Fada Mbaka ekwuola ihe asaa ọ chọrọ ka e mee gbasara nwụchịgharị Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images
Onye ndu Adoration Ministries dị n'Enugu bụ Father Ejike Mbaka ekwuola na ọ chọrọ ka atọghapụ onye ndu indigenous People of Biafra bụ Nnamdi Kanu.
Mbaka kwuru na kamgbe gọọmenti Naịjirịa nwụchichara, "ọtụtụ mmadụ ka na-anwụ."
O kwuputere ihe ndị a mgbe ọ ka ụka n'Adoration Ministries ụbọchị ụka gara aga bụ Jụlaị 11, 2021.
O kwuru na ndị ọrụ gọọmenti abụọ biara n'ụlọọrụ ya ma kwuo na ha nwere ohere ha ga-enye ya.
Mbaka kwuru na ọ gwara ndị ahụ na ohere mbụ ọ chọrọ bụ ka atọghapụ Nnamdi Kanu.

Ebe foto si, Fada Mbaka Facebook Page/Naíjiria góómenti
Mbaka kwuru sị "kedụ uru na-anwụchịrị ya ebe ọ bụ na ndị ntọrị ka na-atọrị ndị mmadụ?"
"Ndị ọrụ nchekwa Naịjiria kwesiri iji otu aka ike ha ji nwụchị Nnamdi Kanu gaa nwụchie ndị 'bandits' na-akpa mkpamkpa ugbua."
"Ọ bụru na nnwụchị Nnamdi Kanu ga-eme ka Naịjirịa gaa n'ihu , ha jidesie ya ike mana anyị ahụla na kamgbe anwụchiri ya ihe akawanyela njọ."
Mbaka gara n'ihu kwuo na "ọ bụrụ na ndị ọrụ nchekwa nwụchirị mmadụ maka ihe o kwuru, ha ahụrụ ya ebe o gburu mmadụ?"
"Werenụ otu aka unu ji nwụchie Nnamdi Kanu, nwụchie ndị na-eyi egwu, enweghị ọrụ, ndị ọchị ehi na-emebi ihe, ikpa oke agburu nakwa ihe ọjọọ ndị ọzọ."
"Ihe na-eme n'obodo na-eme ka onye amụma na-ebu amụma makana m ga ha nọkata kwuwe ihe chukwu si m ekwula."
"Dịka onye amụma Amos na baibl, a kpọrọ m maka ọrụ a mgbe m na tee nkwụ n'obodo m."
"Ụnụ anwụchịla ndị na-achọ ka egbo mkpa ha, kama lebaa anya n'ihe mere ha ji achọ nwereonwe." bụ ihe Fada Mbaka kwuru.
Mgbe BBC Igbo kpọrọ odee akwụkwọ Enugu diocese nke ụka Katọlịk bụ Benjamin Achi ịnụta n'ọnụ gbasara okwu ndị a Mbaka kwuru, o kwuru na diocese anaghị etinye ọnụ n'ihe ọbụla ndị ụkọchukwu na-ekwu ma ha na-ezi oziọma n'ụlọụka ha.










