'Onyeisiala kpọọ ọgbakọ ndị na-achọ ikewepụ na Naịjirịa' - Bishọpụ

Aha onyonyo, 'Onyeisiala kpọọ ọgbakọ ndị na-achọ ikewepụ na Naịjirịa' - Bishọpụ

Bishọpụ Anglịkan mpaghara odida anyanwu Niger bụ Bishọpụ Johnson Ekwe gwara BBC Igbo na o ga-aka mma ka gọọmentị etiti soro uzo mkparịtaụka ma hapụ i jị aka ike so ndị n’eti mkpụ nnwere onwe na ala Naijaria.

O kwuru na ihe so akpata obi iwe na-ọgba aghara na etiti ha na ndị ntorobia n’eti mkpụ nnwere onwe na bu etu omemụ ha bụ gọọmeti sị egosi nleghara anya na kwa mkpagbu.

N’okwu ya, ọ dụrụ gọọmentị ndụmọdụ sị ka ha gaa tinye anya n'akwụkwọ ogbako CONFAB nke emere na afo 2014, ebe akpọkọtara ndị mba Naijaria niile tuule etu o ga-esị kacha mma ịche ha, dịka atumatu ahu ogosịrị mmadu niile uzo ọchịchị ziri ezi.

Na ngwucha okwu ya, o kwuru na-echiche nhazigharị usoro ọchịchị Naijiria nwere ike idaju mkpụ nnwere onwe na-adasi ike n'ọwụwa anyanwụ, na odida anyanwu na kwa na etiti Naijaria.