Ban on open grazing: 'Anyị ka na-ahụ ndị ọchị ehi na-agbanyeghi mmachi e tinyere'
Ndị bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ekwuola na ha ka na-ahụ ka ndị ọchị ehi na-achị ehi agagharị na-agbanyeghi iwu mmachi gọọmentị tinyere na mpaghara ahụ.
Ha gwara BBC Igbo na nke a pụtara na ndị gọvanọ Ọwụwa Anyanwụ anaghị agbaso iwu a mmachi ịchịgharị ehi ha tinyere.
Ha kwuru na ehi ndị a na-abata n'ọrụ ugbo ndị mmadụ na-emebisi ihe ha kụrụ n'ugbo.
Cheta na ndị gọvanọ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ machiri nchịgharị ehi n'obodo n'afọ 2019.
Nke a mere ndị otu nchekwa 'Eastern Security Network (ESN)' nke otu Ipob hiwere ji sị na ha ga-agbaso iwu a n'obodo ndị dị na mpaghara ahụ.

