Ugboro ise a wakporo ndị uweojii na mpaghara ọwụwa anyanwụ n'ọdịnso a

Ebe foto si, Getty Images
N'ime izu ụka atọ gara aga, ndị omekome awakpola ndị uweojii na mpaghara ọwụwa anyanwụ ihe ruru ugboro anọ.
Ihe dị otu a emeela n'opekata mpe, steeti atọ na mpaghara ahụ.
Ndị ekperima a na-akụri ụlọọrụ na ụgbọala ndị uweojii ma tinye ha ọkụ.
Lee ebe ya bụ ihe mere:
Egbu - Owere, Imo steeti

Ebe foto si, AFP
Ụfọdụ ndị ekperima wakporo ndị uweojii n'Egbu, dị n'Owere, isi obodo Imo steeti.
Ha ji obejiri mma merụọ otu n'ime ndị uweojii a ahụ ma nara ya egbe ya.
Ndị mmadụ gbatara buru onye uweojii ahụ merụrụ ahụ gaa ụlọọgwụ.
Owere-Nkworji - Nkwere, Imo steeti
N'ụbọchị Mọnde, abalị asaa nke ọnwa Sepụtemba, ndị omekome wakporo ndị uweojii nọ n'Owere-Nkworji nke dị n'okpuru ọchịchị Nkwere, Imo steeti.
Dịka ndị ntaakụkọ Punch si kwuo, ndị ahụ ji mma obejiri gbukasịa otu n'ime ndị uweojii ahụ, nara ya egbe ya, ma mụnye ụgbọala ahụ ọkụ.
E bugara onye uweojii ahụ ụlọọgwụ dị n'Orlu mana o mechara nwụọ n'ụbọchị Tuzde.
Onyeisi ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Isaac Akinmoyede kwuru na mwakpo ndị a mere eme, mana o nweghị onye nwụrụ na ya.
Ohafia - Abia steeti

Ebe foto si, AFP
Ndị ekperima wakpokwara ndị uweojii n'Ohafia, Abia steeti, n'ụbọchị Mọnde, abalị atọ nke ọnwa Sepụtemba.
Kọmishọna mgbasa ozi steeti ahụ bụ John Okiyi-Kalu kwuru na ya bụ ihe mere oge mmiri na-ezo n'ụtụ Mọnde, na mpaghara Okagwe.
N'ime ndị uweojii ise ya bụ ihe metụtara, mmadụ anọ merụrụ ahụ ebe otu onye nwụrụ.
Okiyi-Kalu kwuru na nnyocha amalitela ịmata ndị rụrụ ala ahụ.
Ogui - Enugwu

Ebe foto si, Getty Images
N'abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Ọgọstụ ka ndị ekperima wakporo ụlọọrụ ndị uweojii a kpọrọ 'Unity Police Station'.
Ụlọọrụ a dị n'ụzọ awarawara si Enugwu gawa Opi-Nsukka.
Ya bụ mwakpo mere n'elekere iri nke abalị
Akụkọ kwuru na ndị ekperima ahụ buuru egbe dị n'ụlọọrụ ndị uweojii ahụ laa.
Ụfọdụ kwukwara na ndị uweojii abụọ nwụrụ na mwakpo ahụ.
Abakpa - Enugu
Ndị ekperima wakpokwara ụlọọrụ ndị uweojii dị n'Ogui, Enugwu.
Nke a mere n'abalị iri atọ nke ọnwa Ọgọstụ.
Akụkọ kwukwara na ọtụtụ egbe ndị uweojii ka ndị ekperima ahụ buuru laa.
Gọọmentị Enugwu kwuru na mwakpo ahụ mere n'eziokwu mana ha ekwughị ma o nwere onye nwụrụ.
Gịnị kpatara nke a?

Ebe foto si, Louis Amoke
Izuụka atọ gara aga ka ndị ọrụ nchekwa nzuzo bụ 'Department for State Services' wakporo ndị otu 'Indigenous People of Biafra' ebe ha na-eme nzukọ.
Ndị DSS kwuru na ndị otu ha abụọ nwụrụ na ya bụ mwakpo, ebe ndị Ipob kwuru na ndị nke ha mmadụ iri abụọ na otu nwụrụ.
Ka ya bụ ihe mechara, onyeisi ndị Ipob bụ Nnamdi Kanu kwuru na ha ga-abọ ọbọ ndị nke ha e gburu.
Mana onweghị ihe ọbụla gosiri na ọ bụ ndị Ipob na-awakpo ndị uweojii
Chetakwa na ndị ohi na ndị ntọ na-enyebu nsogbu na mpaghara ọwụwa anyanwụ tupu oge a.
BBC Igbo na-agba mbọ inweta ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Frank Mba ka o tinye ọnụ n'okwu a.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:









