Nnamdi Kanu: Gịnị mere nwa amadị a onye bu igu ewu niile na-eso?

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, @MaziNnamdiKanu

    • Onye dere ya, Uche Akolisa & Jessica Nwankwo
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Kemgbe Gọọmentị Naijiria nwụchigharịrị onye ndu otu 'Indigenous People of Biafra' (Ipob) n'abalị 29 nke ọnwa Juun afọ, ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu ka gọọmentị were nwayọọ sobe okwu ahụ.

Ha na-atụ uche na ọ bụrụ na e jighị amamihe so ya bụ okwu, na ọ ga-ebute nnukwu nsogbu n'ihi na ndị ndị na-eso ya dị ọtụtụ.

Ndị ma ihe ekwe na-akụ n'ihe gbasara ihe na-eme na Naijiria na-arụtụ aka na ọnọdụ enweghị ọrụ, ndakpọ akụnaụba, mmegbu ndị Igbo, na enweghị onye ndu na-ekwuchitere Igbo na ihe ndị ọzọ mere Nnamdi Kanu otu onye bu igu ewu niile na-eso.

Na nsonso a, otu onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Dan Nwanyanwụ kwuru na Nnamdi Kanu bụ "naanị onye Naijiria n'ime ma ndị dị ndụ ma ndị nwụrụ anwụ nwere ike ịkpọkọba igwe mmadụ ka ha mee ihe, na-enyeghị ha ọbụladi otu naira, ha ege ya ntị".

Aha onyonyo, Nnamdi Kanu: Azikiwe tinyere ndi Igbo n'ọmị ha nọ na ya

Na mkparịtaụka ya na ụlọ ntaakụkọ AIT nwere, Nwanyanwu, onye jiri oku 'nọrọ n'ụlọ' nke Nnamdi Kanu kpọrọ n'abalị 31 nke ọnwa Mee afọ 2021 maa atụ, sịrị na "ma Obafemi Awolowo , Nnamdi Azikiwe,Ahmadu Bello na Muhammadu Buhari enwelighị ụdị ikike ahụ."

Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images

Okwu a dapụtara n'ọnụ Nwwanyanwu kpọkọtara ọnụ ụdị ikike Kanu bụ onye ndu otu nnwereonwe Biafra bụ 'Indigenous People of Biafra'(Ipob) nwere n'ebe ndị na-eso ya nọ.

Aha onyonyo, Nwanne Nnamdi Kanu ekwuola ihe mere o ji bụrụ ọpụrụiche

Ya bụ ikike abụghị naanị n'ebe ndị Igbo, ọkachasị ndị ntorobia nọ, kama ọ na-egosi onwe ya n' ebe ọtụtụ ụmụ Naijiria ndị ọzọ; ma ndị hụrụ ya n'anya, ma ndị kpọrọ ya asị nọ.

N' ilere anya n'usoro nke Michael H. Hart gbasoro dee akwụkwọ ya ọ kpọrọ "The 100: A Ranking of the Most Influential Persons in History", BBC Igbo lere anya na ndụ Kanu mbụ na ugbua nakwa ihe mere ụfọdụ ji ahụta ya dịka onye nwere ikike enwegbeghị oyiri na Naijiria.

Onye ka Nnamdi Kanu bụdi na mbu nakwa ugbua?

Akụkọ Igbo

Ma ndị hụrụ ya n'anya ma ndị kpọrọ ya asị kwetara n'ezie na Nnamdi Kanu bụ ụkwa achị n'aka ọ na-agba.

Na Naijiria bụ mba naanị ndị nọ n' ọchichị obodo, ndị nwere ụlọ mmepụta ngwaahịa na ndị isi ofufe ka aha ha na-ada ụda, ọ bụ ihe ịtụnanya na Kanu n'agbanyeghị na ọ bụghị onye ndọrọndọrọ ọchịchị, onyeisi ụka maọbụ onye ojiegochụego enweghị onye a kpụ aha ya n'ọnụ ka Nnamdi Kanu.

