Sunday Igboho arrest: Ihe ọkaiwu nwa amadi a kwuru maka nwụchị ya na Cotonou

Ebe foto si, Sunday Idogho
Ọkaiwu Sunday Igboho bụ onye na-achọ nwereonwe ndị Yoruba ekwuola na ndị ọchịchị Benin Republic nwụchịrị Igboho mgbe ọ na-akwado ibanye ụgbọelu na-aga mba Jamini.
Yomi Aliyu (SAN) bụ ọkaiwu nke Sunday Igboho gwara BBC na ọ ma na a ga-akpụkpụ Igboho ụlọikpe taa bụ Wednesday Julaị 21,2021 makana ndị nwụchịrị ya nakwa gọọmenti Naịjirịa ga-achọ inweta ikike ga-enyere ha aka ka ha kpọlata Igboho na Naịjirịa."
"E nweterem akụkọ na a tụrụ Igboho ịga, ọ nọ na mgbu makana o merụrụ ahụ mgbe a chọrọ ịnwụchị ya n'ọdọụgbọelu n'ụbọchị Mọnde.", ọkaiwu ya kwuru.
Ndị uweojii Naịjirịa na-achọ Igboho onye nke e kwuru na a hụrụ ngwa agha na bee ya.
A wakporo ụlọ Igboho izu ụka atọ gara aga.
Ndị ọrụ nchekwa ekwubeghị ma anwụchịrị nwa amadi a nke ha ji ekwu ka e si nwụchị ya.
A ga-akpọlata Sunday Igboho na Naịjirịa?
Aliyu kwuru na nkwekọrịta ikike ịkpọlata mmadụ site na mba ọzọ nke bekee kpọrọ (Extradition Treaty of 1984 )dị n'etiti mba Togo, Naịjirịa, Ghana nakwa Republic of Benin agụyneghị ndị ndọrọndọrọọchịchị a na-achụ ọsọ.
O kwuru na ọ bụrụ na onye ahụ a na-achụ ọsọ enweteghị ikpe nkwụmọtọ maọbụ a dọtịa oge e ji ekpe ikpe naka ihe enweghị isi, mba ebe ọ gbagara agaghị atọhapụ ya.
N'okwu ya, "Article 20 nke "African Charter on Human and Peoples Rights" nke mba anọ a binyechara aka mere ka ndị na-achọ nwereonwe nwe ikike e kwesiri ichekwa."
"Nke a mere ka Sunday Adeyemo bụrụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị mba Benin Republic aghaghị akpọlatanwu n'ihi ihe ọbụla." dịka Aliyu si kwu.
Ịchụgharị Sunday Igboho, Nnamdi Kanu bụ ịchọ udo na-enweghị ikpenkwụmọtọ - Ohaneze

Otu Ohaneze Ndigbo ekwuola na ọ kaara onyeisiala Muhammadu Buhari mma ịchọ ikpemkwumọtọ kama ị na-achụgharị ndị dịka Sunday Igboho na Nnamdi Kanu bụ ndị na-eti mkpu nnwereonwe.
Nke a na-abịa dịka akụkọ pụtara na Gọọmentị Naijiria ji ndị uweojii mbaụwa bụ 'Interpol' nwuchie onye ndu 'Yoruba Nation' bụ Sunday Igboho, onye ezi aha ya bụ Sunday Adeymo na Bene Rịpọblik n'ụbọchị Monde.
Ozi si n'aka Ọnụ na-ekwuru Ohaneze Ndigbo bụ Alex Ogbonnia sịrị, "Mkpu nnwereonwe dị iche iche a na-eti na Naijiria ọ nọkataghị mewe."
"Ọ bụ mmegbu maka etu ihe si aga na gọọmentị etiti butere ya. Ọ bụghị ha butere onwe ha."
"Ọ ka mma ịchọ ụzọ ileba ihe ndị a anya iji nweta udo na ọganihu.
"N'aka nke ọzọ Nnamdi Kanu na Sunday Igbogho abụrụla ndị e ji eme ọnụ na be ha, nke bụ ọnọdụ mmegbu tụpụtaara ha.
"Ịchụgharị Kanu na Igboho na-elebanyeghị anya na ihe butere mkpu nnwereonwe ga-abụ ịkwọ aka tiere ọkụkọ akị."
"Ndị ọzọ dịka Kanu na Igboho ga-ekuli."
Mkpu nnwereonwe agaghị ebi belụsọ ma gọọmentị e wepụrụ nsogbu nchekwa- Guy Ikokwu

