Sefer Torah a e kwuru na Nnamdi Kanu kwuru maka ya ọ pụtara gịnị?

Rudy Rochman Facebook Page

Ebe foto si, Rudy Rochman Facebook Page

Sefer Torah na-ewu na soshal midia ugbua maka etu otu onye mba Israel na-ahụ maka ikike diri onye si depụta n'akara Facebook ya etu ya bụ akwukwọ ozi ndị Jew awụchiela n'ala Igbo

Onye otu Ipob na-achọghị ka akpọpụta aha ya kwuru na onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu kwuru na "mgbe ọbụla ahụrụ Sefer Torah wuchiri ala Biafra, si mara na Biafra abiala."

Rudy Rochman depụtara n'akara Facebook ya "Sefer Torah awụchiela n'ala Igbo site na Jerusalem."

"A nabatara anyị n'obodo dị na Legọs nakwa Ogidi." " Njem na anyị efughị efu amalitela."

Gịnị bụdị Sefer Torah?

Sefer Torah dịka onye ndu ndị ụka Jew nọ n'Abuja bụ Shlomo Yaakov Maduakor si kọwaa bụ akwụkwọ kacha dị nsọ n'okpukperechi Judaism. O kwukwara na:

  • E ji asụsụ ndị Hebrew were dee Sefer Torah
  • Ọ bụ akwụkwọ Jew kacha dị nsọ
  • A na-akwanyere ya bụ akwụkwo nnukwu ugwu.
  • Ọ bụ ihe dị nsọ ndị nna nna anyị hapụrụ anyị bụ ndị ntoroọbịa Jew
  • Akwụkwọ ise Torah gụnyere Genesis, Exodus, Leviticus, Numbers and Deutronomy
  • A na-akpọkwa ya akwụkwọ ise nke Moses

Ihe Rudy Rochman wetere Sefer Torah n'ala Igbo biara ime

Rudy Rochman Facebook Page

Ebe foto si, Rudy Rochman Facebook Page

Nkọwa foto, Rochman depụtara n'akara Facebook ya na Torah a ya na ndị otu ya bu ebe a dị afọ 200 mabụrụkwa nke a ga-ebuga ala Igbo

Maduakor kwuru na Sefer Torah nke Rudy Rochman depụtara na o webatara n'ala Igbo taa bụ eziokwu.

O kwuru na Rochbach wetere Sefer Torah nke a o ji bia dịka ihe onyinye nye ndị ntorobia okpukperechi Judaism nọ na Naịjirịa ka o wee nyere ha aka n'ịka ụka nakwa ime ekpere.

O kwuru na Rochman bụ onye na-eme nyocha ama ama biara imata omenaala ndị Igbo nakwa ihe jikọtara ndị Igbo na mba Israel.

'O nweghị ihe jịkọrọ ọbịbia Sefer Torah na ọchịchọ nwereonwe'- Onye ndu ndị Jew (Yaakov Maduakor)

Maduakor kwuru na ọ na-agba ya gharị etu ndị mmadụ si etikọ ihe gbasara okpukpurechi Judaism na ọchịchọ nwereonwe .

N'ọnụ ya, 'ha abụọ dị iche.' "Onweghị ihe jikọrọ ọbịbia Sefer Torah Rochman wetere ndị ntorobịa okpukperechi Judaism nọ na Naịjirịa na ọchịchọ Biafra."

N'okwu Maduakor, "Judaism adịla tupu ekwuwe maka nchọta Biafra."

"Anyị ga-eme emume nnabata Sefer Torah a n'ụbọchị Satọde na-bianụ, emume a ga-achịkọta ọtụtụ ndị ntoroọbịa na-ekpe okpukperechi Judaism na Naịjirịa."

"A ga-eme emume nnabata Sefer Torah a n'Ogidi dị n'Anambra steeti."

Ọnụ na-ekwuchitere ndị otu Ipob bụ Emma Powerful azabeghi mkpọtụrụ BBC Igbo gbasara akụkọ a dịka anyị kpọtụrụ ma zigara ozi ya n'akara whatsap ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: