Heart Murmur a si na eme Nnamdi Kanu, Kedụ ihe ọ bụ?

Ebe foto si, Getty Images/Think Stock
Ọ bụghịzi akụkọ ọhụrụ na ọkaiwu Nnamdi Kanu bụ Alloy Ejimakor ekwuola na Maazi Kanu nwere ọnọdụ mkpụrụ obi nke beekee n'akpọ "heart Murmur", kamgbe anwụchichara ya.
O kwukwara na ọ bu ọrịa ọbara mgbalịelụ.
Anyi na dọkinta bekee na-ahụ maka oria obi achọghị ka akpọọ aha ya kọwara ihe bụ Heart Murmur, ihe na-akpalịte ya, nakwa etu mmadu ga-esi zere ya.
Kedụ ihe bụ "Heart Murmur"?
Dọkịnta ahụ kwuru na Heart Murmur pụtara obi mmadu ịkụ ma na-eme oke mkpọtụ.
Obi onye ahụ ya zuru oke nwere ike ịkụ nwayoo nwayoo mana nke onye obi ya nwere ọnọdụ 'heart murmur' ga-adapụta ụda ma e were akụrụngwa ndị ọrụ ahuike na-akpọ "stethoscope" gee ọkụkụ mkpụrụobi ya.
Ọ bụ gịnị na-akpalịte ya bụ ọnọdụ n'ahu mmadu?
Dịka Dọkịnta ahụ si kwuo, ọtụtụ ihe maọbụ ọnọdụ ndị ọzọ nwere ike ikpalite "Heart Murmur" a n'ahu mmadụ.
Lee ihe anọ ọ kpọpụtara:
1. Nnyocha sayensị na-egosi na-ọrịa "valve" mkpụrụobi na akacha akpalịte ọnọdụ 'heart murmur' n'ahụ ndị mba Afịrịka.
Mkpalite a nwere ike ipụta n'uzo atọ:
- Ọ bụrụ na mgbe onye ahụ dị na nwata na o nwere ọrịa akpịrị mgbu beekee na-akpọ "sore throat" ma eleteghi ya anya, ya bụ ọrịa nwere ike ịkpalite ọnọdụ "heart murmur".
- Ọ bụrụ n'ahụ onye okenye kara nka, ihe nwere ike ịkpalịte "Heart Murmur" bụ mgbe akwara na-ebughari ọbara n'ahu ya adịghịzị ike ịrụ ọrụ.
• Mgbe ụfọdụ, sayensị na-ekwukwa na ha enweghi ike ịchọpụta ihe na-akpalịte ya bụ ọnọdụ n'ahụ mmadu.
2. Ọ buru na mpaghara ime ahụ mmadu nke na-emeputa ihe a na-akpọ " thyroid" bido mepụtawa ya bụ "thyroid" nke ukwu, o nwere ike ịkpalịte ọnọdụ "heart murmur"
3. Ọrịa ọbara mgbalịelụ nwekwara ike ịkpalite ọnọdụ "Heart Murmur" n'ahụ mmadu. Nke a pụtara na onye ahụ ariala ya bụ ọrịa ruo afọ olemole ma hapụ ileta ahụ ya anya chaachaa.
N'ezie, ihe nnyocha sayensị na-egosi bụ na ọ ga-ara ahụ tupu ọrịa ọbara mgbalịelụ akpalite ọnọdụ "Heart Murmur".
4. Ọrịa na-efe efe febanye n'ime mkpụrụobi mmadu, o nwere ike ikpalịte ọnọdụ "Heart Murmur" n'ime ahụ ya, nke a ka ndị bekee n'akpọ "endocarditis"

Ebe foto si, Nigeria Presidency
Dọkịta ahụ kwuru na dịka ihe na-akpalịte ya bụ ọnọdụ dị ọtụtụ, izere ya anaghi a dị mfe.
Otu ihe dị mkpa n'izere ọnọdụ a bụ mmadu ịga nnyocha n'ụlọọgwụ kwa mgbe kwa mgbe nakwa ilebara ọnwe ya anya ma o nwee ọrịa ọbụla n'ahu ya.
Cheta na Nnamdi Kanu onye gọọmenti nwụchiri ma kpụpụ ụlọikpe kamgbe June 29, 2021 ka nọ n'aka ndị Department For State Service ebe ọ na-eche ikpe a ga-ekpe ya n'ụbọchị July 26, 2021.










