Nnamdi Kanu: 'Ọ bụ dịmkpa asaa nwụchiri Maazị Kanu na Kenya' - Aloy Ejimakor

Aha onyonyo, Ihe mere anyị jiri chọọ ka akpọrọ Nnamdị Kanu gaa nga - Aloy Ejimakpr

Onye ọkaịwụ na-ekwuchịtere Nnamdi Kanu bụ Aloy Ejimakor ekwuola etu e siri nwụchie Nnamdi Kanu na kenya.

Ọkaiwu Ejimakor sị na Maazị Kanu, bụ onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob), banyere mba Kenya n'ọnwa Eprelu nke 2021.

Ọ sị na ya amaghị ụbọchị ọ banyere ma na ya nwere akwụkwọ gosiri na ọ gara ụlọ ọgwụ na Kenya n'ụbọchị 14 nke ọnwa Mee.

"Ọ gara ụlọ ọgwụ makana o nwere nsogbu n'obi, ma nwekwara ọbara mgbali elu nakwa."

Ọkaiwu Ejimakor sị na Kanu wetere ebe obibi na Kenya dịka o ji akwụkwọ njem ya nke Briten banye mba ahụ.

Dika o siri kwuo "E were m akaebe akwụkwọ nkem ya gosiri na anabatara ya na Kenya tupu a nwuchie ya kpọlata ya Naịjirịa.

"N'ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị 19 nke ọnwa Juun, ọ sị na oji ụgbọala gaa ọdọ ụgbọelu Jomo Kenyatta ị ga bute onye chọrọ ya bịa mba ahụ. Ọ bụ n'ebe ahụ ka dimkpa asaa wakporo ya, buru ya gawa otu ulọ ebe ha kechiri ya anya ma taa ya afụfụ ruo abalị asatọ.

Maazị Ejimakor kwukwara na n'ụbọchị 27 nke ọnwa Juun bụ ụka, ndị kpọro Kanu laghachie ọdọ ụgbọelu, mabunye ya n'ime ọgbọelu nkiti were buru ya gawa Naịjirịa.

Ọkaiwu Ejimakor gwakwara BBC Igbo n'ụbọchị Toozde na ha chọrọ ka ebupụ Maazị Kanu n’aka ndị uweojii nzuzo bụ DSS ma kpọfee ya n’ụlọ mkpọrọ dị na Kuje, Abuja, dịka a n’eche ka ịkpe ya bido.

O kwuru na dịka Maazị Kanu nọ na aka ndị DSS, ha ekwebeghi ka Dọkịnta ya hụ ya maọbụ leta ya, n'agbanyeghị na ahuike ya na-agbada agbada.

O kwuru na ịkpọga ya n'ụlọ mkpọrọ ga-enye ohere ka Dọkịnta ya nakwa ndị ezinụlọ nwee ohere ileta ya n’ụlọmkpọrọ.

Ọkaiwu Ejimakor na-ekwusikwa ike na nnwụchị Nnamdi Kanu esoghi usoro ziri ezi.

'Ọ bụ Naịjirịa si ka anwụchie ya'

Ọkaiwu Ejimakor gakwara n'ihu kwuo na Kanu gwara ya na ndị ji ya na Kenya kwuru na ọ bụ ndị Naịjirịa si ka anwụchie ya.

N'akwụkwọ o zigara onye ntaakụkọ BBC, Ọkaiwu Ejimakor sị na Kanu gwara ya na eboro ya ebubo na ọ onye onyi ndu egwu ya na ndị Al-shabab na-arụkọ.

Mana, dịka o siri dee, ka emechara nnyocha, ndị Kenya chọpụta na nke ahụ abụghị eziokwu.

O dere: Ha gbanwere etu ha si akpasị ya agwa, ma belata ịta ya ahụhụ, mana ha siri ọnwụ na ha ga-akpọnye ya ndị Naịjirịa.

Anyị chọrọ ka akpọrọ ya gaa ụlọ mkpọrọ

O kwukwara na dịka ndị ụlọịkpe niile nọ na Naijiria na-akwado ibido oge ezumuike ha nke ha kwuru kwesiri ibido n’ụbọchị 26 nke ọnwa Juun, ka e butetụ ịkpe Nnamdi Kanu ihu tupu ha agawa ezumike.

Chetekwa na ndị otu Ipob ekwuola mbụ na nnyocha ndị ahuike mere gosiri na mkpuru obi ya zara aza ruo Pasentị iri na atọ. Ha kwuru na Maazị Kanu nwere ọrịa ọbara mgbalielụ.

Ọ bụ ụgbọelu onye nkịtị ka e ji kpọlata ya

Ọ sị na ọ bụ ụgbọelu onye nkịtị, nke Bekee na-akpọ "Private Plan" ka eji bụlata Kanu n'ụbọchị ụka bụ nke 27 nke ọnwa Mee. Ọ si na ọ bụ site ọdọ Ịgbọelu Jomo Kenyatta ka e si bilie ma fetuo na Naịjirịa n'Abuja.

Ọ sị na ọ bụ sọsọ Kanu nọ n'ime ụgbọelu ahụ.

Ndi DSS gbara Kanu ajụjụ ọnụ n'ihu m

Ọkaiwu Ejimakor sị na ndị ọrụ DSS gbara Kanu ajụjụ ọnụ n'ihu ya .

Dịka o si kwuo: "Ajụjụ ọnụ a mepere m anya banyere ọtụtụ ihe dịka o nwere ebubo ọhụrụ ha boro ya. Ebubo ndị a metụtara ọnọdụ ya dịka onyeisi Ipob."

Gọọmentị Naịjirịa na-ebo Nnamdi Kanu ebubo na ọ na-akpa nkata imegide Naịjirịa nakwa na ọ na-ekpa agwa na-iyi ndụ egwu.

Ọ bụ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Jụlai ka ọ ga-alaghachite ụlọikpe maka ya bụ ikpe.