Nnamdi Kanu's Re-Arrest: Gọọmentị Naijiria tọrọ Nnamdi Kanu na Kenya - Kingsley Kanu

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, AFP

Ezinaụlọ Nnamdi Kanu ekwuola na ọ bụ na mba Kenya ka Gọọmentị Naijiria tọrọ nwa amadi ahụ bụ onye ndu otu nwereonwe Biafra a kpọrọ Ipob n'ịchafụ.

Ha na na-ebo ebubo na ọ bụ ntọrọ ka gọọmentị tọrọ ya site na enyemaka mba Kenya nke ha kwuru megidere iwu mbaụwa.

N'ozi mgbasaozi ha wepụtara nke rutere BBC Igbo aka ụbọchị Wenezde, nwanne ya nwoke bụ Kingsley Kanu kwuru na " Ọ bụ oge Nnamdi Kanu gara njem na Kenya ka ha nwuchiri ya ma nyefe ya n'aka gọọmentị Naijiria."

" Mba Kenya na Naijiria kpara nkata si ụzọ azụụlọ kpụrụ nwanne m nwoke."

Ha megidere iwu mbaụwa metụtara ịkpụrụ mmadụ n'ụzọ azụụlọ si mba fee mba bụ mpụ karịrị ibe ya. Naijiria na Kenya kwesiri ịzara ọnụ ha . Achọrọ m ka enye nwanne m ikpe nkwụmọtọ."

O bekuru Gọọmentị Briten ka ha gba mbọ hụ na-akpọghachiri Kanu mba Briten.

Cheta na Gọọmentị Naijiria nwuchiri Kanu ụbọchị ụka ma kpụpụ ya ụlọikpe ụbọchị Monde ebe ọkaikpe nyere iwu ka e jichie ya na mkpọrọ DSS rue abalị 26 nke ọnwa Julaị bụ mgbe a ga-ebulite ikpe ya ọzọ.

Ntọrọ ka a tọrọ onyeisi Ipob - Emma Powerful

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Otu Indigenous People of Biafra(Ipob) ekwuola na ọ bụ ntọrọ ka atọrọ onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu site na mba ofesi ma kpọghachite ya na Naịjirịa.

Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru Ipob kwuru na ya ka ga-agwa ụwa ka ya bụ ntọrọ o boro gọọmenti etiti si gaa.

O kwuru na ọ bụ gọọmenti Naịjiria nakwa ndị na-ebuso etu Ipob si achọ nwereonwe Biafra jịkọtara aka tọrọ Kanu.

N'ọnụ ya, "anyị na-arịọ ka ndị otu anyị nọrọ jụụ ma gbaa mbọ hụ na ha biara n'igwe n'ụlọịkpe n'ụbọchị Julai 26, 2021 mgbe Kanu ga-azara ọnụ ha."

Aha onyonyo, Onions traders: 'Anyị ahụbeghị ego Nnamdi Kanu kwuru ọ ga-akwụ anyị maka ịyabasi ha n'Imo'

"Ike agaghị agwụ Ipob na Biafra ha na-achọ, makana onweghị ihe ndị na-eyi anyị egwu ga-emeli anyị."

"Anyị na-echetere gọọmenti Naịjirịa nakwa ndị ọrụ nchekwa na onyeisi anyị kwesiri inye ikpe nkwụmọtọ nakwa ige ya ntị mara nke na-akpa ya."

"Ipob na-ekwusi ike na ihe emekwala onyeisi anyị makana o nwee ihe mere ya, ọ bụ gọọmenti Naịjirịa ka anyị ga-ebo ya."

Powerful kwuru na onweghị ihe ga-eme ka onyeisi ha bụ Nnamdi Kanu gbaghapụ ọchịchọ Biafra.

"Anyị na-ekiri etu okwu a si aga ma na-arịọ ọchịchị mba ụwa ka ha ghara ịgbachị nkịtị na mpụ gọọmenti Naịjirịa na-ebuso ụmụ Biafra."

Anyị ka na-agba mbọ ka anyị nụta n'ọnụ onye na-ekwuchitere gọọmenti etiti gbasara ebubo a Emma Powerful boro ha. Ekwenti Garba Shehu agaghị nke Femi Adesina ji aga.

Aha onyonyo, Anyị chọrọ ntuliaka 'referendum' ọ bụghị ọgụ.

Gọọmentị Etiti nwụchiri Nnamdi Kanu ụbọchị ụka(June 27, 2021) maka ebubo ịkpa nkata ikewapụ Biafra na Naijiria nakwa ibute ogbugbu ndị mmadụ n'Ọwụwa Anyanwụ.

Ọkaiwu nọchitere Gọọmentị etiti bụ Shuaibu Labaran gbara akwụkwọ n'ụlọikpe ma rịọ ka e jichie Kanu.

Labaran kwuru na ọ dịghị mma ka a hapụ Kanu ka o si n'ụlọ na-abịa n'ihi na mbụ a hapụrụ ya n'afọ 2017 mana ọ gbara ọsọ.

Cheta na Kanu gbapụrụ ọsọ na Naijiria n'ọnwa Septemba afọ 2017 dịka ndị agha Naijiria wakpochara be nna ya n'Afaraukwu dị n'Abia steeti.

A kpụpụburu Kanu ụlọikpe ukwu etiti dị n'Abuja maka ịzara ọnụ ya n'ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị Naijiria site ikpọ oku ka e kepụta Biafra na Naijria.

Mana n'ọnwa Eprelu afọ 2017, a tọhapụrụ ya nwa oge maka ọnọdụ ahụike.

Aha onyonyo, Okwu Emma Powerful