Kenneth Udeze: Ndi uweojii akpọbeghi okwu aha maka ntọrị asị na a tọrọ nwaamadị a

Ebe foto si, Kenneth Udeze/Facebook
Ndị uweojii ekwuola na ha na-achọ ndị tọrọ onyeisi otu AA bụ Kenneth Udeze n'Abuja n'ụtụtụ Fraide.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abuja bụ Frank Mba ekweghị ekwu ma ya bụ akụkọ ọ bụ eziokwu.
Mana oge BBC Igbo kpọghachiri ya, o kwuru na ọ bụghị ya ka ọ dịrị ikwu maka ya bụ ihe.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abuja bụ DSP Anjugurijesse Manzah gwara BBC Igbo na ha nụrụ ya bụ akụkọ dịka anyị siri nụ ya na o nwebeghị ndị wetara ha mkpesa.
"Mana anyị ezigaala ndị ọrụ anyị ebe ihe ahụ mere."
Ndị amaghị ndị ha bụ tọrọ Udeze n'ihu ụlọ anyị achọghị ikpọ aha ya n'Dutse dị n'Abuja.
Oge BBC Igbo kpọrọ ekwenti Udeze, ọ kụrụ mana a gbanyụrụ ya nkwa nkwa ọ kụrụ.
Maazi Udese bụ onye onyeisi pati Action Alliance nke Uche Nwosu nọ n'okpuru ha zọọ oche gọvanọ steeti Imo.
Lee ihe okwuru maka ọnọdụ ndị Igbo mgbe ya na BBC Igbo nwere mkaprịta ụka.
N'Afrịka

Ebe foto si, Ghana Police Service
Ghana enyela ndị uweojii na-ahịkọa okporoụzọ ha ikike ibu egbe dịka egburula ndị uweojii okporoụzọ ise n'otu ọnwa na mba ahụ.
Otu nwantakịrị nwaanyị bụ onye Congo DR dị afọ itolu anwuola n'aka oria Ebola na mba Uganda dịka mmadụ ole nwụrụ la n'ọ®ịa ahụ na na mba kụ®ụ puku abụọ.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụ ụwa ọkachasị otu nwere ihe jịkọrọ ha na egwu bọọlụ UEfa, Manchester United etiela onye bụbu onye nchịtọka otu egwu bọọlụ mba Spen bụ Luis Enrique aka n'obi maka ọnwụ nwa nwaanyị
Xana, ada Luis Enrique onye nwụrụ site ọrịa kansa dị afọ itoolu.











