Nnamdi Kanu: Ihe isii Ohaneze ndị Igbo kpebiri maka nwụchị onye ndu Ipob

Ndị eze Igbo nakwa Nnamdi Kanu

Ebe foto si, BBC/Nigerian Government

Ohaneze ndị Igbo ekwuola na ha chọrọ ka ekpe Nnamdi Kanu bụ onyendu Indigenous People of Biafra ikpe n'ụzọ iwu Naịjirịa kwadoro nakwa jiri atụmaatụ di mma e si ekpe ikpe na mbaụwa niile.

Ohaneze ndị Igbo gbakọrọ n'ụbọchị Julaị 10, 2021 n'Enugu ma wepụta akwụkwọ ozi ebe ha kwuru nke a.

N'akwụkwọ ozi ahụ, ha kwuru na ha na-enyocha nwụchịgharị na mkpọpụ Nnamdi Kanu n'ụlọikpe na nso nso a.

Ihe ndị ọzọ ha kpebiri gụnyere:

  • Ha hibere ọgbakọ ndị ọkaiwu nke onye ndụọmọdụ iwu Oheneze ndị Igbo nọ n'isi ya nakwa ndị ọchịchị Igbo ama ama ka nyocha usoro na etu e si ekpe Nnamdi Kanu ikpe.
  • Ha ga-akwado mkpebi ndị gọvanọ ndida kpebiri gbasara ngagharị ehi, nhazịgharị Naịjirịa, inye mpaghara ndida Naịjiria iwepụte onyeisiala Naịjirịa na ntụlaiaka 2023 nakwa nkenye 5 pasenti si na Petroleum Industries Bill (PIB) nye obodo ebe ndị a gwụpụte mmanụ.
  • Ha ga-ege ihe bụ iwe ndị ntoroọbịa Igbo tụmadụ mmegbu ndị Igbo, mkpa mkpa ndị Fulani na-akpa dgz. "mana anyị anaghị akwado iji mmebisi ihe chụ ihe ndị a ya mere anyị ji arịọ ndị ntoroọbịa ka ha jiri nwayo dịka ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo ga-eji mkparịtaụka wee gboo mkpa ndị a."
  • Ha kwuru ka ndị ntoroọbịa Igbo ga debanye aha n'akwụkwọ ntụlịaka makana ọ bụ ya bụ uzọ ha ga-eji sonye na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa nakwa nweta ihe ndị Igbo na-achọ

 Chiedozie Alex Ogbonnia bụ odee akwụkwọ Ohaneze ndị Igbo binyere aka n'akwukwọ ozi ahụ.