Maiduguri university attacks: 'A nụrụ m ụda egbe na ogbunigwe' - Nwata akwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images
Otu nwata akwụkwọ Mahadum Maiduguri ekwuola na ya na ndị otu ya nụrụ ụda egbe na ogbunigwe n'abali ụbọchị 15 Sepụtemba.
Nwata akwụkwọ ahụ na-achọghị ka a kpọpụta aha ya gwara BBC Igbo na ụda ahụ mere ka ụmụakwụkwọ ndị ọzọ gbaharịwa na-achọ ebe nchekwa.
Ọ bụ eziokwu na o nwebeghị otu pụtara sị na ọ bụ ha mere ya bụ mkpa mkpa mana ụmụakwụkwọ Mahadum UNIMAID na-ekwusi ike na ha na-eche na ọ bụ ndị otu Boko Haram kpawarala mkpa mkpa kamgbe na steeti ahụ.
Mbọ anyị gbara inwete ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Maiduguri bụ Abdulmaleek AbdulHafeez kpụrụ n'ala makana ọ zaghị ekwenti ya.
Ndị agha Naịjirịa apụtabeghị kwuo ihe ọbụla.
A matabeghị ma onwere onye nwụrụ na ya bụ mwakpo ka ọ dị ugbua.
Akụkọ na-ekwu na ndị nchekwa agbala mahadum ahụ okirikiri ebe Gọvanọ steeti ahụ bụ Babagana Zulum a gaala ileta ụmụakwụkwọ nọ na Mahadum ahụ ma meda ha obi.
Anyị ka ga-akpọghachị ndị uweojii ma wetere unu ihe ọbụla ha gwara anyị gbasara akụkọ a.
Ihe nkiri ị ga-achọ ikiri
Akụkọ ndị ga-amasị gị










