Ebonyi Police Command: Naanị otu onye ka e gburu n'ọgụ ndị otu nzuzo

Ụmụakwụkwọ bu okwute na-eme ngagharịiwe

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii steeti Ebonyi ekwuola na ọ bụ naanị otu onye ka ha ma e gburu n'ọgụ di n'etiti ndị otu nzuzo abụọ na steeti Ebonyi.

Loveth Odah bu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti Ebonyi gwara BBC na ọ bụghị mmadu atọ kama otu onye aha ya bu Ifeanyi Alegwu onye a na-etu 'Bruno', onye Ezeama nke dị n"okpuru ọchịchị Ezza South na steeti Ebonyi.

Akụkọ na-efeghari na-ekwu na mmadụ atọ nwụrụ n'ọgụ ndị otu nzuzo na ibe ha n'Ebonyi.

Mana Odah kwuru na Bruno nọ n'otu nzuzo a na-akpọ 'Eiye', ebe ndị gbagburu ya bu ndi otu 'Baga.'

Onye okwuruọha ndi uweojii ahụ dọrọ ndị ntorobia aka na ntị ka ha zeere ịba otu nzuzo maka na o nweghi ihe nrite ọbụla dị na ya.

Ọgụ ndị otu nzuzo ataala isi ọtụtụ mmadu na Ebonyi Steeti.

N' Eprel 28 afọ a, e gburu mmadụ atọ na Afikpo ma sukwaa ụlọ ọtụtụ ndị mmmadụ ọkụ mgbe ndị otu nzuzo abụọ lụrụ ọgụ.

N'oge ahụ, gọọmenti steeti Ebonyi kwuru na ha g-edepụta aha ndị nile a na-arọ anya na ha n'otu nzuzo ma gbaa ha n'anwu, mana ruo taa, ha emebeghi nke a.

Akụkọ ga-amasị gị: