Ifeanyi Okeke Auto Ease: Nwunye Ifeanyi Okeke agbagburu n'Enugwu ekwuola na o werela uwa ka osiri hụ ya.

Oby Okeke gwara BBC na agbanyeghị na ndị oji egbe gbagburu di ya Ifeanyi okeke na ụbọchị ụka bụ Julai 4, 2021 na ya ekpebiela iga n'ihu na-elekọta ụlọọrụ azumahia ha anya.Ọ sara ajụjụ si na o wutere ya mana ya ewerela uwa ka o si hụ ya site na ị malite ọrụ na eleghi anya na di ya nwụrụ naani mkpụrụ ụbọchị abụọ gara aga.
Ogbugbu ndị oji egbe aga gburu mazi Ifeanyi Okeke n'Enugwu bụ ụbọchị abụọ gara aga ka na-agba ndị mmadụ anya mmiri.
Nwoke ahụ nwụrụ anwụ bụ onye nwe ụlọ ọrụ AUTOEASE ebe a na arụzị ụgbọala.
Mgbe BBC rutere n'isi ụlọ ọrụ AUTOEASE na Zik Avenue Enugwu, nwunye ya bụ Oby Okeke nọ n'ụlọ ọrụ na-arụ ọrụ.

Dika ozi ndị uweojii wepụtara n'Enugwu si kwuo, ya bụ odachi mere oge Mazi Ifeanyi na nwa ya nwoke gara ikpu isi n'abali Sọnde.
Ndị oji egbe ahụ wakporo ha n'ụzọ were gbagbuo ya.
Ndị uweojii ekwuola na ha ga-achọpụtariri ndị kpara mkpa mkpa ahụ n'oge na-adịghi anya.
Etu ndị omekome si gbu Ifeanyi Okeke onye nwe ụlọọrụ Auto Ease n'Enugu

Ndị uweojii nọ n'Enugu steeti kwuru na ọ bụ ndị omekome gbagburu Ifeanyi Okeke n'Enugu n'ụbọchị Julai 4, 2021.
Daniel Ndukwe kwuru na ụlọọrụ ya nwetere ozi n'elekere asatọ nke mgbede na ndị omekome na-akpa mkpa mkpa Bricks Estate, Independence Layout, Enugu n'ụbọchị ahụ.
Nke a mere ka ndị uweojii nọ ọrụ n'ụlọ uweojii Layout's Police Division gbaga ebe ihe ahụ na-eme.
Ndukwe depụtara na mgbe ndị omekome ahụ hụchatara na ndị uweojii awụchiela ebe ahụ, ha gbalagara.
E mechara chọpụta na onye gbara egbe ugboro ugboro bụ Ifeanyi Okeke.
E bugara Okeke n'ụlọọgwụ ebe dọkịta nọ ọrụ kwuru na ọnwụọlarịị.
Ndukwe kwuru na kọmịshọna ndị uweojii n'Enugu steeti bụ Mohammed Ndatsu Aliyu ekwuola ka ndị uweojii nọ n'Enugu malite nyocha ịmata ihe merenụ ma chọpụta ndị kpara mkpa mkpa a.
Ọ na-arịọ ka ndị mmadụ nye ndị uweojii ozi ọbụla dị mkpa ga-enye aka n'ịnwụchị ndị omekome ahụ.









