Anambra State: Ogbugbu otu nwaokorobịa na Nkpor ebutela ngagharịiwe

Ebe foto si, Twitter/David Igboke
Akụkọ na-ewu na soshal midia na mgbede Wenezde bụ na ndị uweojii Anambara steeti gburu otu nwaokorobịa na Nkpor.
Ya bụ ihe mere na mpaghara ahịa 'New Tyre' ebutela ngagharịiwe dịka ndị ntorobịa na-egosipụta mwute ha.
Ọtụtụ ihe onyonyo ndị mmadụ tinyere na Twitter, Facebook nakwa Instagram gosiri ebe ozu ya bụ nwata nwoke tọgbọ n'ala ndị mmadụ gbaa okirikiri na-aba mba n'iwe.
Mana Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambara azaghị oku ekwentị BBC Igbo kpọrọ ya ugboro ugboro iji mata ihe merenụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
O dochabeghị anya etu ya bụ ihe si mee mana BBC Igbo ka na-esi imi n'ala ịweta ya bụ akụkọ n'uju.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Cheta na gọọmentị Anambara steeti mechiri mkpagharị ndị mmadụ iji gbochie mfesa ọrịa coronavirus.
Mana akụkọ kwuru na ọ bụ ebe ụmụokorobịa na-agba bọọlụ ka ya bụ njinji nọrọ jie.
Ndị ọzọ kọkwara na ndị ntorobịa ji 'acid' wee chụọ ndị uweojii ahụ e boro ebubo igbu mmadụ ọsọ.
BBC Igbo ka na-agba mbọ ịnụ n'ọnụ Haruna Mohammed maọbụ onyeisi ndị uweojii n'Anambra.
N'aka nke ya, onyeisi ngalaba mkpesa nke ndị uweojii Naịjirịa aha ya bụ Markus Ishaku Basiran, kwuru na ha amalitela ileba ya bụ okwu anya.
Basiran depụtara nke a n'akara Twitter ya ma kwuo na Kọmishọna ndị uweojii nke Anambra steeti abanyela na ya bụ okwu
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Mana Kọmishọna mgbasa ozi na Anambra bụ Don Adinuba kwuru na ya hụkwara ya bụ akụkọ na soshal midia, mana ndị uweojii agwabeghi gọọmentị maka ya.
Adinuba kwuru na "ọ bụ mgbe ndị uweojii gwara anyị maka ya ka m ga-ama ihe m ga-ekwu".

Onye ọrụ nchekwa agbagbuola mmadụ n'Aba
N'akụkọ dịka ibe ya, gọọmentị Abia steeti agbarụọla ihu maka ọnwụ otu nwaokorobịa a na-ekwu na ọ bụ otu onye ọrụ nchekwa ji egbe gbagbuo ya n'Aba.
John Okiyi bụ kọmishọna mgbasa ozi n'Abia steeti kwupụtara nke a n-ehihie Wenezde.
Okiyi kwuru na ya bụ ihe mere n'Ụmụịkaa 'junction' nke dị n'okpuru ọchịchị Isialangwa South.
Ọ gara n'ihu kwuo na Gọvanọ Okezie Ikpeazu enyela ntuziaka ka Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ tinye anya na mmiri ma nwụchie omye kpara arụ ma kpee ya ikpe.
Dịka Okiyi si kwuo, nke a abụghị nke mbụ ndị ọrụ nchekwa na-egbu mmadụ n'Abịa steeti.

Ihe mere gọọmentị Uzodinma ji enyocha Ihedioha

Ebe foto si, Twitter/Emeka Ihedioha
Gọọmentị Imo steeti enyela ikike ka-ebido ime nyocha maka ihe karịrị ijeri naịra 19 bụ ego ndị okpuru ọchịchi ime obodo e kwuru na ọ na-efu efu site n'oge Emeka Ihedioha nọ n'ọchịchị.
Ha kwuru na ọ bụ n'ọba ego nke ndị okpuruọchichị n'Imo steeti nakwa nke ngalaba na-ahụ maka ndị eze ka e si sepụ ya bu ego n'ime ọnwa asaa Ihedioha chịrị.
Dịka Kọmishọna mgbasa ozi bụ Declan Emelumda si kwuo, etu e si zupu ya bụ ego bụ site na iru ọrụ adigboroja di icheiche ebe ndị ọ bụ ọrụ a na-ahụghị anya.
Emelumda kwuru nke a n'ọgbakọ ndị ntaakụkọ n'Owerre n'ụbọchị Tuzde.
O gara n'ihu kwuo na ọ bụ mgbe ha na-eme nnyocha nke afọ gara aga dịka ọ dị na usoro gọọmentị ka ha chopụtara ya bụ nrụrụaka.
O kwukwara na nnyọcha maka ebubo a dị n'atụmatu gọọmentị Imo steeti wepụtara iji hụ na ndị ọrụ gọọmentị rụrụ ọrụ ha dịka o si kwesi, nakwa ịhụ na-erubere iwu obodo isi gbasara mmefu egọ ọha nke dị n'aka gọọmentị.
BBC Igbo kpọtụụrụ Chibuike Onyeukwu bụ onye enyemaka mgbasa ozi Ihedioha mana o kwuru na ha ga-ewepụta akwụkwọ ozi ebe ha ga-asa ebubo niile ahụ.
Mana ụlọọrụ 'Wallhouse W.A Ltd' wepụtara akwụkwọ ozi ebe ha kwuru na ebubo gọọmentị Ihedioha boro ha bụ ụgha.
'Wallhouse' kwuru na ọ bụ ha ka gọọmentị Ihedioha nyere ọrụ ibute ụgbọọala 'Caterpillar' na nnukwu ụgbọala ndị ọzọ e ji arụ ụlọ.
Martin Agba bụ otu n'ime ndị isi ụlọọrụ ahụ kwuru na ihe gọọmentị kwụrụ ha bụ narị nde naịra itoolu na ụma (N945m) nke bụ ọkara ego ha na gọọmentị kpebiri.
N'aka nke ọzọ Mayor Eze bụ onye ndụmọdụ Ihedioha n'okwu gbasara okpuruọchịchị wepụtakwara akwụkwọ ozi iji gọrọ ọnụ ya.
Eze kwuru na onweghi otu mkpụrụ eziokwu ọbụla dị n'ebubo ahụ gọọmentị Uzodinma na-ebo Ihedioha.

Ọkụ agbaala ụlọọrụ CAC n'Abuja

Ebe foto si, Twitter/PunchMobile
Ọkụ agbaala akụkụ ụfọdụ n'isi ụlọọrụ 'Corporate Affairs Commission' dị n'Abuja.
Nke a na-abịa otu izuụka ọkụ gbachara isi ụlọọrụ onye ọgbakọ ego Naịjirịa bụ 'Accountant General' na Bekee.
Dịka onyeisi ụlọọrụ CAC bụ Garba Abubakar si kwuo, ya bụ ọkụ emebeghị nnukwu ihe, onweghịkwanụ onye nwụrụ na ya.










