Porthacourt Killings: Ndị uweojii anwụchiela mmadụ abụọ

Ndị uweojii na ndị na-eme ngagharịiwe.
Nkọwa foto, Ndị uweojii kwere nkwa na aka ha ga-akpara ndị na-arụ ala ahụ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ndị uweojii na Port Hacourt anwụchiela mmadụ abụọ maka ogbugbu a na-egbu ụmụ agbọghọ n'ụlọ oriri na nkwari na Potakọt.

Na nsonso a, a tọgburu opekatampe ụmụagbọghọ asatọ na ndịda Naịjirịa kemgbe ọnwa Julai.

N'otu aka ahụ ndị uweojii kwukwara na akụkọ ụmụ nwaanyị abụọ ọzọ atogburu n'ụlọoriri abụghị eziokwu.

Ha kwuru nke a dịka ụmụnwaanyị mere ngagharị iwe gbasara oke ogbugbu a na-egbu ụmụ agbọghọbịa n'ụlọoriri n'obodo ahụ.

Ụmụnwanyị na-eme ngagharịiwe maka ogbugbu a na-egbu ụmụnwanyị ibe ha na Pọtakọtụ

E butela ozu nwa agbọghọ ọzọ na Pọtakọtụ isi obodo Rivas Steeti.

Nke a mere na mgbede ụbọchị ụka, abalị iri na ise nke ọnwa Septemba.

Ọ bụghị nke mbụ ụdị ihe a na-eme nke ọ na-abụ nke abụọ.

Ajụjụ wee bụrụ onye na-anyụ ihe nke a na-esi?

Ndị uweojii na ndị na-eme ngagharịiwe.
Nkọwa foto, Ndị uweojii kwere nkwa na aka ha ga-akpara ndị na-arụ ala ahụ

Ihe gbara gharịị bụ na etu e si gbuo ụmụ agbọghọ ndị ahụ yichara onwe ha.

Ọ na-adị ka ọbụ ntọgbu ka a na-atọgbu ha.

Ndị uweojii kwuru na a hụrụ akwa e kere n'olu ụmụagbọghọ ndị ahụ e ji tọgbuo ha.

Mana onwebeghi onye matara onye maọbụ ndị na-akpa arụ a.

Police oga Chuks
Nkọwa foto, Chuks Enwonwu, osote onyeisi ndị uweojii na Rivas Steeti

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Rivas Steeti bụ Nnamdi Omoni, gwara BBC na nnyocha pụrụ iche amalitela.

Omoni kwuru na ha na-eche na e nwere otu ndị ekperima ndị aka ha dị na ihe ọjọọ a na-eme.

O kwuru sị: "Anyị anwụchiela mmadụ ole na ole ga-enyere anyị aka na nnyocha anyị na-eme."

"Mana anyị ma na anyị kwesịrị ịgba mbọ karaịa."

"Anyị anaghịzi ezu ike maka na ihe a na-ebuetere anyị ihere."

"Anyị ga-anwụchi ndị ọbụna aka ha dị na igbu ọchụ ndị a."

Ụlọ oriri ebe e gburu nwaagbọghọ na Pọtakọọtụ
Nkọwa foto, Ụlọ oriri ebe e gburu nwaagbọghọ na Pọtakọọtụ n'ọnwa Ọgọst

BBC kpọtụkwaara onye isi ndị otu jikọrọ ndị nwere ụlọ oriri na nkwarị na Rivas steeti.

Aha ya bụ Eugene Nwauzi. O kwuru na ha na gọọmentị na-arụka ọrị ọnụ iji kwụsị oke ogbugbu a.

"Anyị ga-agba mbọ hụ na ụlọ oriri na nkwari ọbụla nwere ihe ose foto a kpọrọ 'CCTV'."

"Ndị enweghị ego ịzụta 'CCTV', anyị ga-enyere ha aka ịgbazite ego n'ụlọakụ iji zụta ya."

Ụmụnwanyị emeela ngagharị iwe

Ụmụagbọghọ na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, Twitter/@girls_port

Ọtụtụ otu ụmụnwanyị na Pọtakọtụ mere ngagharị iwe n'ihi nke a.

Otu ndị a gụnyere 'Rotary Club' nke Pọtakọtụ, otu ndị ọkaiwu ụmụnwanyị a kpọrọ 'Federation of Women Lawyers' (FIDA), nakwa otu ndị dibịa bekee ụmụnwanyị a kpọrọ 'Medical Women Association of Nigeria' (MWAN).

Ụmụagbọghọ ụfọdụ mekwara ngagharịiwe n'ụbọchị Fraịdee.

Ha dọrọ ụmụagbọghọ aka na ntị ka ha kpachapụ anya onye ha na-eso.

Ngagharịiwe ahụ gakwara n'ihu n'ụbọchị Monde.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Njem Akpu site n'ugbo banye n'efere