Oji River killing: 'Ndị ọchị ehi gbuchara nna m, ụjọ ịga n'ugbo ji anyị ugbua'- Nwada e gburu nna ya

Aha onyonyo, 'Ndị ọchị ehi gbuchara nna m, ụjọ ị ga n'ugbo ji anyị ugbua'- Nwada e gburu nna ya

Ndị be Eugene Iloabani bụ nwoke a na-eche na ọ bụ ndị ọchị ehi gburu n'ugbo ya ka nọ n'anyammiri.

Ha kwuru na ụjọ ji ha ugbua ịga ugbo nke mere na o nweghị ihe oriri ha na-enwetezi n'ugbo ha.

Ha kwuru na ruo ugbua, na kọmishọna uweojii Enugwu steeti kwere ha nkwa ịchọpụta ndị kpara arụ a, agwabeghị ha ihe ọbụla.

Ebere Iloabani bụ ada ya, kwuru na ọ bụ ọrụ ugbo a ka nna ya ji azụ ụmụ ya niile.

Ha na-arịọ ka gọọmentị gwa ndị ọchị ehi ka ha kpọrọ ehi na atụrụ ha laghachi be ha.

Gee ihe o kwuru n'uju: