Orlu Crisis: Akụnaụba obodo a adaala kemgbe ihe mere n'Orlu - Eze Amaifeke

Aha onyonyo, Akụnaụba obodo a adaala kemgbe ihe mere n'Orlu - Eze Amaifeke

Kedụ ọnọdụ Orlu nọ n'ime ya ugbua kemgbe ndị agha na ndị a na-eche na ha bụ ndị Eastern Security Network (ESN) kwatachara?

BBC garuru obodo ahụ iji anya ha hụ ka ihe dị ugbua.

Eze dkt. E.C. Okeke gwara BBC Igbo na ndị mmadụ anaghị agagharịcha etu ha si emebu mbụ.

O kwukwara etu o si metụta akụnaụba obodo ha ugbua.

Kedụ ihe ọ gwara ndị ọrụ nchekwa? Chọpụtakwa ya ebe a.