Onye eze Jesus: Ihe mere 'Onye eze Jesus' taa

Ebe foto si, Screengrab
A kpụpụghị Onye eze Jesus ụlọikpe taa dịka e si chebuo, ọ ka nọ n'aka ndị uweojii.
Ruo ugbua, amabeghi ihe ga-eme maọbụ mgbe a ga-akpụpụ ya ya bụ ụlọikpe.
Nke a na-abịa dịka aka ndị uweojii Anambra steeti kparala Onye eze Jesus nke ezigbo aha ya bụ Onyebuchi Okocha, maka ebubo ịghọgbu ndị mmadụ wdgz.
Ebubo ndị e boro ya gụnyere ịmetọ ego Naịjirịa nakwa ịgba ndị mmadụ o ji n'ọrụ n'anwụ.
Cheta na ọ bụ taa ụbọchị 28 Jenụwarị ka o kwuru o ga-eji kpọlitekwa ndị nwụburu n'ọnwụ.
Mana Gọọmentị Anambra dọrọ ụlọọgwụ nakwa ụlọ ozu dị icheiche na steeti ahụ aka na ntị ka ha na Onye eze Jesus ghara ịmekọ ihe ọbụla.
N'akwụkwọ ozi si n'aka Mazi Nwankwo Nwabueze, onye ji ọkwa 'Permanent Secretary' na ngalaba ahụike Anambra, gọọmentị kwuru na ụlọọgwụ ọbụla maọbụ ụlọ ozu ọbụla ha na Onye eze Jesus mekọrọ ihe, ga-anata ntaramahụhụ.
Cheta na Onye eze Jesus rịoburu mgbaghara n'ụbọchị ụka mgbe gọọmentị Anambra steeti wepụtara ozi katọrọ atụmatụ ya.
Ugbua, ọ bụ n'ụlọikpe dị n'Ogidi ka a ga-ekpe ya ikpe maọbụrụ na ọ ga-aga ụlọikpe.
Ihe anyị ma maka Onye eze Jesus

Ebe foto si, Facebook/Screengrab
- Aha ya bụ Onyebuchi Okocha
- Ọ bụ onyeisi ụlọụka akpọrọ 'Children of Light Ministries' dị na Nkpor, n'Anambra steeti
- Ọ bụ onye obodo Amafor dịkwa na Nkpor
- Ọ gbara ihe dị ka afọ iri atọ na abụọ
- Ọ rụburu ọrụ dịka onye na-anakọ ego n'ụgbọala bus.
- O malitere iwu mgbe ọtụtụ ihe onyonyo gosiri ebe ọ na-agwa ndị mmadụ mee ihe dị icheiche maka ego pụtara
- Gọọmentị Anambra steeti dọrọ ya aka na ntị nke mere ka ọ pụta rịọ mgbaghara
- Ndị uweojii mechara nwuchie ya n'ụbọchị 27 n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021.
- A ba-atụ anya na a ga-akpụpụ ya ụlọikpe taa bụ ụbọchị 28 n'ọnwa Jenụwarị.








