E chiela nwaanyị ụkọchukwu na Naijirịa mbụ kama ọdabachaghị - Ụkọchukwu Anglịkan, Okey Ifionu

Ebe foto si, Anglican Diocese Of Cape Coast - ADCC/ Facebook
Dịka ụka Angican mba Gana enwetela Regina Baadu dịka nwaanyị mbụ bụ ụkọchukwu n'ụka ha, ụkọchukwu Okey Ifionu bụ Ụkọchukwu na ụka Angịcan gwara BBC Igbo maka mgbe e chiri nwaanyị ụkọchukwu na Naijirịa ihe dịka afọ iri atọ gara aga.
Ụkọchukwu Okey Ifionu kwuru sị na Dayọsisi nke ochie dị na Kwara Steeti chiburu otu nwaanyị ụkọchukwu kama ọdabachaghị.

Ebe foto si, Anglican Diocese Of Cape Coast/Facebook
Ifionu kwuru sị, "Ọ bụghi mbụ a na-eme ya n'ọdịda anyanwụ Afrịka, mgbe Beshọp Haruna Yakub nọ n'isi Dayọsis Kwara, o chiri nwaanyị ụkọchukwu kama o butere okwu".
Ọ gara n'ihu kwuo na ya bụ nwaanyị hapụru echichi echiri ya ka udo chia n'ụka Kraịst.
Ọ gara n'ihu kwuo na ya bụ echichi butere nsogbu maka na osoghị na Omenala.
Ifionu kwuru sị, "Ị chọrọ ịgbanwe omenala, ọ na-esi ike. Ndị na-achọghị ịkwado ya kwetere na enweghị ihe gbochiri ụmu nwanyi ịrụ ọrụ Chukwu".
Kama o kwuru sị, " N'uche nke m, mgbe na-eteghị aka, ikuku na-eku na mba ụwa niile ga-erute Naijirịa".
Ọ kọwara na ọ bụghị ihe a ga-eme n'ike, kama na ọ bụ nwayọnwayọ.
Ihe Ụkọchukwu Anglịkan Daniel Muomah nwere ikwu maka okwu a
BBC Igbo na Ụkọchukwu uka Anglịkan ọzọ bụ Daniel Muomah nwere mkparịtụka na ya bụ okwu ichi ụmụ nwaanyị ụkọchukwu na ụka Anglịkan nke Naijiria.
O Kwuru na na-agbanyeghi na ụka Anglịkan nọ na mba niile, na a na-ehiwe ya bụ ụka etu o si metụta ndị na ndị.
O kwuru na dịka ịwụ ụka Anglịkan nwere ike ị dị iche n'ebe n'ebe, kama enwere iwu okpukpe jịkọrọ ndị Anglịkan mba ụwa niile ọnụ nke sitere na mba Briten, nke gụnyekwara nkwenya n'ochịchị atọ n'ime Otu.
Ụkọchukwu Muomah kwukwara na ọchịchị Anglịkan na mba Naijiria enweghi ikike itinye ọnụ n'iwu usoro ọrụ ndị ụka Anglịkan mba ọzọ.
N'okwu akpụ n'ọnụ bụ okwụ ichi ụmụ nwaanyị ụkọchukwu n'ụka Anglịkan nke Naijiria, o kwuru sị," Iwụ na usoro nke ụka Anglịkan na Naijiria anabatabeghị nke a ugbua".
Na nchịkọta, Muomah sị, " Atule ya bụ okwu na ọgbakọ sịnọdụ nke jịkọrọ ndị ụkọchukwu na mba Naijiria ma nwe mkpebị igbanwe ya bụ ịwụ, mgbe ahụ ka ha nwere ikike ime ihe dịka ichi ụmụ nwaanyị ụkọchukwu".









