Ipob: Uche Mefor o nwere ikikere ịsị ndị Ipob kwụsi ịtụ ụtụisi ha?

Ebe foto si, Uche Okafor-Mefor/FACEBOOK
Onye ọkaiwu nke onyeisi ndị Ipob bụ Nnamdi Kanu na ndị otu Ipob bụ Alloy Ejimakọ ekwuola na ya enweghị ike itinye ọnụ maka akwụkwọ ozi na-efegharị nke a sị na ọ bụ Uche Okafor-Mefor depụtara.
Ejimakor kwuru na e nwere ihe ndị ọzo dịmkpa ọ nwere ịkpa ma sịkwa na Uche Mefor bubu otu n'ime ndị isi nke otu iPOB.
O kwuru sị" Uche Mefor site n'okwu sị ya n'ọnụ, abụghị osote onyeisi otu Ipob nke pụtara na osoghị dịka ndị ọchịchị otu Ipob".
O kwuru na ọbụghị ya bụ onye ọkaiwu Uche Mefor nke mere na ya enweghị ike ikwu ihe ọbụla maka ya.
Gịnị butere okwu a?
E nwere akwụkwọ ozi na-efegharị na ịntaneti nke depụtara iwu nke si ka ndị otu Ipob niile kwụsị ị kwụ ụtụisi ha na-atụ tupu ndị ọchịchị otu ahụ ahazịe ọnọdụ ọchịchị ha maka esemokwu ha na-enwe.
Ya bụ akwụkwọ ozi nke e jiri aha Uche Mefor dee kwuru na ya bụ Mefor ka bụ otu n'ime ndị ọchịchị otu Ipob dịka akwụkwọ ha jiri hiwe ụlọọrụ na mba Briten siri gosi.
O kwuru na ya bụ akwụkwọ gosiri na ọ bụ ya na Nnamdi Kanu bụ ndị ndu otu Ipob.
Akwụkwọ ozi ahụ nke bu akara ụbọchi atọ nke ọnwa Disemba afọ 2020, nyere iwu ka ndị ọrụ na ndị otu Ipob niile mee ihe akwụkwọ ahụ depụtara n'ime abalị abụọ.
Gịnị na-eme n'ime otu Ipob?

Ebe foto si, Facebook/Uche Mefor
Solomon Egbo, ekwuola na Mazi Nnamdi Kanu amaghị maka nchụpụ a chụpụrụ Uche Mefor dịka osote onyeisi otu 'Indigenous People of Biafra' IPOB.
Nke a na-abịa dịka akụkọ ọgbaaghara dapụtara n'ime otu IPOB na-arị elu.
BBC Igbo mere mkparịtaụka iji mata ebe mmiri si baa n'opi ụgbọgụrụ.
Na mkparịtaụka a, anyị kpọrọ Clifford Iroanya onye sobu n'otu Ipob nakwa Solomon Egbo.
Egbo kwuru na ọ bụ ndị nọ na ngalaba DOS nke IPOB wepụtara akwụkwọ na-ekwu na ha achụọla Uche Mefor.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ naanị Nnamdi Kanu nwere ikike ịchụpụ Mefor na Ipob.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Egbo gara n'ihu kwuo na ọtụtụ ndị nọbu n'isi otu Ipob enweghị obi ọcha gbasara ya bụ otu.
O kwuru na ọ bụ ndị ahụ na-awụnye mmiri ọkụ n'okwu dị n'etiti Nnamdi Kanu na Uche Mefor ma na-ebutekwa nkewa n'etiti Ipob.
N'aka nke ya Clifford Iroanya kwuru na otu Ipob dịka ọ dị ugbua enweghị usoro ọbụla doro anya ha nwere iji nweta Biafra.
O kwuru na Ipob bụ otu enweghi isi nke o ji enwe ọdụ n'ihi na ndị ndu ha enweghị ụzọ ha na-agbaso.
Iroanya dụrụ ọdụ ka ndị nọ n'otu Ipob kwụsị ịkparị ndị mmadụ iyi nakwa ịkparị ndị mmadụ ndị ekwenyeghị na ọzịzọ Biafra.
Ọ gara n'ihu kwuo na ọkpụrụkpụ ihe ji ọdịmma Naịjirịa bụ akwụkwọ iwu nke a kpọrọ .Constitution' na Bekee.
"Ọ bụrụ na emegharịghị akwụkwọ iwu a, o nweghị ihe ọbụla ga-enwe isi na Naịjirịa."












