASGVT

Emeka Offor esitela n'aka onye enyemaka ya maka mgbasa ozi bụ Ebuka Onochie Obi kwuo na aka ya adịghị na nwụịchiharị gọọmentị Naijirịa nwụchịrị Nnamdi Kanu.

Ọ bụ n'akwụkwọ ozi ọ depụtara n'ụbọchị iri na asaa nke ọnwa Julaị afọ 2021 ka o kwuru nke a.

O kwuru sị, " Anyị amatala maka ebubo n'ịntanetị na-ekwu na aka Emeka Offor dị na mkpọlata Nnamdi Kanu na Naijirịa".

Ha sị na ọ bụ ya mere ha jiri depụta ya bụ akwụkwọ ozi ma kwusie ike na aka ha adịghị na ya bụ akụkọ ma sị na ọ bụ ndị na-amaghị ihe ekwe na-akụ chọrọ ịmetọ aha Emeka Offor.

O kwuru na ihe dị mkpa ugbua bụ ngalaba Sir Emeka Offor Foundation nke o ji enyere ndị mmadụ aka.

Akụkọ na-efagharị sị na Willie Obiano tinyere aka na nwụchiharị Nnamdi Kanu bụ asị

Gọvanọ Anambra Steeti

James Eze bụ ọdeakwụkwọ ukwu nke gọvanọ Anambra Steetị bụ Wille Obiano ekwuola na akụkọ na-efeghari na ịntanetị nke sị na aka Gọvanọ Obiano nọ na ntọrọ nakwa nwụchị Nnamdi Kanu bụ akụkọ ugha.

N'ozi ya ọ gwara ndị mmadu ka ha kagbuo ya bụ akụkọ dịka enweghi okwu eziokwu so ya cha cha.

O kwukwara na Gọọmentị etiti nakwa Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari anaghi achọ eneymaka Gọvanọ obula n'okwu ọrụ nchekwa na Naijiria dịka ya na ndị kachamaru ya bụ ọrụ, bụ ndị agha nakwa ndị ọrụ nchekwa ọzọ nọ n'isi ya bụ okwu.

Na nchikọta okwu ya, o kwuru na ndị zipụtara ozi a ma ụma zipụta ya ka o bute ọgbaghara nakwa esemokwu n'etiti ndị mmadu.

Ebe okwu a si pụta

Aha onyonyo, Ihe mere anyị jiri chọọ ka akpọrọ Nnamdị Kanu gaa nga - Aloy Ejimakpr

Chetekwa na akwụkwọ ọnụ na-ekwuru otu Indigenous People of Biafra (Ipob) binyere aka gụnyere aha Gọvanọ Willie Obiano, Gọvanọ Nyesom Wike bụ Govanọ Rịvas Steetị, Emeka Offor, Chris Nwabueze Ngige nakwa ọgaranya ụmụ Igbo ndị ọzọ na ndị aka nọ n'okwu nwụchi Nnamdi Kanu.

Ya bụ akụkọ kwuru na ndị Ipob mere nyocha nke gosiri na aka ndị a nọ na nwụchi Maazị Kanu.

Akụkọ a kwukwara na ndị a edepụtara aha ha nyere gọọmentị oke ego ịhụ ka nwụchia dị ire n'ezia.