Nnamdi Kanu: 'Aka mba Britain adịghị na nwụchị na mkpọghachite nwaamadị a na Naijirịa' - Briten
Ọnụ na-ekwuchitere British High Commission na Naịjirịa a kpọrọ Dean Hurlock ekwuola n'aka mba Uk adịghị na nwụchị na mkpọghachite Nnamdi Kanu bụ onyeisi Indigenous People Of Biafra (Ipob) na Naịjirịa.
N'okwu ya, "Anyị ma maka akụkọ kwuru na anwụchịrị Kanu, anyị na-ekwu na ọ bụghị na mba UK ka anwụchịrị Nnamdi Kanu."
Hurlock kwuru na ọ maghị ebe a nọ nwụchie Nnamdi Kanu, nwuje ya Naịjirịa.
"Gọọmenti etiti Naịjirịa ga-aza ajụjụ gbasara ebe a anwụchiri Kanu ma kpọbata ya na Naịjirịa mana anyị chọpụtara na ha kpacha anya ghara ịkpọpụta aha obodo ha na ha jịkọtara wee kpọbata Kanu na Naịjirịa. Nke bụ eziokwu bụ anyị amaghị."
Hurlock kwukwara na Nnamdi Kanu nwere ikike dịka onye mba Britein ọ bụ, ịchọta nkwado n'aka gọọmenti mba UK na mba ofesi ọbụla ọ hụrụ onwe ya tụmadị ebe e nwere ebubo ọbụla e boro ya.
N'ọnụ okwu ya, "amaghị m ma o nweela mkpesa batara n'aka gọọmenti UK site n'aka Nnamdi Kanu."
"Mana ọ bụrụ na e nwere, anyị ga-anabata ya dịka anyị si anabata mkpesa onye mba Britein ọbụla nọ na mba ofesi chọrọ enyemaka n'aka gọọmenti UK."
Lee usoro mba UK ji akpọga mmadụ na mba ọzọ ka e kpee ya ikpe
Ọ dị mba otu narị ha na mba UK nwere nkwekọrịta maka ịkpụga mmadụ ka e kpee ya ikpe, nke bekee kpọrọ 'extradition'.
Mana e kere mba ndị a ụzọ abụọ: Otu nke mbụ na otu nke abụọ.
Otu nke abụọ a nwekwara ụzọ abụọ; otu A na otu B.
Naịjirịa nọ n'otu nke B.
Tupu mba UK akpụga mmadụ na mba nọ n'otu B ka e kpee ya ikpe, lee usoro iri a ga-eso:
1.Mba ahụ ga-eweta ihe akaebe doro anya gbasara ebubo ha na-ebo onye ahụ
2.Mba ahụ ga-edegara odeakwụkwọ mba UK (Secretary of State) akwụkwọ
3.Odeakwụkwọ mba UK ga-ekpebi ma ebubo mba ahụ na-ebo onye ahụ o ziri ezi
4.Ụlọikpe ga-ekpebi ma a ga-anwuchi onye ahụ e boro ebubo
5.A ga-anwụchi onye ahụ e boro ebubo ma kpụta ya n'ụlọikpe
6.A ga-ekpe onye ahụ ikpe nke mbụ
7.A ga-ekpe onye ahụ ikpe nke abụọ iji kpebie ma a ga-akpụghachi ya na mba ahụ na-achọ ya. (Chetakwa na onye ahụ nwere ike ịgbagha ikpe a ruo ụlọikpe Supreme Court nke mba UK)
8.Odeakwụkwọ mba UK ga-enye iwu ka a kpọrọ onye ahụ nye mba na-achọ ya.
9.Ọ bụrụ na onye e boro ebubo agbaghaghị ebubo ahụ, a ga-akpụrụ ya nye mba ahụ na-achọ ya n'ime ụbọchị 28 Odeakwụkwọ mba UK jiri nye iwu.
10.Ọ bụrụgodi na onye ahụ e boro ebubo bụ nwaafọ mba UK, a ga-agbasokwa usoro niile ndị a tupu a kpụrụ ya nye mba na-achọ ya.
Mana Mba UK agaghị akpọghachi mmadụ na mba ebe e nwere ike ịma ya ikpe ọnwụ.
Oge ọ ga-ewe iji mee ihe niile ndị bụ ọnwa abụọ.
Ọ gafee ọnwa abụọ, onye ahụ nwere ike ịgwa ụlọikpe ka a tọhapụ ya.
Mana Odeakwụkwọ mba UK nwere ohere idegara ụlọikpe akwụkwọ rịọ ka a gbatịkwuo oge a ga-ejide onye ahụ.



