Ebe ndị Ugwu na-akwado Pantami, Gumi na Miyetti Allah, ana m akwado Nnamdi Kanu - Bishop Onuagha, Methodist Church, Onitsha Diocese

Ebe foto si, Livinus Onuagha
Bishọp ụka Methodist na Naijirịa nke mpaghara Ọnịcha Dayọsis bụ Biereonwu Livinus Onuagha ekwuola na Nnamdi Kanu onyeisi otu Ipob Gọọmentị Etiti anwụchịri na-anọchite anya ihe karịrị ndị Igbo pasenti iri itoolu na itoolu (99%) ya.
Onuagha kwuru na ọtụtụ ndị Igbo kwenyere na okwu Biafra Nnamdi Kanu na-ekwu na-agbanyeghị agwa dịwara aghaa ọ na-akpa dịka onye ntoroọbịa.
N'akwụkwọ ozi Onuagha binyere aka ma depụta n'ụbọchị Tuzde n'Ọnịcha , Anambara steeti, o kwuru na ndị Igbo na-akatọ Nnamdi Kanu kemgbe a nwụchuru ya anụjughị ara nne ha afọ, nke ha na-aghọta oge a nọ na ya.
N'ihi na dịka o siri kwu, " ịga dị n'aka Nnamdi Kanu dị n'aka onye Igbo ọbụla."
Onuagha o nye sitere n' Abuoma 137:1-4) were nye ntuziaka sịrị, " Onye ọbụla na-akatọ Nnamdi Kanu ugbua anwụchịrị ya bụ efulefu na onye na-amaghị ihe."
"Ekwuola m ihe m kwuru ma enweghị onye m ga-arịọ mgbahara maka ihe a m kwuru".
Onuagha kwuru sị," Naijirịa bụ mba agbụrụ na okpukperechi juputara, ọnye ọbụla gbahapụrụ onye nke ya, amaghị ihe ọ na-eme."
O kwuru na ya ga-akwụsị Nnamdi Kanu n'azụ ike , ebe ọ bụ na ndị Ugwu kwụ Sheik Gumi, Patami na ndị Myiyetti n'azụ ike.
"Ebe ọ bụ na ndị Ugwu ka kwadoro Pantami, Gumi, Miyetti Allah,dgz agaghị m agbahapụ Nnamdi Kanu."

Ebe foto si, Bishop Onuagha JP/facebook
Bishop Onuagha kwụrụ na " N'ezie Kanu nwere ebe o si eri mperi, mana e wezụga ndajọ ndị ahụ, ọ bụ ihe ọma nyere ọ bụghị naanị Ndigbo, Ndị Ndịda Anyanwụ Naijiria."
"Obi ọ kara bụ ihe mere ka bido kwanyerewere ya ugwu."
O kwuru na ajụjụ onye ọbụla kwesịrị ị na-ajụ bụ "na mmegbu na mkpagbu Kanu na-ebu agha ya ọ bụ eziokwu na a ọ bụghị."
"Ị gaghị ama uru onye ara nọ n'ezinaụlọ gị baaraa gị rue oge igwe ndị ara wakporo be nna gị."
O kwuru na "Naijiria anaghị aga n'ihu, ọ gaghị agakwanụ n'ihu ma ọ bụụ na emeghị ihe e kwesịrị ime maka ọnọdụ emeghị onye ka emere ibe ya."
"Ihe na-eme na Naijiria bụ oke mmegbu, ịchakpo mmadụ anya,ịkpụchapụ n'akụkụ na ime ụfọdụ ndị ohu."
"Ndị na-erite uru na ọnọdụ mkpagbu ndị a agaghị achọ ka edoziegharịa etu ihe si aga."















