Nnamdi Kanu: Lee etu ọchịchị Ipob ga-adị ugbua

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, @MaziNnamdiKanu

Nkọwa foto, Nnamdi Kanu, Uche Mefor, Solomon Egbo na onye ọzọ n'oge Kanu laghachitere mba Briten n'afọ 2019
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ ugbua dịka Mazị Nnamdị Kanu nọ n'aka ndị nchekwa a kpọrọ 'Department of State Services' bụ, "kedu ọnọdụ ọchịchị nke otu Indigenous People of Biafra (Ipob)?"

Cheta na Ọkaikpe Binta Nyako nyere DSS ikike ijide Maazị Kanu ruo Jụlaị 26, 2021 oge ọ ga-alaghachite ụlọikpe bịa zara ọnụ ya maka ebubo na ọ na-akpa nkata imegide Naịjirịa. Bekee kpọrọ ebubo a "Treasonable Felony".

Ọ bụ n'afọ 2015 ka aka kpaara Maazị Kanu nke mbụ.

N'afọ 2017 Ọkaikpe Nyako nyere Kanu ohere ịla be ya ma si n'ụlọ na-abịa ụlọikpe.

Mana Kanu gbara ọsọ si Naịjirịa pụọ dịka ọ sị na ndị agha wakporo be ya ma chọọ igbu ya. Ndị agha Naịjịria gọrọ aka n'ụkwụ na ha emeghi nke a.

Onye nọchitere anya Kanu dịka onyeisi Ipob n'oge na mkpọrọ?

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọkaikpe Binta Nyako nyere Nnamdi Kanu ohere isi be ya n'abịa ikpe n'afọ 2017

Oge Nnamdi Kanu nọ na mkpọrọ na Naịjirịa, ọ bụ osote ya bụ Uche Okafor Mefor nọdụrụ n'oche dịka nchịkọta Ipob.

Mefor nọgidere n'oche ahụ ruo oge Kanu pụtara na mkpọrọ n'ọnwa Eprel afọ 2017.

Mana n'ụbọchị iri nke ọnwa Sepụtemba 2017 bụ ụbọchị ikpeazụ a hụrụ Namdi Kanu n'ọha ruo Ọktoba 2018 oge ọ pụtara ihe na mba Izrel.

N'ime oge ahụ, Maazi Mefor laghachiri bụrụkwa onye ndu Ipob n'agbanyeghị na ọ nọkwa na-aza "Osote Onyeisi".

Etu Mefor na ndị ọzọ siri pụọn'Ipob

Aha onyonyo, Asari ejighi aka ya mee onwe ya onye isi oche Defacto Biafra Government - Uche Mefor

Kepukepu na esemokwu na-ada n'etiti Nnamdi Kanu na osote ya bu Uche Mefor pụtara ihe n'ọnwa Jụlaị nke 2020, dịka Mefor malitere ide ụfọdụ ihe dị agha n'akara Facebook ya.

Mana ruo Jụlaị afọ ahụ ọ ka na-ekwukwa na Nnamdi Kanu ka bụkwa ọga ya.

Mana n'ọnwa Maachị 2021, Uche Mefor, Ralph Uwazurike, Asari Dokubo na ndị ọzọ nwere nzukọ ebe ha nọ hibe otu ha kpọrọ "Biafra Defacto Customary Government".

Uche Mefor bu Onyeisi Mgbasaozi otu ahụ. Ọ bu nke a gosiri ọha na eze kpọmkwem na Mefor ahapụla Ipob.

Ndị ọzọ hapụkwara otu Ipob n'oge ahụ gụnyere Obidi Obienu, George Onyibe, Solomon Egbo (o mechara laghachi) na ụfọdụ ndị ọzọ.

Kanu mechakwara pụta kwuo hoohaa na ya akagbuola otu Ipob na mba Briten.

Ọ bụ na Briten ka Mefor, Kanu, Egbo na ọtụtụ ndị sepụtere isi na Ipob si achụ nta Biafra ha.

Ka nke a na-eme Maazị Kanu kpọrọ aha kpọmkwem na ọ bụ ndị nọ n'atụmatu ọ kpọrọ "Directorate of State" (DOS) ka ndị Ipob ga na-ege ntị.

Kedụ ndị bụ DOS?

Skip Facebook post

Content is not available

View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.s

End of Facebook post

Ọtụtụ ndị Ipob pụrụ n'otu ahụ gwara BBC Igbo na isi okwu ihe na-esere ha na Ipob okwu bụ agwa ndị DOS na-akpasa ha, ọ kachasị etu ha si na-akpọ ha iyi na sohal midia ma na-akatọkwa ha.

Dịka Maazị Egbo gwakwara BBC Igbo n'otu mkparịtaụka o mere, ọ bụ DOS kpatara ọtụtu nsogbu na-ebe na Ipob. Ọtụtụ ndị ọzọ na-ekwu na ya bụrụ na DOS Chika Edoziem bụ onyeisi ya nọ n'akụkụ, nsogbu agaghị adị etu o siri dị.

Chika Edoziem nọ n'etiti ndị Ipob ọzọ na Foto a

Ebe foto si, Chika Edoziem/ Facebook

Nkọwa foto, Chika Edoziem nọ n'etiti ndị Ipob ọzọ na Foto a

Kemgbe afọ 2020, Chika Edoziem bu onye na-ebinye aka n'akwụkwọ mgbasaozi si Ipob apụta.

Ozi o binyere aka gụnyere nke kwuru na Uche Mefor abụghịzị osote onyeisi Ipob, nakwa nke sị ka ndị mmadụ ghara iso Maazị Egbo mekọọ ihe ọbụla banyere Ipob na UK n'agbanyeghị na ọ rịọrọ mgbaghara maka etu o si pụọ.

N'ụbọchị 19 nke ọnwa Juun Maazị Edoziem wepụtere ozi n'akara Facebook ya na Ipob ga-akwụsị ọgbakọ ihe niile maka etu obodo siri dị.

Ebe foto si, Chika Edoziem/ Facebook

Nkọwa foto, N'ụbọchị 19 nke ọnwa Mee 2021 Maazị Edoziem wepụtere ozi n'akara Facebook ya na Ipob ga-akwụsị ọgbakọ ihe niile maka etu obodo siri dị.

Maazị Egbo kpọrọ Maazi Kanu n'ekwentị n'oge ọ na-ekwu okwu na Facebook ya ma riọ mgbaghara etu o siri rapụ Ipob.

Ewepụ ndị DOS, e nwere onye a kpọrọ "Africa Coodinator", nwekwaa ndị ndu na steeti dị icheiche na Naịjirịa.

Ka ọ kwụ ugbua, ọ bụzị DOS nke Chika Edoziem bụ onyeisi ya bụ ndị ọchịchị Ipob ga-adịzị n'aka ha.

Kedụ maka ESN?

Onye sara asịsa

Dịka Kanu na-ekwubu na mkparịtaụka ọ na-itinye na ọgba Facebook ya, Eastern Security Network (ESN) bụ ngalaba nchekwa o hibere, nọ ya n'aka.

Ọ na-ekwusi ike ka ndị ndu steeti dị icheiche ghara itinye anya maọbụ ọnụ n'okwu ESN.

Chetakwa na Ipob kwuburu na ha ga-agbanyụ ọkụ ruo abalị 150 dika ha na-ekpe ekpere.