Kidnapping in Enugu: Sunday Udeh Okoye nke PDP enwerela onwe ya n'aka ndị ntọ

Sunday Udeh Okoye

Ebe foto si, Facebook/Sunday Udeh Okoye

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Sunday Udeh Okoye bụ onye ndị ntọ tọrọla n'Enugwu steeti ụbọchị abụọ nke ọnwa Septemba 2019, enwerela onwe ya.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Ebere Amarizu, gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na Okoye bụ onyeisi ndị ntorobịa nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP).

Amarizu kwuru na ndị ntọrị ahụ ji ụjọ hapụ ya n'ime ọhịa ebe ha kpọsaburu ya, dịka ndị uweojii ji ọkụ ọkụ na-achụ ha n'azụ.

O kwuru na Okoye esonyela ezinaụlọ ya, mana ha bụ ndị uweojii na-ama imi n'ala ịhụ na ha chọtara ma nwụchie ndị omekome ahụ.

Ka a jụrụ ya ma a kwụrụ ụgwọ iji tọghapụ Okoye, Amarizu kwuru sị "Ndị uweojii anaghị akwụ ụgwọ, onye kwụrụ ụgwọ ga-ekwu ihe ọ kwụrụ".

Cheta na ndị ntọrị gbara egbe iji chụsaa ndị mmadụ mgbe ha nwụrụla Okoye ka o si n'ugbo ya dị n'Ohumagu, Agbogugu, na-alọta.

Ọkụ agbagbuola mmadụ 25 n'ụgbọmmiri

Úgbómmiri

Ebe foto si, EPA

A chọtala ozu mmadụ iri abụọ na ise bụ ndị nwụrụ ka ọkụ gbara otu ụgbọmmiri n'obodo Kalifonịa dị na mba Amerịka.

Ndị ụlọọrụ na-elekọta osimiri na mba Amerịka kwuru na a ka na-achọ mmadụ itoolu, ebe mmadụ ise n'ime mmadụ iri atọ na itoolu nọ n'ụgbọmmiri ahụ zọtara ndụ ha tupu ụgbọmmiri ahụ enwuru ọkụ.

Ụgbọmmiri

Ebe foto si, VENTURA COUNTY FIRE DEPARTMENT

Nkọwa foto, Foto na-egosi ụgbọmmiri ahụ ka ọ gbachara ọkụ

Buhari ezipula onye ozi

Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ezigala onye nnọchiteanya pụrụiche na Saụt Afrịka, iji gwa onyeisiala mba ahụ bụ Cyril Ramaphosa, na obi adịghị ya mma maka mwakpo ndị Naịjirịa na mba Saụt Afrịka.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Mara na mwakpo 'xenophobia' ataala isi ihe ruru mmadụ narị isii na mba ahụ kemgbe afọ 2006.

Mberede okporoụzọ egbuola ndị mmadụ n'Anambara

Ụgbọala kpọkasịrị

Ebe foto si, Odinaka/Anambra

Mmadụ isii nwụrụ ebe mmadụ ise merụrụ ahụ n'ihe mberede okporoụzọ n'Agụlụ, Anambara steeti dịka otu gwongworo suru ụgbọala anọ.

Ka ọ dị ugbua, gọvanọ Willie Obiano bụ aka na-achị steeti ahụ, agaala ebe ihe mere ma kwuo na ọ ga-eji aka ya akwụ ụgwọ ụlọọgwụ ndị merụrụ ahụ.

'Arsenal daalụ' - Nwakali

Nwakali

Ebe foto si, Getty Images

Kelechi Nwakali ekeleela ndị Arsenal n'agbanyeghị na ụkwụ ya emetụghị bọọlụ n'ime afọ atọ ọ nọ ebe ahụ.

Ka ọ dị ugbua, Nwakali dị afọ iri abụọ ahapụla Arsenal gafee SD Huesca, ebe ọ ga-anọ afọ atọ ọzọ.

Anambra ga-azụ mmadụ narị n'ọrụ ịkwọ ụgbọelu

Ọkwọ ụgbọelu

Ebe foto si, @Flyairpeace/Twitter

Gọọmentị Anambra steeti ekwuola na ha na ụlọọrụ enyemaka ụmụnwaanyị a kpọrọ 'Girls Can Fly' ekpebiela ịzụ mmadụ ruru otu narị n'ọrụ ịkwọ ụgbọelu.

Ha kwuru na a ga-azụ ndị a n'ụlọakwụkwọ Civil Aviation Technology nke dị na Zaria, Kaduna steeti.

Kọmịshona Mgbasaozi bụ Don Adinuba kọwaara BBC n'ekwentị na atụmatụ a bụ iji mee ka a ghara ịchọ Anambra Steeti ebe ibe ha nọ.

"Ụmụnwaanyị Anambra na-akwọ ụgbọelu agafebeghi mmadụ atọ maọbụ anọ, ọ dị obere" dịka o kwuru.

Maka etu e si ahọpụta ndị ga-esonye, Maazị Adinuba kọwara na okpuru ọchịchị niile ga-ewepụta mmadụ abụo ga-esonye na ya bụ ihe.

BBC Igbo jụkwara Maazi Adinuba gbasara ọnọdụ ọdọụgbọelu Anambra steeti, ọ zaa ajụjụ maka ya.

Ọ sị "anyị ga-amalite ọrụ ọzọ n'oge adịghị anya, anyị kwụsịrị mbụ maka ọgbatuhie anyị atụghị anya mere ebe ahụ."

Mwakpo na-eme na Saụt Afrịka

Ụmụafọ Naịjirịa 116 anwụọla n'ihe banyere Xenophobia na Saụt Afịrịka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụafọ Naịjirịa 116 anwụọla n'ihe banyere Xenophobia na Saụt Afịrịka

Nkatọ na-arị ibe ya elu ugbua gbasara oke mwakpo na-eme na mba Saut Afrịka nke metụtara ụmụ Naịjirịa.

Onyeisioche ụlọọrụ na-ahụ maka ndị Naịjirịa bi na mba ọzọ bụ Abike Dabiri kwuru na gọọmentị ga-agba mbọ mee mkpesa n'ụlọikpe na-ahụ maka ikike ruru onye na mba Afrịka niile.

Bashir Ahmad na-ekwu kwa na ozuola bu na ozuola na mwakpo ahụ.

Na akụkọ ofesi,

Agnes Callamar

Ebe foto si, AFP

Onye ọrụ pụrụiche nke otu UN bụ Agnes Callamar akatọọla aka ike gọọmentị Naịjirịa jiri soo ndị otu Shiites kemgbe afọ a.

Callamar kwuru na gụnyere ụbịam na oke ọnụọgụgụ Naịjirịa, na okwu a bụ ihe nwereike ịbute ọgbaghara n'ọdịnịhu.

N'egwuregwu,

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Naomi Osaka bụ onye meriburu asọmpị US Open apụọla na ya bụ asọmpị ugbua.

Ọpụpụ Osaka bịara dịka Belinda Bencic meriri ya mgbe ha zụtere onwe ha.

Gee Nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile