Oji River Killing: "Gọomentị rụọ ọrụ nchekwa dịịrị ha" - Toby Okechukwu

Aha onyonyo, Oji River Killing: "Gọomentị rụọ ọrụ nchekwa dịịrị ha" - Toby Okechukwu

Onye nnọchiteanya Engwu West Federal Constituency, Toby Okechukwu, e wegala ọnwụ Eugene Iloabani n'ụlọikpe nta, dị n'Abuja.

Okechukwu kpọrọ oku ka gọọmenti gbaa mbọ kwụsị oke ogbugbu mmadụ na-eme na Naịjirịa, ọkachasị n'alaigbo.

Okechukwu sị na ndị uweojii jidere otu onye n'ime ndị kpara arụ ahụ bụ onye abụghị onye Igbo.

O kwuru na ọ dị mkpa na gọọmentị jisiri ike rụọ ọrụ ha site na-ichekwa ndụ na ngwongwo ndị mmadụ karịa ịhapụ ndị ọzọ ka ha na-egbu ibe ha.

Okechukwu sị na ọ ka mma na gọọmentị hapụrụ ndị mmadụ chekwawa onye ha maọbụrụ na ha agaghị arụlị ọrụ ahụ.

Ọ sị na "gọọmentị na-enweghị ike ịchekwa ndị ọ na-achị abụghị ezigbo gọọmenti".