Lee ụfọdụ ihe ndị e chere mere ya Nnwannebụenyi' ihe ọ bụ ugbua:

1. Ọ na-enye ndị ntorobia Igbo olileanya

Uwazuruike

Ihe isi ike dị na Naijiria; Enweghị ọrụ, agụụ, nrụrụaka ọkachasị n'aka ndị nọ n'ọkwa ọchịchị bụ nsogbu na-awa ụmụ Naijiria agba kemgbe ụwa.

Ka e weghachiri ọchịchị n'aka ndị nkịtị n'afọ 1999, ụfọdụ chere na mgbanwe ga-abata mana ọ dịghị etu ahụ.

Ọchịchị pụọ, ọchịchị anọchie, mana ihe na-ebe na ebe nke wetara nkoropụ obi na Naijiria ga-adịkwa mma ọzọ.

Ngụkọ NBC wepụtara n'ọnwa Maachị afọ 2021 na-egosi na pasent 33.3 (nde mmadụ 69.7 ) enweghị ọrụ na ngwụcha afọ 2020.

N'afọ 2018, 'World Poverty Clock, nke ụlọ mmụta 'Brookings Institute' na-ahazị kwuru na Naijiria anapụla mba India ọkwa dịka isi obodo ụbịam n'ụwa(World poverty Capital) dịka ihe ruru mmadụ nde 90 ndị Naijiria anaghị ahụ ego ruru dọla abụọ iji rie nri n'ụbọchị.

Onye ọkaiwu mabụrụ onye bụbụ onyeisi otu Aka Ikenga bụ Goddy Uwazuruike kwụrụ sị kọwaa

"Ihe siri ike n'ala Igbo; Ị gụcha akwụkwọ ịgaghị enwe ike nweta ọrụ na Naijiria, tinyere na ịkpa oke agbụrụ n'inye ọrụ mere na ndị ntorobia enweghịkwa olileanya na ihe ga-adị mma."

"Nnamdi Kanu bịara na-ekwe ha nkwa na Biafra ka ha ga-enweta ihe ha chọrọ."

"Nkwa ahụ na olileanya ha na-enwe ebe ọ nọ bụ ihe o ji nweta ha."

Uwazuruike kwukwara na ọ bụghị ego ka Kanu ji enweta ha kama na ọ bụ ndị ntorọbịa na-atụkọrọ Kanu ego.

"Ọ sị ha weta otu puku ha eweta na-eleghi anya n'azụ, Ọ sị ha weta dọla iri abụọ ha eweta na-eleghị anya n'azụ"

2. Ndị mmadụ debere Nnamdi Kanu ebe ọ nọ

N'uche ụfọdụ, ọ bụ aka mere azụ mgbakọ, o nweghị eze na-abụ eze ma ọ bụrụ na o nweghị ndị obodo kwụ ya n'azụ.

Otu onye sobu na ndịisi otu Ipob bụ Uche Mefor kwuru na ọ bụ nkwado ndị mmadụ nọ Nnamdi Kanu okrikiri mere ya ihe ọ bụ.

Mefor

Mefor, onye bụ onye mgbasaobi otu Defacto Customary Government of Biafra' gwara BBC Igbo sị, "Ọ bụ ndị mmadụ mere Nnamdi Kanu ihe ọ bụ taa."

Mefor kọwara na otu Ipob bụ nnukwu otu ma kwuo na o kwesiri na onye ọbụla bụ onye isi otu ahụ ga-enwe agba.

"Ipob bụ nnukwu otu na-ekwuchitere ndị ntorobia ndị na-achị achị anaghị ekwuchite ọnụ ha nwere agba, onye na-edu ha ga-enwekwa agba."

"Ndị ntorọbịa Igbo na-achọ onye ga-enye ha olileanya maka mmegbu ha na-agabiga na Naịjirịa"

"Otu Ipob na-eme nke a nke pụtara na ndị ntorọbịa ji eruwere ha isi"

"Ihe mere Ipob ji bụrụ otu na-ada ụda bụ maka ndị ntorobịa so na ya."

