Eastern Security Network: Amaghị m maka ha mana ihe e meziri nke ọma dị mma - John Okiyi
John Okiyi bụ kọmishọna mgbasaozi n'Abia Steetị mgbe ọ na-akọwa ọnọdụ nchekwa na steetị ahụ sị na ọ maghị maka 'Eastern Security Network' nke Ipob hiwere.
Ọ sị mana ọ bụrụ na ESN na-eme ihe ọma n'usoro iwu kwadoro, na ọ dị mma.
Okiyi gara n'ihu kwuo na gọọmentị Abia adịla mbụ hiwe ngalaba nchekwa a kpọrọ 'Homeland Security' na ha ebidola ọrụ.
Ọ dọkwara ndị Abia aka na ntị ọkachasị ndị bi n'ime obodo ka ha gbadoo anya n'ịchọpụta ndị batara n'obodo ha.
Kirie ihe o kwuru n'uju;


