Boko Haram Attack: Mgbọ tụrụ ụmụakwụkwọ Mahadum abụọ nọ ekpere na Maiduguri

Ụzọ mahadum Maiduguri

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu nwata akụkụkwọ sị na ọdachị jekwuru ụmụakwụkwọ abụọ nọ ebe ha na-ekpe ekpere mgbe mgbọ amaghi ebe osi tụrụ ha na Mahadum Maiduguri na Tọzde Julaị 25.

Oluchi Benjamin gwara BBC Igbo na mgbọ ahụ batara ka ha na-achọ imechi nzukọ ekpere n'amalị elekere asaa n'ọkara nke abalị ahụ.

Ọluchi sị: "Anyi na-eme ekpere mgbe anyị nụrụ ụda wee chọpụta na mgbọ egbe tụrụ mmadụ abụọ."

Kennedy Ngamchak bu onyeisi otu ndị ofufe Kraịst akpọrọ "Redeemed Christian Fellowship" gwara BBC Igbo na ọ bụ ụmụakwụkwọ abụọ ka mgbọ a metụrụ.

"Mgbọ ahụ banyere n'oche tụọ otu onye n'aka tupu ọ banye onye ọzọ n'ụkwụ."

O nyere aha ndị mgbọ ahụ metụrụ dịka Isa Yakubu Buba nọ na ngalaba ọrụ ụgbọ naka onye ọzọ ọ sị na ọ bụ Sam ka o ji mara.

Ngamchac sị na ha buru mmadụ abụọ gawa ụlọ ọgwụ mmụzị nke mahadum ahụ.

"Otu onye n'ime ha pụtara ụnyaahụ, mana onye nke ọzọ ka nọ ebe ahụ. A na-ekwu na a ga-eme ya xtray ka amara etu merụ ahụ ha ruru."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Oluchi gwara BBC na ha na-anụ ụda egbe na ihe ha che na ọ ga-abụ ogbunigwe mgbe ha si ebe ahụ pụta.

Ngamchac kwenyere na nke a bụ eziokwu na ọ bụ na mwakpo emere n'obodo akpọrọ Dalori ndị a na-eche na ha bụ Boko Haram wakporo ka ogbunigwe ahụ dara.

Ọ sị na ọ ga-abụ ebe ahụ ka mgbọ ahụ tụrụ ụmụakwụkwọ si.

Na soshal midia, ndị mmadu na-ede maka mwakpo ahụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Ma onye tinyere ihe onyonyo gosiri ndị mmadụ ọ sị na-agba ọsọ maka mwakpo ahụ.

BBC Igbo na-agba mgbọ ịnụta n'ọnụ ndị uweojii na ndị agha Naịjirịa.

Mana ndị otu ọru gbata gbata akpọrọ Red Cross na Bekee gwara BBC na ha amatabeghi maka ihe mere.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Anyị na-eche ka ndị ọrụ nchekwa zaa oku anyị na-akpọ ha n'ekwenti.