3. 'Buhari mere Nnamdị Kanụ onye ọ bụ taa'

Nnamdi Kanu etiwalari mkpu nnwereonwe Biafra tupu Muhammadu Buhari banye n'ọkwa onyeisala n'afọ 2015, mana na nkwenye ụfọdụ ndị mmadụ nwere ọ bụ Buhari bụ onye mere Nnamdi Kanu onye nwere agba na Naijiria site na iji anyịke egbu ahụhụ.

Dan Nwanyanwu

Ebe foto si, Dan Nwanyanwu/Facebook

Dan Nwanyanwu kwuru na ọ bụ aka ike Buahri jiri soo Nnamdi Kanu kama ịkpọ ya ka ya na ya nwee mkparịtaụka mere Kanu eze.

"N'afọ 2017, e nyere m Onyeisiala ndụmọdụ ka ya na Nnamdi Kanu nwee mkparịtaụka, oge ahụ ihe akabeghị njọ ka ọ dị ugbua.

"Nke a bụ nwoke anọghị n'ala a mana o nwere ike kpọọ nde kwuru nde mmadụ oku ka ha nọrọ n'ụlọ, ha ege ya ntị.

"O nweghị onye ndu ọbụla n'ala a, nwere ike imeli ya; Awolowo emelighị ya, Nnamdi Azikiwe emelighị ya,, Ahmadu Bello emelighi ya,Buhari n'onwe ya emelighịa ịkpọ ndi mmadu oku, na- ezigara otu naira, ha ege ntị."

Nwanyanwu kwuru na kama ịkpọ ya ka ha kparịta ụka, na gọọmentị Buhari ji ndị agha achụgarịwa ya; wakpoo ụlọ ya, gbuo ụfọdụ ndị na-eso ya, ebe nne na nna ya nwụrụ na nsogbu so ya.

4. Mmegbu na ịwọ ndị mpaghara Ọwụwa -Anyanwụ oke ruru ha

Ọtụtụ ndị welitere isi n'ala Igbo nakwa ụfọdụ otu gụnyere Ohaneze Ndigbo na-ebo Onyeisiala Muhammadu Buhari ebubo ịkpa oke agbụrụ megide ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwu.

Ha na-eti mgbu kemgbe ụtụtụ Ọchịchị Buhari, na Buhari na-awọ ndị mpaghara ha oke n'ọkwa Ọchịchị ọkachị na Ndịisi ọrụ nchekwa.

Ndị eze

Kemgbe Buhari jiri banye ọkw dịka onyeisiala n'ọchịchị ndị nkịtị, onye Igbọ anọghị n'isi Ndịagha Ugboelu, ndịagha elu ala,ndị agha mmiri ma ya fọdụkwa ndị uweojii, nke Ohaneze na-eti mgbu megidere Iwu o rute nwanne, orute ibe ya dika ọ dị n'akwukwọ iwu Naijiria.

Ha na-ekwukwa na Buhari ejighị aka o jiri soro ndị mpaghara ndị ọzọ were soro ndị Igbo.

Ọmụmaatụ: O nweghị mmachị ọbụla Ọchịchị Buhari tinyere ndị Fulani ọchiehi bụ ndị a na-ebo ebubo ịwakpo obodo dị iche gbusisi ndị mmadụ, dina ụmụnwaanyị ha n'ike ma bibie ugbo ha.

Mana ya bụ gọọmenti machiri otu Ipob na-eti mkpu maka nnwere onwe Biafra oge naanị ihe ha na-emeli bụ ịgba egbe ọnụ, kpọọ ha otu na-eyi ndị mmadụ egwu(terrorist group).

Nwanyanwu sịrị, "Mgbe mbụ ndị ipob abụghị ndị agha, o nwebeghị onye ha gburu. O nweghị ihe ha chọrọ karia eme nwa ka e mere ibe ya, obi adị ya mma."

