Isiokwu bụ ịkwụsị ịkpa oke megide ndị Igbo, ọ bụghị inwuchi Nnamdi Kanu - Victor Umeh

Aha onyonyo, Victor Umeh

"Ọ bụrụ na gọọmentị etiti akwụsịghị ịkpa oke megide ndị Igbo, okwu nnwereonwe Biafra agaghị akwụsị."

Nke a bụ ihe Victor Umeh, bụbu onyeisioche pati APGA, kwuru gbasara nnwuchi Nnamdi Kanu.

Umeh kwuru na ihe gọọmentị ga-agba mbọ ime bụ ka ndị Igbo mata n'eziokwu na ha bụ ndị Naịjirịa, ọ bụghị ịgba ọsọ nwuchie Nnamdi Kanu.

Gere ihe o kwuru n'elu.

Ndị mere akụkọ a bụ Oluchi Nwankwo na Nnamdi Agbanelo.