Nnamdi Kanu News Today: Anyị ga-agbapụta Nnamdi Kanu na mkpọrọ n'oge adịghị anya - Ifeanyi Ejiofor

Ifeanyi Ejiofor na Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Arise TV/Youtube

Nkọwa foto, Ifeanyi Ejiofor na Nnamdi Kanu

Ọkaiwu Mazi Nnamdi Kanu bụ Ifeanyi Ejiofor ekwuola na obi siri ya ike na Mazị Kanu ga-enwere onwe ya n'oge adịghị anya.

Na mkparịtaụka ya na BBC na mgbede Tọzde, Ejiofor kwuru na "ihe karịrị ndị ọkaiwu iri ise adịla njikere ịnọchite Nnamdi Kanu n'ụlọikpe".

Ejiofor kwuru sị: "O doro anyị anya nke ọma na Nnamdi Kanu ga-apụta na mkpọrọ n'oge adịghị anya."

"Ọbụghị ibo mmadụ ebubo bụ isiokwu, kama ihe bụ isiokwu bụ iweta ihe akaebe gbasara ebubo ị na-ebo onye ahụ."

"Gọọmentị etiti agaghị ekwu na Kanu hapụrụ ikpe ya gbaa ọsọ, n'ihi na o doro onye ọbụla anya ihe mere n'ụlọ ya kpatara o ji gbaa ọsọ."

Usoro a ga-eso iji gbapụta Nnamdi Kanu

Ifeanyi Ejiofor

Ebe foto si, Arise TV/Youtube

Nkọwa foto, Ifeanyi Ejiofor

"Ngwangwa ikpe malitere ọzọ n'ụbọchị 26 nke ọnwa Julaị, anyị ga-etinye akwụkwọ ka a tọhapụ ya na mkpọrọ," Ejiofor na-ekwu.

"Anyị nwere ndị ọkaiwu karịrị 50 n'ọnụọgụgụ. Ọtụtụ n'ime ha bụ ndị si mba Isreal, Europe, na mba ofesi ndị ọzọ."

"Ọ bụrụ na ụlọikpe anabataghị akwụkwọ anyị tinyere maka ịgbapụta Kanu, anyị ga-aga n'ụlọikpe dị elu."

"Anyị ga-emecha ihe niile dị n'iwu Naịjirịa iji hụ na anyị gbapụtara Nnamdi Kanu na mkpọrọ".

Kedu maka ahụịke Nnamdi Kanu?

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Gọọmentị Naịjirịa

Ifeanyi Ejiofor kwuru na ahụike Nnamdi Kanu na-akawanye njọ kwa ụbọchị dịka ọ nọ n'ụlọ mkpọrọ ndị DSS.

"Ọ dị mkpa ka e zigara Nnamdi Kanu ndị ọrụ ahụike ga-eleta ya anya ngwangwa."

"Anyị agbalịala ike anyị iji hụ na e mere nke a na-egbughị oge ọbụla."

Cheta na gọọmentị Naịjirịa boro Nnamdi Kanu ebubo dị icheiche nke mere ha ji nwuchie ya n'afọ 2016.

Ebubo ndị a gụnyere: "Ịkpa nkata imegide obodo Naịjirịa (treason), iyi ndụ egwu (terrorism), iso n'otu iwu megidere, dịrị gawazie.

Ọkaiwu Naịjirịa bụ Abubakar Malami kwuru na Kanu ga-azara onụ ya maka ebubo ndị a.