Ebe foto si, Guy Ikokwu
N'aka nke ọzọ, otu okenye Igbo ọnụ na-eru n'okwu bụ Guy Ikokwu kwuru sị "Naanị mgbe gọọmentị mere ihe ha kwesịrị ime n'okwu nsogbu nchekwa site na ịchekwa ndụ na akụnaụba ka nsogbu a ga-ebi."
Ikokwu, onye gwara BBC Igbo n'ọsịsa o nyere n'ekwentị na Sunday Igboho n'agba ọsọ ndụ maka mkpamkpa kpara na mpaghara obodo ya dị n'Ọdịda Anyanwụ, gosiri olileanya na ndị be ha ga-eji ndị ọkaiwu ha gbapụta ya.
Cheta na a nwuchiri Sunday Adeyemo a ma ama dịka Sunday Igboho na nwunye ya n'Ọdọụgbọelu Bene ụbọchị Monde, dịka ọkaiwu ya bụ Yomi Alliyu siri kwuo,
Ihe Ipob kwuru maka nnwụchi Sunday Igboho

Ebe foto si, Getty Images/Sunday Igboho
Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuchitere otu 'Indigenous People of Biafra' ekwuola na ọ bụ nsogbu ka Gọọmenti Naịjirịa na-achọ site n'ịnwụchị Sunday Igboho.
O kwuru na Sunday Igboho na-achọ ọdịmma ndị be ha, o nweghị ihe ọjọọ o mere.
N'ọnụ ya, "onye na-achọ ọdịmma ndị be ya dịka Nnamdi Kanu abụghị ajọ nwa."
"Kedụ maka ndị na-akpa mkpamkpa a kpọrọ 'bandits' na Bekee, e si na nga kpọpụta ma wujuo n'Army?"
"Naịjiria ji aka ha ekote nnukwu nsogbu ga-eri ha n'oge n'eteghị aka."
A nwụchiela Sunday Igboho na Nwunye ya na Benin Republic

Ebe foto si, HTTPS://WWW.INSTAGRAM.COM/SUNDAY_IGBOHO1/
A nwụchiela Sunday Adeyemo bụ onye a ma dịka 'Sunday Igboho bụ onye na-achọ nwereonwe ndị Yoruba site na Naịjirịa na mba Cotonou, Benin Republic.
Ọkaiwu nwa amadị a bụ Yomi Alliyu bụ onye gbara ama n'ozi mgbasaozi o wepụtara ụbọchị Tuzde kwuru na gọọmentị Naijiria ji ndị uweojii Interpol were Adeyemo na nwunye ya bụ Ropo Adeyemo n'ọdọụgbọelu dị n'isi obodo Benin Republic, Cotonou n'abalị ụbọchị Mọnde July 19, 2021.
Ọ sịrị, " Ọ bụ akụkọ gbagwojuru anya na gọọmentị Naijiria ji Interpol were nwuchie Sunday Igboho Ospsa na agbanyeghị na ọ bụ okwu metụtara ndọrọndọọ nke DSS kwuru na ha apụrụ ịnwụchi ya iji gbochie itinye ọgbaghara na ọdịda Anyanwụ Naijiria."
Alliyu gara n'ihu gbaa ama sị na " A nwụchikwara nwunye ya bụ Ropo Adeyemo bụ nwa amala Jamaini ma jụọ sị, "Kedụ ihe o mere butere nke a?" dịka ọ kpọkuru gọọkemnti mba Jamini ka ha tinye aka jụ mbọ gọvernment Naijiria na-agba ịkpụlata nwa amadị ahụ ala Naijiria.
Cheta na nke a na-abịaizụ ụka atọ gachara ngalaba uweojii nzuzo Naijiria bụ Department of State Service(DSS) kwuchara na-aha na-achọ nwụchi Adeyemo maka ebubo na a hụrụ ngwaagha dị iche iche n'ụlọ ya.
Nke a na-eso mwakpo DSS mere be Adeyemo ebe ha gbagburu mmadụ abụọ bụ ndị nnyemaka ya.
Cheta na ndị ọrụ nchekwa nke nzuzo wakporo bee Igboho dị na Soka dị n'Ibadan n'ụbọchị July 1, 2021, nwụchie ndị ọrụ ya iri na abụọ ma gbuo mmadụ abụọ n'ime ha mgbe ha na-akwakọrịta mgbọ.
Gọọmenti etiti gwara ụlọọrụ na-ahụ maka akwụkwọ njem na Naịjirịa ka ha gbado anya hụ na Igboho agbapụghị ọsọ puọ na Naịjiria.
O nwebeghị ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa kwere ekwu ihe ọbụla gbasara nwụchị a.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka akụkọ nnwụchị Sunday Igboho
Omoyele Sowore bụ onye na-ekwu maka ikike diri onye akatọọla etu e si nnwụchị Sunday Igboho na-achọ nwereonwe ndị Yoruba ma na-ekwu na o nweghị ihe dị njọ na mmadị ịchọta nwereonwe.











