Mpụtagharị Nnamdi Kanu ga-enyere APC aka karịa PDP - Felix Okafor

Nnamdi Kanu n'ụlọikpe Abuja

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Abaribe, El-shalom na Tochukwu Uchendụ gbaara Nnamdi Kanu akaebe mgbe eji ya eji

Onye ọkacha n'okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ Felix Okafor akọwala etu mpụtagharị Nnamdi Kanu ga-eji emetụta ndị Igbo n'afọ 2019.

Mgbe BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ banyere uche ya na mpụtagharị Nnamdi Kanu, o kwuru na nke a agaghị enyere ndị Igbo aka.

O kwuru na ọ gaghị enyere ndị Igbo aka i nweta ọkwa osote onyeisiala maọbụ onyeisiala n'ihi na Kanu na ndị otu ya ekwenyeghi na Naịjirịa.

N'okwu ya "Nnamdi Kanu ekweghi na Naịjirịa bụ obodo, ọ na-akpọ Naịjirịa obodo ụmụanụmanụ

O kwuru na Kanu ekweghị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị Naịjirịa ka ọfọduzie Igbo ịbụ osote onyeisiala.

Buhari, Atiku

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Buhari na Atiku Abubakar ga-akwata na ntuliaka onyeisiala na 2019

Okafor gara n'ihu kwuo na mpụta Nnamdi ga-eme ka ndị mmadụ tụọ Atiku egwu na ọ wepụtara onye Igbo ga-eme ka-akpọ ganị ganị imegide Naịjirịa.

" Mpụtagharị Nnamdi Kanu agaghị enyere PDP aka, kama ọ bụ APC ka ọ ga-enyere aka", Okafor kwuru.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: