Ohafia killing: 'Anyị agaghị agba nkịtị ka e kpuchie ọnwụ nwaokorobịa ndị uwe ojii gburu'

Ebe foto si, Friday Arunsi
Otu ndị ntorobịa na mpaghara ọwụwa anyanwụ a kpọrọ 'Coalition of South East Youth Leaders' eforola ntutu taa ma kwuo na ha agaghị agba nkịtị ka e kpuchie ọnwụ Friday Arunsi bụ onye ndị uweojii gbagburu n'Ohafia, Abia steeti, nakwa ndị niile ndị ọrụ nchekwa gbagburu kamgbe a malitere ọnọdụ onye nọrọ be ya.
Onyeisi ndị otu a bụ Goodluck Egwu Ibem kwuru nke a oge BBC Igbo kpọtụụrụ ya.
Ebem kwuru na Kọmịshọna ndị uweojii nọbụ n'Abịa steeti hibere otu ga-enyocha ogbugbu Fraịde, mana dịka e wepụrụ ya n'ọrụ, ha ga-agba mbọ hụ na onye nke na-abata ọhụrụ ga-eme ihe o kwesịrị ime.
Cheta na Okon Ene apụọla dịka Kọmishọna ndị uweojii n'Abia, ebe Janet Agbede bụ onye e zitere ka ọ nọchie ya.

Ebe foto si, Goodluck Egwu Ibem
Ibem kwuru sị: "Ihe anyị chọrọ bụ ka a kpọpụ ndị uweojii ahụ ụlọikpe ma maa ha ikpe maka igbu ọchụ."
"Anyị agaghị agba nkiti ka okwu a lakpuo."
"Oge ọbụla okwu a pụrụ ụlọikpe, anyị ga-esogide ya iji hụ na atụfughi ya."
Ibe kwara arịrị na ndị uweojii, ndị soja, na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-agbagbu ndị mmadụ aghara aghara na mpaghara ọwụwa anyanwụ.
O kwuru sị: "Kamgbe 'stay at home' malitere, ndị ọrụ nchekwa egbuola mmadụ asatọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ mana ọrịa coronavirus egbubeghi kama otu onye."
Cheta na gọọmentị Abịa steeti dekwara akwụkwọ ma katọọ ogbugbu ndị ọrụ nchekwa na-egbu ndị mmadụ.
Kingsley Ukpaị bụ nwanne nne Friday Arunsi bụ onye ndị uweojii gbagburu n'Ebem Ohafia kwara arịrị maka ọnwụ nwa ha nwoke.
Ukpai kwuru na Friday bụ ụkwụ na aka nne ya nakwa n'ụgbụa ha niile nọ n'ọnọdụ gbagharịa,
Gere ihe o kwuru n'uju n'ihe onyonyoo dị n'elu.

Ebe foto si, Obinna Chineke
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Abia steeti bụ Geoffrey Ogbonna ekwuola na ndị uweojii anwụchiela onye otu ha maka ọnwụ Friday Arunsi n'Ebem Ohafia.
O kwukwara na kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Ene Okon agaala ụlọ akwa na be nwoke ahụ iji ti ezinaụlọ ya aka n'obi.
Akụkọ kwuru na ndị uweojii gbagburu ya n'ụloahịa ya n'ụbọchị Fraide nke mere ka ụmụ ntorobịa n'obodo ya mee ngagharịiwe.

Ebe foto si, Obinna Chineke
Ụlọntakụkọ NAN kwuru na ọnwụ Friday Arunsi ga-eme ya mmadụ ise nwụrụ n'aka ndị uweojii kemgbe amanyere ọnọdụ nọrọ n'ụlọ maka igbochi mfesasị nje coronavirus.

Ebe foto si, Obinna Chineke
N'Afrịka, Onyeisiala mba Lesotho eburu bata 18

Ebe foto si, MOLISE MOLISE
N'Afrịka, ndị agha mba Lasotho juru n'okporoụzọ taa maka ihe onyeisiala ha bụ Thomas Thabane sị na ọ bụ maka iwehachite udo n'ala ahụ maka ndị chọrọ imebi ọchịchị onye kwuo uche ya.
Ya bụ onyeisiala ekwubụọla n'ihu ọha na ndị ọrụnchekwa na-ọkpọghị aha ha chọrọ ịkpọnye aja na garị ọchịchị onye kwuo ụche ya n'obodo ahụ.
Nke a na-eme dịka Ụlọikpe mba ahụ napụrụ Thabane ikike ịmechị ụlọomeiwu mba ahụ.
Ya bụ onyeisiala kpọrọ ekwo nkụ na ya agaghị arịda n'ọchịchị kemgbe 2017 ebidoro chawa ya ọkụ maka ọnwụ nwụnye ya mbụ bụ Lipolelo Thabane.
Thabane na nwunye na-ese ezigbo okwu mgbe ndị amaghị gbagburu ya afọ atọ gara aga.
Ndị uweojii mba ahụ na-ebo onyeisiala ha ebubo na aka ya dị na ọnwụ nwụnye ya nke nwụrụ anwụ.