5. Ndị Igbo enweghị onye ndu nwere nkwuwa okwu i kwuru ha

Mwute ọtụtụ ndị Igbo bụ na ndị ndu ọchịchị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na-anọ mmadụ mmadụ na-esi mmụọ mmụọ n'okwu metụtara ndị Igbo.

N'okwu nchekwa, mmepe obodo, oke ruru ha na Naijiria, ha na-eri arịrị na e wezụga mmadụ dịka Senetọ Enyinnaya Abaribe, ndị Igbo nwere ọkwa n'ọchịchị na-anọ dịka ndị nkịta tara ire ha maọbụ ha eburu okwu ndị mpaghara ọzọ n'isi.

Iji maa atụ, otu onye ntaakụkọ bụ Nnedi Ogaziechi rụtụrụ aka na mkparịtaụka BBC Igbo hibere nso nso a maka ndakpọ nchekwa n'ala Igbo, na "aghọtaghị m ihe ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ na-eme eme" maka ihe na-akpọtụ n'ala Igbo.

Nnedinso Ogaziechi

Ebe foto si, Nnedi Ogaziechi

N'otu aka ahụ, na mkparịtaụka BBC Igbo na Uche Mefor, Dan Nwanyanwu na Goddy Uwazuruike nwere iche iche n'ekwentị, ha kwekọrịtakwara na ndị ndu ọchịchị sị Ọwụwa Anyanwụ na-amịla azụ n'okwu metụtara ndị Igbo dịka o si metụta nsogbu ndị ọchịehi na okwu ndị ọzọ na-eri ndị Igbo nri n'afọ.

Nwanyanwụ sị, "E kwute okwu mmegbu a na-emegbu anyị, ndị ji ọkwa enweghị onye na-ekwu okwu."

"Nnamdi Kanu na-ekwu maka ya, ndị ntorobia hụ ya ka onye na-ekwu ka o si metụta ha, ha sowe ya."

Cheta ihe ndị a gara aga:

  • N'afọ 2012, Nnamdi Kanu malitere otu Ipob
  • N'ọnwa Ọktoba afọ 2015- Ndị ọrụ nchekwa nwụchiri Nnamdi Kanu na Legọs oge ọ bịara njem Naijria, tụnye ya na mkpọrọ na e kpeghị ya ikpe otu afọ na ọkara maka ebubo na ọ na-akpa nkata ịkwatu gọọmentị.
  • N'afọ 2016, Amnesty International kwuru na ndị ọrụ nchekwa gburu ndị na-eso ya dị 150 site n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2015 rue ọnwa Ọgụstụ afọ 2016.
  • N'abalị Iie nke ọnwa Eprelụ afọ 2017, Ulọikpe Ukwu dị n'Abuja tọhapụrụ ya na nye ya iwu tara akpụ; ya na ihe karịrị mmadụ iri agaghị ezukọ, ọ gaghị ekwusara ndị ntaakụkọ ụka wgz.
  • N'abali 14 nke ọnwa Septemba afọ 2017, ndịagha wakporo ụlọ Kanu n'obodo ya. E merụrụ ụfọdụ ahụ, gbuo ụfọdụ, ebe Kanu minara, ọtụtụ chee na ọ nwụọla.
  • N'ọnwa Ọktoba afọ 2018, a hụrụ ya ọzọ ka ọ gachara otu afọ e jiri wakpoo ụlọ ya.
  • N' Ọnwa Ọgụstụ afọ 2019, nne Nnamdi Kanu nwụrụ n'ụlọọgwụ na mba Jamịnị.
  • N'ọnwa Septemba otu afọ ahụ, nna ya nwụsọro ya nke mere ka Kanu kwuo na ọ bụ arịrị obi mwakpo ndị agha gburu ndị mụrụ ya ma kwee nkwa na ọnwụ ha ga-agba ya ume ịchụ nnwereonwe Biafra ruo isi njedebe.
  • N'Abalị 29 nke ọnwa Juun afọ 2021 ndị ọrụnchekwa Naijiria nwụchigharịrị ya ọzọ