Kidnapping in Nigeria: Ihe m gabigara n'aka ndị ọchiehi tọọrọ m abalị ise - Sunny Omekedo

Aha onyonyo, Sunny Omekedo

Sunny Omekedo, bụ onye ọkaiwu na-arụ ọrụ n'Abuja.

Ọ dabara n'aka ndị ntọrị n'okporoụzọ si Kogi gawa Abuja.

Omekedo bụ onye kwuru na ndị ntọọ ahụ na-asụ Awụsa, Fulfude nakwa French sịrị na ọ nọrọ abalị ise n'aka ndị ekperima a.

O kwukwara na ndị omekeome ahụ dịnara ụmụnwaanyị ha na ha so eme njem ahụ ugboro ugboro.

Ahụhụ ọ tara n'ime abalị ise a abụghị ihe e ji ọnụ akọ.

Omekedo mechara nwere onwe ya oge ezinụlọ ya kwụrụ ndị ekperima ahụ nnukwu ụgwọ.

Gere akụkọ ya n'uju.

Ndị mere akụkọ a bụ Uche Akolisa na Nnamdi Agbanelo.