Owerri Murder: E gbuola nwaagbọghọ ọzọ n'ụlọndina dị n'Owere

Ebe foto si, Science Photo Library
Ka ọ na-erubeghị izuụka abụọ a hụrụ ozu nwaagbọghọ a tọgburu atọgbụ n'ụlọndina na Pọtakọt, a hụkwara ozu ọzọ n'ụlọndina ama ama nke dị n'Owere Imo steeti.
Nke a mere na ngwụcha izuụka a gara aga n'ụlọndina dị na 'World Bank Road' nke Owere, Imo steeti.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke Imo steeti bụ Godson Orlando Ikeokwu gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ onye na-ehicha ụlọ hụrụ ozu nwaghọghọ a.
Ndị na-arụ n'ulọndina a kwuru na ha anụghị mkpọtụ ọgụ ọbụla ma kwukwaa na ha amaghị mgbe nwoke ya na nwaagbọghọ a soro bịa jiri pụọ.
Maazị Ikeokwu kọwara na ịchọta aha nwaagbọghọ a ga-esi ike n'ihi na nwoke ha abụọ so bịa weere ekwentị na ngwongwo nwata nwaanyị ahụ niile gbafuo.
O kwukwara na ha na-eme nyocha na mgbe na-adịghị anya, ha ga-ejide onye gburu nwaagbọghọ a.
Ọnọdụ nwaagbọghọ ahụ nọ dịka etu onye nke e gburu na Pọtakọt dị.
Akwa ọcha dịkwa ha abụọ n'olu, dịka foto ndị mmadụ tinyere na soshal midia gosiri.
Ndị uweojii ekwubeghi na ha achọpụtala onye kpara mkpamkpa na Pọtakọt, dịka ndị nke Imo sị na ha na-asụ ọhịa ịmata nke bụ eziokwu.
Akụkọ ka na-abịa.
Lee akụkọ ga-amasị gị:
Lee ihe nkịrị ga-amasị gị:










