Orji Uzo Kalu: Ihe ọkaiwu Ipob sara ya

Kalu,Ejimako,Kanu

Ebe foto si, Getty Images/Ejimako/Orji Uzo KaluKalu

Alloy Ejimako bụ ọkaiwu indigenous People of Biafra ekwuola na Orji Uzo Kalu ekwesighị ị ga-agwa gọọmenti etiti ka ha nye ya ohere ka ọ kpọlata Nnamdi Kanu.

O kwuru na ọ bụ eziokwu na enweghị iwu megidere ya bụ okwu, mana ihe o kwesiri ime bụ ịgakwuru Nnamdi Kanu rịọ ya ka o nye ya ohere ka ọ gakwuru gọọmenti etiti ka ha abụọ kpaa ihe gbasara Biafra.

Ejimako kwuru na Nnamdi Kanu nwere ndị o dewere n'akụkụ bụ na ọ bụrụ na gọọmenti etiti chọọ ka ya na ha kpaa, ha ga-anọchịte anya ya.

Lee ihe o kwuru n'uju ebe a.

Aha onyonyo, Ipob asaala Orji Uzo Kalu

Ihe Orji Uzo Kalu na-arịọ gọọmenti n'isi Nnamdi Kanu

Aha onyonyo, Ọ bụghị Biafra dị ndị Igbo mkpa ugbua - Ọrji Uzo Kalu

Orji Uzo Kalu, onye ji ọkwa "chief whip" n'ụlọ omeiwu ukwu Naịjirịa, ekwuola na ọ bụrụ na gọọmenti etiti nye ya ohere na ọ ga-eje mba UK kpọlata onye ndu Indigenous People of Biafra bụ Namdi Kanu.

Kalu kwuru na isi sekpụ nti na mkparịtaụka ya na Nnamdi Kanu ga-abụ ka ọ hapụ okwu mwereonwe Biafra ma chọwa otu Naịjirịa.

Onye enyemaka Uzor-Kalu bụ Peter Eze gwara BBC Igbo na Kalu gwara ndị ntaakụkọ 'News Agency of Nigeria' nke a mgbe ha na-agba ya ajụjụ ọnụ.

Orji Uzor Kalu na Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images/Uzo Kalu

Nkọwa foto, Orji Uzor Kalu na Nnamdi Kanu

Eze kwuru na Kalu gwara NAN na o kwenyesiri ike n'otu Naịjirịa.

O kwuru na Orji Uzo Kalu ghọtara etu Naịjirịa dị nakwa etu ndị Igbo si nwee azụmahịa ebe niile nke pụtara na ọbụghị Biafra ka ndị Igbo kwesiri ị na-achọ.

"Ihe ndị Igbo ga-eme ugbua bụ inọdụ dịka agbụrụ ndị ọzọ sị nọrọ na-achọ ihe ndị ọzọ na-achọ."

" Kalu chọrọ ka gọọmenti nye ha ohere ka ya na Nnamdi Kanu kpaa, ọ lọta n'obodo kwụsị ọchịchọ Biafra makana ọ bụ obere obodo agaghị eji tunyere nnukwu Naịjirịa."

"Nke a ga aka bara anyị uru."

Akụkọ ndị ga-amasị gị: