Katsina Catholic Priest: Ndị ntọ atọhapụla ụkọchụkwụ Katọlik a tọọrọ na Katsina Steeti

Fr Joe Keke

Ebe foto si, Sokoto Catholic Diocese

Ndị ntọ atọhapụla ụkọchụkwụ ụka Katọlik na Dayọsịs Katsina bụ Fada Fr Joe Keke.

A tọrọ Fr Keke dị afọ 75 n'abalị Tọzde abali 20 nke ọnwa Mee(20/5/2021) dịka ndị ntọ wakporo ụlọụka St. Vincent Catholic Church na Katsina steeti mana e gburu ogbo ya bụ Alphonsus Bello dị afọ 33.

Rev Fr Joe Keke na ndí ózó na-enwe

Ebe foto si, Sokoto Diocese

Nkọwa foto, Nị mmadụ na-anwụrị na atọhapụla Fada Joe Keke

Ọnụ na-ekwuru ụka Katọlik na Dayosis Sokoto bụ Christopher Omotosho, onye gbaara BBC Igbo ama a n'ụbọchị Tọzde n'ozi o zitere, kwuru na Fada Keke na-anata nleta n'ụlọọgwụ ugbua.

"Anyị anabatala Fada Joe Keke n'aka ndị ndị tọọrọ ya. Ugbua ọ na-anata nleta n'ụlọọgwụ."

Fada Omotosho kelere Chineke ma kelekwa ọha ndị mmadụ kpere ekpere mgbe aka ji Fada Keke.

Katsina Catholic Priest: Etu ndị ekperima si wakpo ụlọụka Katọlik na Katsina Steeti, gbuo otu ụkọchukwu

Fr Joe Keke

Ebe foto si, Sokoto Diocese

Nkọwa foto, Fr Joe Keke dị afọ 75 atọọrọ n'abalị Tọzde mana enwebeghị onye hụrụ ya ruo ugbua

Ndị ekperima wakporo ụlọụka St. Vincent Catholic Church na Katsina steeti n'isi ụtụtụ Fraịde, gbuo otu ụkọchukwu, ma tọrọ ụkọchukwu ọzọ.

Ọnụ na-ekwuru ụka Katọlik na dayosis Sokoto bụ Christopher Omotosho kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o zipụrụ na Fraịde.

Ndị ụkọchukwu Katọlik

Ebe foto si, Catholic Diocese of Sokoto/Facebook

Omotosho kwuru na ndị ekperima ahụ kpụụrụ ndị ụkọchukwu abụọ oge ha wakporo ya bụ ụlọụka, mana e mechara hụ ozu otu n'ime ndị ụkọchukwu ahụ.

Anya ahụbeghi ụkọchukwu nke ọzọ ruo ugbua, dịka Omotosho si kwuo.

Aha ụkọchukwu abụọ a bụ: Joe Keke, onye gbara afọ iri asaa na ise; na Alphonsus Bello, dị afọ iri atọ na atọ.

Fr. Alphonsos Bello

Ebe foto si, Sokoto Diocese

Nkọwa foto, Ndị ekperima wakporo ụlọụka St Vincent Catholic Church na Katsina steeti n'isi ụtụtụ Fraịde, gbuo Fr. Alphonsos Bello dị afọ 33

Ọ bụ Alphonsus Bello ka a hụrụ ozu ya, ebe Joe Keke bụ onye a kpụụrụ pụọ.

"Anyị amaghị ebe a kpụ ya gawa, ndị ekperima ahụ akpọbeghị anyị n'ekwentị," Omotosho kwuru.