South East Governor's Meeting: Lee ihe ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ kpebiri ha ga-ebugara onyeisiala Buhari

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ

Ebe foto si, Enugu State Government

Otu jikọtara ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ akatọọla atụmatụ na akparamagwa otu niile na-achọ nwereonwe ha na Naịjirịa ma kwuo na ha akwadoghi ndị a n'ụzọ ọbụla.

Ha mere mkpebi a n'ọgbakọ ha mere n'Enugwu n'ụbọchị Satọde bụ nke gọvanọ Ebonyi Steetị bụ David Umahi gụpụtara.

Ha kọwara na ha hibere ọgbakọ a bụ ka ha chịkota ihe ndị ha ga-agwa onyeisiala Naịjiria ma ha na ya zute ọzọ nso nso a.

Cheta na mịnista na-ahụ maka nchekwa bụ Maj. Gen. Bashir Magashi nọchitere anya gọọmenti eiti na ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ nwere ọgbakọ na June 11, 2021 ebe ekwekọrịtara izitere ha ozi ihe na-akpa ndị Igbo ma ha mechaa ọgbakọ.

Ha mechara hibee kọmịtị ndị ga-anọ n'okpuru ohaneze ndị Igbo ka e wee lebaa anya n'ihe ndị ahụ na-akpa ndị ntoroọbịa Igbo ma gboo ha.

Aha onyonyo, Orlu Crisis: Ndị uweojii na ndị agha nọchiri ụzọ esi aba Orlu

Kọmịtị ndị e hibere ga-elebanya n'ihe ndị a, isiọnwụ; iso ndị bi ogbe ọzọ kwekọrịta; ndị igbo bi na mpagahara ugwu Hausa, ọwụwa anyanwụ, ndịda anyanwụ, ndịda ndịda; Ipob, Massob, ndị ntoroọbịa na ndị na-azụ ahịa, ndị na-agba ọgbatum tum na Keke, ndị bi mba ofesi, ndị ọnụ na-eru n'okwu nakwa ndị ọchịchị mba ụwa.

Umahi kwuru na otu ndị na-achọ nwereonwe anaghị ekwuchitere ndị bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

"Maka ndị na-eche na anyị gbara nkịtị maka mwakpo niile na-eme n'ala Igbo, ọ bụghị eziokwu."

Aha onyonyo, Eeee awakporo ụlọọrụ ndị uweojii n'obodo anyị ma gbuo inspector Peter - Onye Obodo Ojoto

N'ọkwu ya, "ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ, onyeisi Ohaneze, ndị ụlọomeiwu, nakwa ndị ọchịchị na-apụta n'ọha kwamgbe kwamgbe na-akatọ agwa ọjọ ndị omekome a na-akpa n'ala Igbo."

Okwu idi n'otu Naịjirịa

George Obiozor, Pius Anyim Pius, Chris Ngige nakwa ndị ọzọ

Ebe foto si, Enugu State Government

Nkọwa foto, Ọgbakọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ kpebiri na ha kwadoro idi n'otu Naịjiria

Ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ sịkwa na ha ma maka egwu a na-eyi ndị bi n'ala Igbo mana ha ga-agba mbọ hụ onye ọbụla bi na mpaghara ahụ nwere ezi nchekwa.

Ha rịọkwara ndị ọchịchị steeti ndị ọzọ ka a biko chekwa ndị Igbo bi n'ala ha.

Ha katọrọ etu e si awakpo ma gbuo ndị ọrụ nchekwa, gbaa ụlọọrụ gọọmenti ọkụ, gbuo ndị nkiti na mpaghara Ọwụwa Anayanwụ.

"Ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ na-ekwusike na ha kwadoro idi n'otu Naịjiria."

Aha onyonyo, 'Ihe ndị gọvanọ ala Igbo na ndị agha Naịjirịa bịara mee n'Engwu bụ ite ude'

Ndị ọzọ biara ọgbakọ a gụnyere mịnịsta na-ahụ maka ọrụ na inye ọrụ, Chris Ngige; mịnista na-ahụ ihe ngụpụta n'ala bụ Uche Ogah, onye bụbụ odeakwụkwọ gọọmenti etiti bụ Pius Anyim, ndịisi ụlọ okpukperechi, ndị igwe na ndị ọzọ.

Cheta na otu jịkọtara ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ na onye nnọchiteanya gọọmenti etiti aha ya bụ onye agha Bashir Magashi.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị